Nigeria election 2023: Ihe ndị na-azọ ọkwa kwuru na nke bụ eziokwu

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naịjirịa, ndị na-azọ ọkwa ekwuola ihe dị icheiche na njem achụmnta vootu ha.
Anyị elebanyela anya n'ihe Bola Tinubu nke APC, Atiku Abubakar nke PDP nakwa Peter Obi nke Labour Party kwuru.
Peter Obi: 'India nwere ndị ogbenye 16% ebe Nigeria ruru 63% nke pụtara "multidimensional poverty"

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụọgụgụ nke India (16.4) bụ nke si n'ụlọorụ Global Multidimensional Poverty Index were pụta n'afọ 2022 site na njikọ aka UN nakwa Oxford Poverty and Human Development Initiative (OPHI).
Ọ na-elebanye anya na mba ndị ogbenye karịrị otu narị site n'inyocha ihe iri metụtara ahụuke, agụmakwụkwọ nakwa ọnọdụ obibi ndụ.
Nke ọ kpọpụtara mba India bụ eziokwu mana otu nyocha ahụ tinyere Naịjirịa na pasentị 46 abụghị 63% nke Obi kwuru.
Nke ahụ si na nyocha ozọ ewepụtakwara n'afọ 2022 akpọrọ Nigeria Multidimensional Poverty Survey.
N'agbanyeghị na aha nyocha abụọ a yiri onwe ha, ọ bụghị otu ihe n'ebe nke na-elebanye mba ụwa nọ nke mere na ọ ga-abụ okwu ụgha ịdokọ nyocha abụọ ahụ na nhatanha dịka Ọkammuta Sabina Alkire bụ onyeisi Oxford Poverty and Human Development Initiative (OPHI) si kwuo.

Atiku Abubakar: 'N'ime naanị afọ ise site na 2015 rue 2020, ọnụọgụgụ ndị nwere ọrụ ji pasentị 54% datuo - si na nde 68 rue nde 31'

Ebe foto si, Getty Images
Maazị Atiku na-azọ n'okpuru otu PDP bụbu osote onyeisiala site n'afọ 1999 rue 2007 kwuru nke a n'ọnwa Jenụwarị.
O kwuru eziokwu maka ọnụọgụgụ ndị nwere ọrụ n'afọ 2020 dịka nyocha gọọmentị si gosi.
Mana ọnụọgụgụ nke 2015 nwekwara ndị akpọrọ 'underemployed' ya bụ ndị anaghị arụru ọrụ ka ha si chọọ.
N'afọ 2015, ndị nọ n'ọrụ ruru nde 55 dịka ndekọ gọọmentị si gosi nke mere na ezi ọnụọgụgụ maka ndatu ndị nọ n'ọrụ bụ pasentị 44.

Bola Tinubu: '[Nchekwa ọjọọ] adatuola n'ezie... anyị [nweburu] ọkọlọtọ otu 'jihad' na Naịjirịa, ọ dịghịzi'

Ebe foto si, Getty Images
Okwu nchekwa bụ ezigbo akụkọ metụtara ntuliaka a ọ kachasị agha a na-alụso Boko Haram.
Na mkparịtaụka BBC na Tinubu nwere, o kwuru na ndị otu na-eyi ndụ egwu na-awakpo steeti anọ kemgbe afọ 2015 Buhari banyere ọchịchị anaghịzị enye nsogbu. "O teela aka nke ahụ kwụsịrị" ka o kwuru.
Ọ bụ eziokwu na akwapịala ike Boko Harama ma chụpụ ha n'ọtụtụ ebe ha nọchiburu mana otu ndị ọzọ na-abawanye n'oge ahụ nke gụnyere Islamic state West Africa Province (Iswap) si n'otu Boko Haram gbajipụta.
Mana gọọmentị Naịjirịa ka nwere ọtụtụ nsogbu nchekwa chere ha aka mgba gụnyere ntọ, esemokwu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo nakwa ndị na-achọ mmwereonwe n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Na ngụkọta, Naịjirịa ka bụ ebe akacha nwe ọgbaghara n'ala Afịka n'afọ gara aga dịka Armed Conflict Location & Event Data Project (ACLED) si kwuo.
Ndị kọrọ akụkọ a bụ Peter Mwai, Chiagozie Nwonwu nakwa Fauzziyah Tukur








