2023 Presidential Election: Anyị nwere ihe akaebe na Peter Obi meriri Ntuliaka 2023- Ohaneze

Ohaneze na Peter Obi

Otu Ohaneze ekwuola na ha nwere ihe akaebe gosiri na ọ bụ nwa afọ bụ Peter Obi nke Labour Party bụ onye meriri na Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023.

Nkwụpụta nke otu a so akụkọ na-efegharị na soshal midia nke boro ebubo na Ohaneze sị n’ịbụ onyeisiala abụghị akalaka Peter Obi.

Otu onye a kpọrọ 'Ambassador Tony' nọrọ n’ozi ekele o zigaara Bola Tinubu nke APC sị na ọ bụ n'aha Otu Ohaneze maka mkpọpụta Inec kpọpụtara ya dị a onye meriri na ntuliaka e mere n’abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 , sị na, akalaka obi abụghị ka ọ bụrụ onyeisiala ugbua.

Mana Odeakwụkwọ Ukwu Ohaneze Ndịgbo bụ Ambassador Okey Emuchay gbarụrụ ihu na ndị ntaakụkọ na-ege onye abụghị onye otu ha nke ọ na-enwe ikike ikwuru otu Ohaneze ntị.

N’ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde, kwuru sị, “Anyị na agọpụ onwe anyị n’akụkọ sị na Peter Obi enweghị akalaka ịbụ onyeisiala, kama anyị nwere ihe akaebe doro anya na ọ bụ Peter Obi na Datti Ahmed meriri na ntuliaka onyeisiala e mere na Satode, abalị 25, afọ 2023.”

“Obi dị Ohanaeze Ndigbo nnukwu ụtọ na ụdị mkpalite Obi-Datti ụmụafọ Naijiria nke dị nnukwu iche na ihe na-emebu.”

Cheta na Inec kpọpụtara Bola Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka 2023 mana Peter Obi nke Labour Party na Atiku Abubakar nke PDP kwuru na wuruwuru dị na ya dịka Inec agbasoghị usoro ha wepụtarara maka ntuliaka.

2023 Presidential Election: Ihe Ohaneze,Afenifere kwuru maka nhọpụta Tinubu dịka onye meriri
Ohaneze Ndigbo na Bola Tinubu

Ebe foto si, BBC/Tinubu

Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha anabataghị mkpọpụta Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala Naijiria.

Otu ahụ jịkọrọ ndị Igbo gara n'ihu kpọkuo otu United Nations na mba ndị ọzọ mepere emepe ụwa ka ha taa otu na-ahazi ntuliaka Naijiria bụ Independent National Electoral Commission(Inec) nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka ha dị na wuru wuru na ntuliaka ahụ ahụhụ.

Inec nọrọ n'ụzọ ụtụtụ Wenezde kpọpụta Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka 2023 dịka ụlọọrụ ahụ kwụpụtara na Tinubu nwetara vootu 8,794,726, Atiku Abubakar nke PDP nwetara 6,984,520,ebe Peter Obi nke Labour Party nwetara 6,101,533.

Mana otu Ohaneze site n'ọnụ Osote onyeisi otu ahụ bụ Ichie Damian Ogene kwuru na "Nke a bụ ntuliaka kachasị njọ na Naijiria Inec merela na Naijiria."

Ohaneze na Bola Tinubu

Ebe foto si, Ohaneze/BolaTinubu

Ogene kwuru na mkparịtaụka ya na ụlọantaakụkọ Legit nwere sị, "Onyeisioche Inec na-ekwe ụmụ Naijiria nkwa na a ga-eji vootu ha kpọrọ ihe, na a ga na-etinye mpụtara n'ọbaozi Inec ndị a na-agụkọ ya n'ọgbọ atụmvootu, Inec gazie mee ihe nile n'aka nakwa n'ụzọ wuruwuru."

"Ka o si gaa, ọtụtụ ụmụ Naijiria tụrụ vootu, mana ejighị vootu ndị mmadụ kpọrọ ihe nke na-agbawa obi."

" Ọ bụrụ na otu 'Labour Party'(LP) gaa ụlọikpe, ajọ ihe niile e mere n'ụbọchị Febrruary 25, 2023 e mere ntuliaka Onyeisiala ga-apụta ihe ka ụwa nile hụ."

Onye ọ dịghị mma gawa ụlọikpe, Tinubu ga-eweta 'restructuring'- Afenifere

Njirimara Afenifere

Ebe foto si, Afenifere/Facebook

Otu jikọrọ ndị Yoroba bụ Afenifere ekelela Bola Ahmed Tinubu nke APC dịka Inec kpọpụtara ya dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala afọ 2023.

Afenifere kwuru na mmeri ya ga-eme ka Naijiria jịkọta ọnụ dịka ha rịọrọ ya ka ọ ghara ichefu maka ịhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara.

N'ozi nke Odeakwụkwọ Mgbasaozi otu ahụ bụ Jare Ajayi binyere aka ma wepụta na nso nso a, " inweta ọkpụrụkpụ vootu na mpaghara ise Naijiria gosiri na nhọpụta Ahmed Bola Tinubu na Osote ya bụ Kashim Shettima mkpa ọ dị ụmụ Naijiria ka a hazigharị Naijiria ka ọ nọrọ na mpaghara ma jịkọkwa ọnụ."

“Mba nke mpaghara ọbụla , nwamala ọbụla ga-ahụ onwe ya ka onye sonyere, na-agbanyeghị okpukperechi, asụsụ maọbụ ebe onye si."

Ọ gara n'ihu gwa ndị nke a adịghị mma ka ya bụ ntuliaka si gaa ka ha gawa ụlọikpe, si ,"Ka anyị hapụ ka udo chịa dịka ụnụ na-aga ụlọikpe."

Anyị enwebeghị onyeisiala na-abata-Adebanjo

Pa Ayo Adebanjo

Otu okenye welitere isi na'a Yoroba bụ Pa Ayo Adebanjo ekwuola na ntuliaka họpụtara Bola Tinubu dịka onyeisiala ga-aba n'ọkwa bụ nke mago mago.

Pa Ayo Adebanjo, onye bụ onyeisi otu Afenifere kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde na mkparịtaụka ya na BBC Yoroba nwere.

Ọ sịrị, " Ihe mere abụghị ntuliaka, anyị ma na e mere mago mago. Anyị anabataghị ya."

"Kedụ ndị na-ezigara onye a sị na ọ bụ ya bụ onyeisiala na-abata? Anyị enwebeghị onyeisiala na-abata."

"Ndị si mba ndị ọzọ bịa maka ịhụta ka ntuliaka si gaa na ndị pati ndị ọzọ na anọghị na gọọmentị akatọọla ka ihe siri gaa."

O kwuru na Inec kwere nkwa iji BVAS mee ntuliaka mana e meghị otu ahụ.

"Ọ bụghị naanị anyị na-akpo oku ka a kagbuo ntuliaka a, ndị si mba ọzọ bịa hụ ihe mere , Abdulsalam Abubakar(aka chịburu Naijiria) akpoola oku ka a kagbuo ya."

"Ndị pati ndị ọzọ megidere mpụtara ntuliaka onyeisiala n'ihi na ọ bụghị vootu anyị tụrụ ka ha kpọpụtara."

Bode George: Ka Inec hụrụ na 'server' arụghị ọrụ, ha gaara ihigharị ntuliaka

Bode George

Otu okenye Yoroba bụ Bode George so na ndị gbarụrụ ihu na mkpọpụta Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala 2023.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere ụbọchị Tọzde, o kwuru na ntuliaka ahụ si na usoro e ji mee ya gbarụọ.

"Wuru wuru bụ ntuliaka nke a e mere. Chukwu ga-ajụkwa ha maka ya”.

"Nke mbụ, Onyeisi Inec(mahmood Yakubu) gwara anyị tupu ntuliaka na ọ bụ, a na-eme ntuliaka n’ọgbọ atụmvootu, a na-eziga mpụtara ya n’ọbaozi ha."

"O rue ụbọchị ntuliaka, ọ sị na igwe anaghị arụzị ọrụ.”

“Ọ gara asị, 'ụnụ ewela iwe anyị ga-eme ya ụbọchị ọzọ'."

"Ihe nile ha mere bụ mago mago. Ha emebirila anyị ala anyị.”

“ Ndị nile bịara hụ etu anyi si mee ntuliaka, ihe nile ha mere,ọ bụ etu a ka e si eme ya n' ala ha?"

“Kedụ ka o si bụrụ n’abalị ka o kwuru na ihe na-eme.”

“Anyị ekweghị. Mụnwa bụ Bode George ekweghị m, asị ka ha na-atụ.”

Bode George, onye kwuru na Onyeisi Inec dara iwu ntuliaka sịrị, "Ị kpọrọ onwe gị Professor, kedụ ka i siị na-atụzị asị?"

"Ebe m tụrụ vootu, a ma ihe mụ na ndị ọzọ nọ ebe ahụ tụrụ."

George kwuru na ebe ndị mmadụ ji vootu ha kwuo na ha achọghịzi bụ ebe Inec gara tụnye ha site na ihe ha kpọpụtara.

"Ha kpọghachiri anyị azụ afọ 60."