Lee ihe ndị ị maghị maka ụmụnwaanyị nwere ike ịbụ isi nwaanyị Naijiria

Ebe foto si, Titi Abubakar, Salamatu Kwankwaso,Margaret Obi, Oluremi Tinubu
Malite n'ọchịchị Ibrahim Badamosi Babaginda, onye nwunye ya bụ Maryam Babagida ji ọkwa isi nwaanyị ahụ rụọ nnukwu ọrụ pụtara ihe dịka o si metụta ụmụnwaanyị, ọtụtụ nwunye ndị chịrịla Naijiria ji ọkwa ahụ akwalite uto ụmụnwaanyị , ụmụaka na ndị na-eto eto n'ụzọ pụrụ iche.
Na-agbanyeghị n' ọkwa isi nwaanyị(First Lady) dịghị n'Iwu Naijiria, ndị nwunye ọtụtụ ndị chịrịla na Naijiria ejighị ọkwa egwu egwu.
Lee ihe ndị ị maghị maka ụmụnwaanyị a na-atụ anya na otu n'ime ha ga-abụ nne ọha Naijiria malite n'abalị 29 nke ọnwa Mee:
Salamatu Rabiu Kwankwaso

Ebe foto si, Rabiu Kwankwaso
Isi Nwaanyị na-abụkarị nne ọha mana ị hụtụla nwunye Rabiu Kwankwaso nke otu NNPP?
Ị mata ihe abụla ihe banyere Salamatụ Kwankwaso bụ onye nwere ike ị bụ isi nwaanyị Naijiria ma ọ bụrụ na di ya bụ Rabiu Kwankwaso nke otu New Nigeria People's Party(NNPP) emereie na ntuliaka dịka ịmịpụta mmiri n'okwute.
Ndị na-ekwuru Kwankwaso na-ezo ozi banyere ya dịka nwaanyị na-ezo afọ ime mbụ ya dịka ha atụpụghị ọnụ oge BBC Igbo jụrụ ha ase.

Ebe foto si, Oluremi Tinubu/Rabiu Kwankwaso/Margaret Obi/ Titi Abubakar/FAcebook
Ọ dịghị ọtụtụ ihe a ma maka nwaanyị onye dị ya na-eche ka ugo si eche akwa ya, dịka ọtụtụ ndị Kano anaghị ahụ ya n'ọha.
Ọtụtụ ndị na ezinaahụ nso onye ntaakụkọ anyị jụrụ ese banyere ya ekweghị atụpụ ọnụ.
Mana ị ma na ọmarịcha nwaanyị a kpọrọ Salamatu Kwakwanso bụ nwunye onye Kwankwaso lụrụ n'afọ n'afọ 2000 ka n'oge ọchịchị ya afọ asatọ dịka gọvanọ Kano steeti?
Ọ bụrụ na Kwankwaso merie na ntuliaka aka , o doghị anya ma nwunye ya aga apụta ihe dịka ndị isi nwaanyị Naijiria n'oge gara aga ka di ya a ga ewezụga n'ọha dịka o mere oge ha nọ dịka ezinaụlọ mbụ na Kano steeti.
Na-agbanyeghị na ọ bụ onye Islam nke nwere ikike ịlụ ọbụladi ụmụnwaanyị anọ nwa adaa bụ naanị nwaanyị nke Kwakwanso lụrụ

Ebe foto si, Rabiu Kwankwaso/Facebook
Remi Tinubu

Ebe foto si, Oluremi Tinubu/Facebook
Oluremi Tinubu, nwunye onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha APC bụ Bola Ahmed Tinubu.
Ọ bụ isi nwaanyị Legọs steeti malite n'afọ 1999 rue 2007 bụ oge di ya nọ n'ọkwa dịka Gọvanọ steeti ahụ.
Ị ma na nwaanyị bụ ihe gbasara nkwalite ụmụaka na ụmụnwaanyị na-atọ ka nnu? O ji otu ọrụ ebere ya nke a kpọrọ 'New Era Foundation' eme ya.

Ebe foto si, Oluremi Tinubu/Twitter
Atụmatụ 'Spelling Bee' nke e ji ahọpụta nwata na-achị Legọs otu ụbọchị bụ atụmatụ o ji obi ya hibe ma na-akwalite kemgbe afọ 2001.
Oriakụ Tinubu bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mabụrụkwa Senetọ na-anọchite Lagos Central n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria malite n'afọ 2015 nakwa afọ 2019.
Onye Ogun Steeti, ọ gara akwụkwọ sekọndrị n'ụlọakwụkwọ 'Our Lady of Apostles Secondary School' dị na Ijebu-Ode .
Onye Ogun steeti, a mụrụ ya n'abalị 21 nke ọnwa Septemba afọ 2023.
Ọ bụ onye ụkọchukwu n'Ụlọụka 'Redeemed Christian Church of God'(RCCG).
Margaret Obi

Ebe foto si, Peter Obi
Margaret Obi bụ nwunye onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naijiria n'aha otu Labour Party na Ntuliaka 2023. Ọ bụ ya bụ onye hụrụ na ekewapụtara ụlọikpe maka ikpe metụtara ezinaụlo n'Anambra steeti oge di ya bụ Govanọ steeti ahụ.

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Nwa ndị be Brownson Usen, ndị Akwa-Ibom mana ọ na-eri asụsụ Igbo ka ji. Margaret na Peter Obi lụrụ n'afọ 1992. Ha mụrụ ụmụ abụọ; otu nwoke na otu nwaanyị.

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Titi Amina Abubakar

Ebe foto si, Titi Abubakar/Facebook
O bụrụ na Atiku Abubakar emerie na ntuliaka 2023, ị mara na onye ga-abụ isi nwaanyị Naijiria ga-abụ otu n'ime ndị nwunye ya bụ Titi Amina Abubakar.
Ka ọdị ugbua , nwaanyị na-agagharị na mpaghara dị iche iche ịyọta nkwado nye di ya.
N'otu ọgbakọ o nwere na mpaghara Ọdịda Anyanwụ, o gwara ha ha nye ya nkwado ka " Ka m bụrụ onye Yoroba mbụ ga-abụ Isi Nwaanyị Naijiria."
Titi Abubakar bụ nwaanyị Atiku jiri mere isi nwaanyị ya oge ọ rụrụ ọrụ dịka Osote onyeisiala Naijiria malite n'afọ 1999 rue afọ 2007.
Otu ihe mere ka ọpụta ihe ma mekwaa ka ọtụtụ ndị mmadụ hụ ya n'anya bụ ọrụ ịgbapụta ụmụnwaanyị e ji agba mgbere akwụna na mba ofesi site n'otu abụghị nke gọọmentị o hiwere a kpọrọ 'Women Trafficking and Child Labour Eradication Foundation' (WOTCLEF)..

Ebe foto si, Titi Abubakar/Twitter
Ọ bụ mbọ otu ya gbara nyere aka ka e nweta otu ọrụ gọọmenti na-ahụ maka ndị e ji agba mgbere nakwa iwu megidere nke a n'iwu Naijiria nke a kpọrọ 'NAPTIP Act' nke afọ 2003 . Tupu o soro di ya pụta ihe, Titi Abubakar bụbụ onye nkuzi mahadum na ' Kaduna State Polytechnic'. Onye Ilesa dị n'Osun Steeti, Titi na-azabu Titilayo Albert tupu ọ lụ Atiku.
O toro na Legọs, gaa akwụkwọ sekọndịrị na St. Mary's Iwo, Osun steeti. Ọ lụrụ Atiku n'afọ 1971 oge Atiku na-arụ ọrụ Kọstọm tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ebe foto si, Atiku Abubakar /Twitter











