Atiku Abubakar: Ana m ayọ ndị niile jiri iwe pụọ n'otu pati PDP ka ha lọta - Atiku

Ebe foto si, Atiku/Facebook
Atiku amaburula ọkọlọtọ Peoples Democratic Party ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023.

Ebe foto si, Atiku/Facebook
Ndị niile tụrụ vootu dị mmadụ 773.
Ọgụgụ ndị na-azọ ntuliaka malitere elekere 11 n'abalị.

Ndị so n'ịzọ ịnweta ọkọlọtọ PDP na ihe ha nwetara:
- Nyesom Wike 237
- Sam Ohuabunwa 1
- Pius Anyim Pius chịtara vootu 14
- Abubakar Atiku chịtara vootu 371
- Dele Momodu chịtara vootu 0
- Emmanuel Udom 38
- Bukola Saraki 70
Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ taa ta
Tambuwal chiliri aka elu nkenke
Cheta na n'abalị a ka Gọvanọ Sokoto Steeti bụ Aminu Tambuwal achilila aka elu n'atụmatụ ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru pati PDP dịka ọ na-adonyeziri Atiku Abubakar ukwu n'atụmatụ ya ịzọ ya bụ ọkwa.

Ndị EFCC, ndị ọrụnchekwa na ndị Inec bịara ihu ka ihe niile si aga.
- Ozi gbara na soshịal midia na ndị ụlọrụ EFCC bịara ịhụ na ihe gbara igoro vootu agaghị ewelite isi na ntuliaka imeụlọ PDP.
- Ndị ụlọọrụ Inec bịakwara ilebanya ka ntuliaka si aga.
- Ndị ọrụ nchekwa jupụtakwara ịhụ na agaghị enwe ọgbaghara ọbụla na ya bụ ntuliaka taata.
Ntụlịaka imeọlụ ndị PDP ka na-aga n'ihu na MKO Abiola Stadium dị na Abụja n'ụbọchị Mee 28, 2022.
Ndị nwere agba na patị ahụ awụchirị na ogige ahụ n'isi ụtụtụ.

Ndị mmadụ gụnyere ka David Mark, Douye Diri nke Bayelsa, Seyi Makinda nke Oyo steeti Steeti na ndị ọzọ a nwụrụla ọkwa n'aka wuchie na ya bụ Ogige.

Ndị ọzọ ị ga-ahụ n'ogbo ebe ahụ bụ mmadụ dịka Raymond Dokpesi, Dino Melaye nakwa ndị ọzọ.

Ndị otu patị PDP si n'Abia.


Ndị otu patị PDP si n'Imo.

Ọtụtụ ndị ama ndị a na-eze bụ ndị deligatị etukwurula na ogige nke ha.
E dechara aha steeti niile n'ogige nke ha bụ ebe a tụrụ anya na ha ga-etukwu ma ha bịa.PDP primaries: A malitela ịgụ vootu na ntuliaka imeụlọ PDP

Ndị uweojii juru eju bara abara n'ime nakwa mpụga ogige a iji hụ na ọnweghị onye kpara ajọ agwa ebe ahụ.
I hugodi ndị uweojii nọ ebe ahụ ijiri nwayo nọrọ ofu ebe mara na ọ bụghị egwu ọnwa ka a pụtara ebe ahụ.
A dọnyere igbe e ji atụ vootu iri na anọ n'etiti ọgbọ bụ ebe nke gosiri mmadụ iri na anọ a ga-atụrụ vootu.
O kwesiri ịkarị ole ahụ ma ọ bụrụ na Peter Obi na Mohammed Yahatu-Deen ka nọ n'egwu.
Mana ha abụọ eserela ukwu na ya bụ egwu maka ihe ha sị na ọ bụ ihe nruruaka ha hụrụ na otu PDP.
Akụkọ ka na-abịa o.







