Ebubo dị n’isi mmadụ atọ a na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

Ebe foto si, Tinubu/Obi/Abubakar
Ndị Naịjirịa nwere ohere ịhọrọ mmadụ iri na asatọ na-azọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka afọ a mana mmadụ atọ a bụ ndị kachasị gbapụta ihe nwere ụfọdụ ebubo mbupu ego, ire ọgwụike nakwa akwụghị ụtụisi e boro ha.
O nweghi onye n’ime ha a nwụchirila kpọmkem nke ga-eme ka ha ghara ịzọ ọkwa mana ebubo ndị a ebutela ọtụtụ ajụjụ banyere ọkwa ha na-azọ.
“Ọ bụ ịhọrọ otu n’ime ndị ọjọọ na-azọ ọkwa,” Ka Auwal Rafsanjani, onyeisi ụlọọrụ ‘Transparency International’ na-ahụ maka ịkwụwa aka ọtọ kwuru, ma kọwaa etu mpụ na nrụrụaka si mee ka ụbịam na obodo emepeghi emepe dakpọọ na Naịjirịa.
Mmadụ atọ ndị a kachasị gbapụta ihe gụnyere Bola Tinubu nke All Progressive Congress na-achị ugbua, Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party na Peter Obi nke Labour Party.
Mmadụ atọ ndị a sị na ha si n’ụzọ ziri ezi kpata akụnaụba ha ma kwuo na onweghi ihe ọjọọ ha mere.
Akwụkwọ Bola Tinubu

Ebe foto si, Tinubu/Facebook
Tinubu chịrị steeti kachasị n’iji ego na Naịjirịa bụ Legọs ugboro abụọ bụ onye a kachasị kpụrụ n’ọnụ na ndị na-azọ ọkwa.
E nwere ọtụtụ nrụrịtaụka banyere afọ ole ọ dị, aha, ahụike, ọrụ ya nakwa asambodo mahadum ya, mana nke a kachasị ekwu maka ya bụ etu o siri kpata ego ya.
Ọtụtụ kwenyere na Tinubu dị afọ 70, so n’otu n’ime ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kachasị baa ụba na Naịjirịa, agbanyeghi na onweghi ebe e dere ya n’akwụkwọ.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ihe kachasị gbapụta ihe n’akụnaụba ya bụ ụlọ nwere n’ebe ọkụ na-enwu n’elụ dị n’Ikoyi Lagọs. Ọ bụ ebe ahụ ka ndị mmadụ sị na a hụrụ ụgbọala abụọ dị ka ‘bullion van’ ndị ụlọakụ ji ebu ego banyere n’ụbọchị ntuliaka afọ 2019. Ndị enyemaka ya gọnarịrị ebubo sị na ọ na-azụ vootu ndị mmadụ.
N’ọnwa Disemba, mgbe BBC jụrụ ya banyere etu o si kpata ego, ọ sị na o ritere akụnaụba ya site n’ire ụlọ nakwa ala, tinyekwara ọkpụrụkpụ ego o nwetere mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka onye ngụkọ ego (auditor) n’ụlọọrụ a kpọrọ Deloitte na Touche.
Ọ sị na o chekwara ego ruru $1.8m site n’ụgwọ ọnwa ya nakwa ego mgbakwụnye a kwụrụ ya bụ ego a hụrụ n’ọbaego mgbe ya na ndị Amerịka nwere nsogbu n’afọ 1993.
N’akwụkwọ e wepụtara n’ọha, ngalaba ikpe ziri ezi na mba Amerịka sị ego dị n’ọbaego e ji aha Bola Tinubu mepee bụ ego e nwetere site n’ire ọgwụike heroin bụ nke iwu machiri.
Kevin Moss bụ onye ji nyocha ahụ sị na Tinubu rụụrụ otu nwoke ha na-enyo enyo a kpọrọ Adegoboye Akande ọrụ.
Ọ sị na Tinubu gwara n’ekwentị na ọ maara onye Akande bụ mana o mechara gọọ sị na onweghi ihe azụmaahịa ego ọbụla jikọtara ya na Akande.
Ụlọikpe sị na ha maara na ego ahụ bụ nke si n’ire ọgwụike mana Tinubu na ndị ọzọ gọnarịrị ya, ụlọikpe a agaghị n‘ihu kwuo ebe ego ahụ si kpọmkwem.
Kama Tinubu gara n’ihu kpebie ka ya ndị ọrụ gọọmentị mba Amerịka nwee nkwekọrịta ma hapụrụ ha ego dị $460,000.
Tinubu agọọla ugboro ugboro na aka ya adịghị n’ịtụ mgbere ọgwụike, ọnụ na-ekwuru ya bụ Festus Keyamo sị na ego ahụ ọ hapụụrụ ndị Amerịka abụghị maka mpụ kama na ọ bụ ego ụtụisi dịka onye na-arụ ọrụ na mba ahụ.
N’afọ gara aga, Tinubu na otu nwoke a kpọro Oladapo Apara kpeziri n’esemokwu ha na-agaghị n’ụlọikpe.
Apara bụ onye hiwere ụlọọrụ a kpọrọ ‘Alpha Beta Consulting’ e nyere ọrụ ị na-agụkọ ụtụisi na Legọs mgbe Tinubu na-achị dị ka gọvanọ.
Ọ sị na Tinubu nwere pasentị 70 n’ime akụnaụba ụlọọrụ ahụ bụ nke o ji ụzọ na-edochaghị anya enwete – na ụlọọrụ a na-enwete pasentị iri n’ime ụtụisi ọbụla ha natara nke ego ya pụtara $3.8bn site n’afọ 2002 ruo 2018.
Tinubu gọnarịrị nke a ma kwuo na ọ naghị anata ego ọbụla si n’ụtụisi Gọọmentị Legọs Steeti nwetere.
Apara sị na a chụpụrụ ya n’ụlọọrụ ahụ n’afọ 2010 mgbe ọ sị na o nwere ego ndị na-efu efu nke mere o jiri gaa n’ụlọike.
Ọ sị na onweghi ka a ga-esi achụpụ ya n’ụlọọrụ o hiwere ma sị ka a kwụọ ya ụgwọ nke banere n’okwu ịga n’ụlọikpe na 2021.
Na Sepụtemba afọ 2018, ọ sị na mkpesa nye ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ ka ha nyocha ‘Alpha Beta maka akwụghị ụtụisi. Ma o wepụrụ ozi banyere ya o tinyeburu na akara Twiiter.
Alpha Beta gọnarịrị ebubo ahụ ma sị na a chụrụ Apara n’ọrụ n’ihi nrụrụaka bụ nke ọ gọnarịrị.
Tinubu adịla mbụ gọọ ugboro ugboro na onweghi ihe jikọrọ ya na Alpha Beta, mana o so kpee udo n’etiti Apara na ụlọọrụ a bụ nke emeghi ka ọ pụta ihe.
BBC jụrụ Tinubu banyere ebubi ndị a gụnyere ọgwụike, ụtụisi nakwa ọnọdụ ahụike ya mana ọ jụrụ itinye ọnụ na ha.
Atiku Abubakar na Ụlọomeiwu Amerịka

Ebe foto si, Atiku/Facebook
Abubakar na-ahụta onwe ya ka onye kachasị maara ihe banyere ọchịchị s0 na-azọ ọkwa, dịka ọ nọọla n’ọkwa osote onyeisiala site na 1999 ruo 2007 - ọ bụ n’oge ndị a ka nghọtaghie batara.
Nna ya ukwu bụbu Onyeisiala Olusegun Obasanjo boro ya ebubo izu ego dị $145m site n’ụlọọrụ mmanụ agbịdị Petroleum Technology Development Fund (PTDF) n’afọ 2003.
Obasanjo onye na-anaghị eze ọnụ n’ikwupụta uche ya ji okwu banyere Abubakar mere isiokwu n’ime akwụkwọ o dere n’afọ 2014 a kpọrọ ‘My Watch’.
Abubakar gọnarịrị ebubo ahụ ma kwuo na e tinyere $145m ahụ n’ụlọakụ ka o nwee ike mụta ego e nwere ike itinyekwa n’ọrụ PTDF.
Abubakar dị afọ 76 sị na ọ kpatara ego ya site n’ọrụ ugbo, nwete ọtụtụ ụlọ na steeti ya bụ Adamawa. Onye a rụburu ọrụ custom sị na ọ chọpụtara na “aka na-aghọ ya nke n’ego” mgbe ọ dị na nwata.
Ọ hiwere ụlọọrụ mmanụ agbịdị n’oge afọ 1980 bụ nke mere ka ọ bụrụ ide ji ego a ma ama n’ụwa.
Ndị na-azọsị ya ọkwa boro ebubo na ọ dara iwu machiri onye na-arụrụ gọọmentị ọrụ itinye aka n’azụmaahịa na-abụghị ọrụ ugbo.
Ọnụ na-ekwuru kọwara azụmaahịa Abubakar dịka obere azụmaahịa ndị ọzọ nọ n’ọrụ gọọmentị na-eme, dịka iji ụgbọala ha agba ‘kabu kabu’ maọbụ ịkpọsa ahịa n’ihu ụlọ ha iji nyere ezinaụlọ ha aka.
“O tinyere ego nwete ya ka ọ mụbaara ya. Onweghi ọrụ ọzọ nke onwe ya ọ na-arụ dịka i si na-ekwu,” Ihe a ka Paul Ibe gwara BBC.
N’afọ 2010, otu kọmitee ụlọomeiwu mba Amerịka boro ebubo na Abubakar kwụnyeere otu n’ime ndị nwunye anọ ya ego dị $40m site n’ụlọọrụ Shell n’agbata afọ 2000 ruo 2008.
Akụkọ a sị na ihe ruru $1.7m n’ego ndị ahụ si n’aka azụ otu ụlọorụ mba Germany bụ Siemens kwụrụ, bụ nke kwetere na ha nyere akaazụ n’afọ 2008 ma kwete iji ego dị $1.6bn agwụ ụgwọ nha.
Aha ya pụtara mgbe a na-ekpe onye omeiwu mba Amerịka bụ William Jefferson ikpe maka nrụrụaka, Jefferson kọwara Abubakar dịka “onye mpụ riri ahụ” ma sị na ọ chọrọ ịkwụ ya ụgwọ ka ọ kwado azụmaahịa otu ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa.
A mara Jefferson ikpe n’afọ 2009 ma tụọ ya nga afọ iri na atọ, bụ nke e mechara belata.
Abubakar agọọla ugboro ugboro na onweghi ihe ọjọọ ọbụla o mere, ma ya ma onye bụbu nwunye azabeghi ajụjụ ọbụla metụtara mpụ n’ụlọikpe.
“Onweghi ikpe banyere mpụ ọbụla a na-ekpe Atiku Abubakar ma Naịjirịa nakwa mba ọzọ.” Ka Ibe kwuru.
“Ọ gaghị enwe ike ịzọ ọkwa naanị ma ọ bụrụ na ụlọikpe sị na aka ya adịghị ọcha. Mana ọ dịghị etu ahụ dị ugbua.”
Peter Obi na akwụkwọ Pandora

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Peter Obi chịrị Anambra steetị dịka gọvanọ ugboro abụọ anaghị ezo akụnaụba ya ezo, bụ nke ọ sị na o nwetere site n’ịrụ ọrụ n’ụlọakụ nakwa mbubata ọtụtụ ngwaahịa na Naịjirịa.
Dịka ndị nkwado ya na-akpọ ya “onye dị ọcha” maka etu o si pụọ iche na enweghi akụkọ izu ego, mana ọ bụ ihe ịtụnanya mgbe aha ya pụtara n’akwụkwọ Pandora e wepụtara na 2021. Nke a bụ akwụkwọ zoro ezo na-ekpuhe akụnaụba ndị zoro ezo, anaghị akwụ ụtụisi, ebubo ibupụ ego n’ụzọ ezighi ezi nke ọtụtụ ndị nwere ego n’ụwa na-eme.
Ụlọ ntaakụkọ na Naịjirịa bụ Premium Times so mee nyocha banyere akụkwọ Pandora sị n’akwụkwọ ahụ gosiri na 2010 mgbe Obi bụ gọvanọ Anambra na o ji aha nwa ya nwaanyị hiwe ụlọọrụ na mba Briten ka o nwee ike ghara ịkwụ ụtụisi.
Iji atụmatụ ‘tax haven’ adaghị iwu, mana ọ dịghị mma imepe ọbaego na mba ofesi mgbe i ji ọkwa na gọomentị.
Premium Times sị na nke a gosiri na Obi akpọpụtaghị akụnaụba o nwere ma sị na ọ jụrụ ịgbatu n’ọkwa dị ka onye nwe ụlọọrụ Next International na mba Briten mgbe ọ bụ gọvanọ - nke bụ ị nọ n’azụmaahịa mgbe iji ọkwa na gọọmentị bụ nke megidere iwu. Ọ gbara arụkwaghịm n’ime ọnwa iri na anọ ọ banyechara n’ọkwa.
A kpụpụbeghi nwamadị a dị afọ 61 n’ụlọikpe banyere mkpuhe ndị a.
Obi gwara BBC sị na e meela nyocha banyere ebubo azụmaahịa ya na 2006 ma chọpụta na o so n’ụsoro iwu.
Ọ sị na o hiwere ngalaba a kpọrọ ‘blind trust’ ga-eleba anya n’ihe ọbụla banyere azụmaahịa ya, gụnyere nke ezinaụlọ ya dị n’ofesi. “atụmatụ blind trust emegideghi iwu,” ka o kwuru.
E bokwara Obi ebubo itinye ego gọọmentị Anambra dị $20m mgbe ọ bụ gọvabọ n’ụlọorụ na-emepụta mmanya nke ezinaụlọ ya so nwere.
Ọ gọnarịrị ebubo ahụ ma sị na egọ ahụ mụtaara ndị Anambra ezigbo ego n’ime ọtụtụ afọ.
E nwekwara ndị na-akatọ ya na o tinyere ego gọomentị Anambra n’ihe ụlọakụ Fidelity, bụ nke ọ bụbu onyeisioche ha.
“Anambra tinyere ego n’ụlọakụ Fidelity bụ ebe m nwere ego na ya, maka na ọ bụ ụlọọrụ ehiwere maka ọha (public quoted Company),” ka ọ gwara BBC, ma kụchapụ atụmatụ ọbụla na-ekwu na mkpuhe ndị a nwere ike imetụta ohere ya n’ịzọ ọkwa.
Ihe nketa Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari
N’izuụka gara aga, ndị otu Abubakar na nke Tinubu na-ebu onwe ha ebubo izu ego ndị ọha site n’ụlọọrụ ndị a kpọrọ special purpose vehicles (SPVs) mgb ha nọ n’ọrụ, na-ekwu na nke a agaghị eme ka ha zọọ ọkwa ahụ, nke ọnụ na-ekwuru Tinubu nke APC sị na ọ ga-ewepu okwu ahụ n’ụlọikpe.
Ndị otu abụọ a gọnarịrị ebubo ndị ahụ mana ọ bụ ya bụ isi achụnta vootu ha.
Mana okwu banyere mpụ na nrụrụaka abụbeghi ihe a kpụ n’ọnụ n’oge achụnta vootu nke ntuliaka a.
Nke a bụ ihe dị ezigbo iche n’oge ntuliaka afọ 2015 nyere Onyeisiala Muhammadu Buhari mmeri bụ nke o kwere nkwa ibuagha megide mpụ na nrụrụaka.
Nwamadị a dị afọ 80 ga-arịtu n’ọkwa n’afọ a, mana ndị ọnụ na-eru n’okwu sị na o nweghi ezigbo ihe ọbụla n’igbo nsogbu ndị mgbe ọ nọ n’ọkwa.
“O nwereike mpụ amaala ndị Naịjirịa ahụ ma ha achọpụta na onweghi ihe na-agbanwe,” ka maazị Rafsanjani kwuru.









