Aisha Buhari: Amaghị m ma anyị mezuru ihe ndị mmadụ tụrụ anya na anyị ga-eme, mere m jiri rịọ ndị Naịjirịa

Aha onyonyo, "Ihe mere m ji rịọ ụmụ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di m" - Aisha Buhari
Aisha Buhari: Amaghị m ma anyị mezuru ihe ndị mmadụ tụrụ anya na anyị ga-eme, mere m jiri rịọ ndị Naịjirịa

Aisha Buhari bụ nwunye Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari akọwaala ihe mere o jiri rịọ ụmụafọ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di ya.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere, Aisha sị na n’uche nke ya, na ọ cheghị na di ya mezuchara ọtụtụ nkwa ndị o kwere oge ọ na-achụ nta vootu tupu ọ banye ọchịchị.

O kwuru na ọ bụ n'ihi nke a ka o ji rịọ ndị Naịjirịa mgbaghara, maka na o nwere ike ha emeghi ihe ndị mmadụ na-atụ anya n'aka ha.

Aisha Buhari bụ nwunye Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari akọwaala ihe mere o jiri rịọ ụmụafọ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di ya
Nkọwa foto, Aisha Buhari bụ nwunye Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari akọwaala ihe mere o jiri rịọ ụmụafọ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di ya

Mgbe a jụrụ ya ebe ndị o chere ọchịchị di ya emeghi nke ọma, Aisha kwuru na ọ maghị.

O kweghikwa etinye ọnụ n'okwu gụnyere mkpamkpa oke idemmiri na-akpa na steeti dị iche iche na Naịjiria, ndị ntorobịa nakwa ụmụnwaanyị na ndọrọndọrọ ọchịchị, dịka ọ sị na ndọrọndọrọ ọchịchị agbasaghị ọrụ ọ na-arụ.

N'okwu ya, “Ụlọọrụ nke m dị ka ebe a na-enyere ndị mmadụ aka, ana m anabatakarị ndị mmadụ ebe a ma kwado ha n’ihe banyere ahụike na agụmakwụkwọ”.

A nọ n'ụlọọrụ ya n'Aso Villa gbaa ya ajụjụ ọnụ a, ebe ọ nọ kwuo na e nweghi bọjeetị e kewapụtara maka ọrụ ndị a ọ na-arụ dịka nwunye onyeisiala.

Gbasara kepukepu ka o bi na Dubai karịa Naịjiria, Aisha Buhari kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.

Ọ rụtụkwara aka n'akụkọ pụtara na ọ chọrọ ịbanye ndọrọndọrọ ọchịchị ma zọọ ọkwa. Ọ gwara BBC na ọ na-atụ anya ya na ezinaụlọ ya ịnọkọ ma ọ laa ezumiike nka.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ naghị azọ ọkwa ọbụla, n'ihi na o cheghi na o nwere ọkwa ọzọ ga-akarị nke ọ bụ - nwunye onyeisiala.

Aisha gara n'ihu kwuo na o nwere olileanya na otu All Progressives Congress (APC) nọ n’ọchịchị ugbua ga-alaghachite n’ọkwa ma e mechaa ntuliaka n’ọnwa Febrụwarị afọ 2023.

Aisha Buhari

Onye bụ Aisha Buhari?

  • Aisha Buhari (a mụrụ ya Aisha Halilu) bụ nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari.
  • A mụrụ ya n’ụbọchị 17 nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 1971
  • Ọ lụrụ di ya bụ onyeisiala Muhammadu Buhari n’ọnwa Disemba afọ 1989 (ọ bụ nwunye ya nke abụọ)
  • Ha nwere ụmụ na ụmụ ụmụ
  • Dị ka o si kwuo, a mụrụ ya ma zụọ ya na Yola dị n’Adamawa steeti
  • Ọ gara Mahadum Ambrose Alli University dị n'Ekpoma nke Edo steeti, ebe ọ gụrụ 'public administration' ma nwetekwa asambodo na Nigerian Defence Academy, dị na Kaduna
  • Ọ nwetara ọzụzụ dịka onye nkuzi ma gụo ‘Social Studies’ ka ọ dịrị ya mfe ịzụ ụmụ ya
  • Ọ nwetakwara ọzụzụ dịka ọkaibe n'ịchọ mma.

Gee ihe ndị ọzọ o kwuru n’uju ebe a: