"Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George

Aha onyonyo, "Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George
"Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George
"Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George
Nkọwa foto, "Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Bode George bụ onye ndu Peoples Demcoratic Party akọwaala kpọmkwem ihe butere esemokwu n’etiti Atiku Abubakar, Nyesom Wike na Ayo Iyorcha.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, George sị na ọ bụ etu e si kesa ndị ji ọkwa ọchịchị na PDP na-ese okwu.

Ọ sị na otu n’ime ndị a bụ mpaghara ebe onye onyeisioche pati ahụ si pụta.

George sị na ndị tọrọ ntọala ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa gụnyere Alex Ekwueme, Bola Ige, Jim Nwobodo na ndị ọzọ bịara kee Naịjirịa mpaghara isii iji hụ na udo chịrị.

Bode George so na ndị ndu PDP
Nkọwa foto, "Ihe m chere maka ọpụpụ Peter Obi na PDP na ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ..." - Bode George

Ntọala a hụrụ na mpaghara ọbụla ga-ahọpụta onye ga-eji ọkwa ọchịchị na gọọmentị etiti malite n’Onyeisiala ruo n'onyeisioche pati ha.

George sị na ihe dị n’iwe pati ha bụ PDP bụ na a ga na-eke ọchịchị bụ zoning, mana o rutere ugbua ihe niile nyụọ ka ọkụ.

Ọ sị na ọ dịghị mma ka onye na-azọ ọkwa onyeisiala na onyeisioche pati ahụ si n’otu mpaghara pụta.

Ọ gara n’ihu dụọ ndụmọdụ sị na ọ bụrụ PDP akpachaghị anya na ha agaghị achịta aja na ntuliaka afọ 2023.

George tinyekwara ọnụ maka ọkwa ọchịchị Peter Obi nke Labour pati nakwa Bola Tinubu nke APC na-azọ.