Voters Registration: Ụfọdụ ihe mere ndị Naịjirịa ji enyo INEC enyo maka ntuliaka 2023

Dịka ntuliaka ọkwa ọchịchị dị iche iche na Naịjirịa ga-ebiri ọkụ n’afọ 2023, ọ dịzi ka a ga-asị na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa mụzi anya dịka azụ.
Nke a bụ maka etu ha si eso okwu banyere ntuliaka nke afọ 2023 site n’ịgbata akwụkwọ ikike e ji atụ vootu.
Mana o nwere ụfọdụ ihe si n’aka ụlọọrụ ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC) nke na-agbagwoju anya.
Nke a mere ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa ji enwe obi abụọ n’ebe INEC nọ, na-ajụ ma “ha nwere ugwu ịhazi ntuliaka afọ 2023?”
Ụfọdụ ihe ndị e ji enyo INEC enyo

1. Ndebanye aha ndị erughi afọ ịtụ vootu
Ọtụtụ akụkọ na foto na-efegharị na soshal midia na-ekwu na a chọpụtara ọtụtụ aha ndị na-erughi afọ ịtụ vootu n’ime akwụkwọ ụlọọrụ Inec.
Akụkọ kwuru na ndị e debanyere aha ndị a dịka a malitere ndebanye aha ndị ga-atụ vootu ma sị na ọ bụ na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa ka ọ kachasị njọ.
Ọtụtụ katọrọ nke a ma kwuo na obi esighi ha ike n’ebe ụlọọrụ Inec maka nhazi ntuliaka afọ 2023.
Mana ụlọọrụ Inec wepụtara ozi ma kwuo na ha ga-enyoba anya ebe mmiri si banye n’opi ụgbọghọrọ ma taa ndị ọrụ ha aka ha dị na ahụhụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
2. Ndebanye aha ndị na-abụghị ndị Naịjirịa
Ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji enyo ụlọọrụ Inec enyo bụ maka akụkọ pụtara n’izu ole na ole gara aga nke kwuru na aha ndị na-abụghi ndị Naịjirịa dị n’akwụkwọ ikike ịtụ vootu.
Nke a na-abịa dịka otu a kpọrọ ‘Coalition of United Political Parties’ boro ebubo na a chọpụtara aha aha adigboroja n’akwụkwọ ndebanye aha ikike ịtụ vootu.
Ọnụ na-ekwuru otu a bụ Ikenga Ugochinyere gbara ama a ma kwuo na ọ kachasị na mpaghara Omuma Imo steeti nke ọ kpọrọ ‘ọmụma magic’.
Ụlọorụ Inec site n’ọnụ onyeisi ha bụ Mahmood Yakubu sị na ha chọpụtara aha adịgboroja karịrị nde abụọ (2.7million) n’akwụkwọ ha ma chọpụtakwa ndị ọrụ mmadụ iri abụọ na atọ aka ha dị na ya.
Ọ gara n’ihu kwu na ha ekpochapụla aha adịgboroja ndị a,e ebe a ga-ata ndị aka ha dị na ya ahụhụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
3. Nchọpụta akwụkwọ ikike ịtụ vootu (PVC) n’ebe ndị dị aṅaa
Ugboro ugboro ndị mmadụ zipụtara ozi etu ha siri chọpụta maọbụ hụ akwụkwọ ikike ịtụ vootu bụ ‘Permanent Voters Card’ (PVC) n’ebe ndị dị aṅaa.
N’ọnwa Julaị nke afọ a, ihe onyonyo a sị si Imo steeti pụta gosiri ka ndị mmadụ gbakọrọ na-egwupụta PVC ọtụtụ ndị mmadụ n’ala.
Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na ha ga-eme nnyocha n’okwu a dịka a sị na ebe a hụrụ PVC ndị a bụ n’akụkọ ụlọ otu onye a sị nwere agba n’ọchịchị nke a na-ekwupụtaghị aha ya.
N’otu ọnwa ahụ, akụkọ pụtara na otu ndị nche hụrụ ọtụtụ PVC ndị mmadụ ngụkọ ya ruru 320 n’ime akpa tọgbọọ n’ala n’ime otu ụlọ arụchabeghị arụcha na Bayelsa steeti.
A sị o mere n’okporoụzọ AIT-Elebele. Onye ọrụ Inec na steeti ahụ bụ Okop Umobong gbara ama na ya bụ akwụkwọ ikike ịtụ vootu bụ nke ndị mmadụ n’ezie ma kọwaa na ha ga-ebuga ya n’ime ụlọọrụ ha bụ ebe ọ kwesiri ịdị ma kwuo na ha ga-amalịte nnyocha ima etu ha siri banye ụlọ ahụ.
A na-eche ka anụ ozi Inec n’okwu nnyocha ha merela na nchọpụta PVC ndị a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4