Labour Party: Peter Obi ekwuola ihe mere o ji họrọ pati ahụ

Ebe foto si, Peter Obi and Labour Party
Peter Obi bụ aka chiburu Anambra Steetị abanyela Labour Party (LP) n'ụbọchị Fraịde 27 Mee, 2022.
Ọ gbara ama a site n'ozi o wepụtara n'akara Twitter bụ ebe o kerele ndị ntoroọbịa maka nkwado ha nyere ya.
Nke na-abịa n'ime ụbọchị abụọ Obi si pati PDP pụọ ma sị na ọtụtụ ihe ndị na-emegasị na pati ahụ ugbua mere o jiri pụọ.
Obi sị na kamgbe ọ hapụrụ PDP na ya na ọtụtụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị mmadụ enweela mkparịtaụka iji hụụ na e si usoro ndị mma nwete ihe Naịjirịa na-achọ.

Ebe foto si, Peter Obi
N'okwu ya "n'uche obi m, usoro inwete ihe anyị chọrọ dịkwa mkpa ka ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na enwete ya".
"Ya mere, a họrọla m ụzọ m hụtara na-eso ntọala ihe m na-achọ nakwa iwu m iwepu Naịjirịa site ndị oriri pụta na ndị na-arụpụta ihe; otu ahụ bụ 'Labour party' bụ nke yiri nkwenye ndị mmadụ, ndị ọrụ, mmepe, nrụpụta ihe nakwa nchekwa nakwa ijikọ Naịjirịa ọnụ dịka otu ezinaụlọ."
"Ana m akpọku ndị Naịjirịa niile ka unu soro m iji iwagharịa obodo anyị. Ana m ekwe unu nkwa na agaghị m emechu unu ihu."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe ị kwesiri ịma maka Labour Party

Ebe foto si, Labour Party
- E hiwere Labour Party n'afọ 2002.
- Ọ bụ otu na-ahụ maka ọdịmma ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress hiwere pati a.
- Ụfọdụ ndị nwere agba nọbu na pati a gụnyere; aka chịburu Ondo steeti bụ Olusegun Mimiko, aka chịburu Oyo steeti bụ Alao Akala, Aka chịburu Edo steeti bụ Adams Oshiomole nakwa Femi Pedro bụbu osote gọvanọ Legọs steeti.
- Olusegun Mimiko bụ naanị onye zọtarala ọkwa Gọvanọ n'aha pati a kamgbe e hiwere ya.
- N'afọ 2007, pati zọtara otu oche n'ime oche 360 na ntuliaka ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa mana ha enweteghi oche ọbụla n'ụlọomeiwu nta.
- Dịka pati a si n'otu Nigerian Labour Congress pụta, ha kwuru na isi sekpu ntị ha bụ nsogbu ibuli ụgwọ ọnwa ọpekatampe ndị ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.
- Onyeisi pati a ugbua bụ ọkaiwu Julius Abure ebe ọdeakwụkwọ ha bụ Umar Farouk Ibrahim.
Gịnị mere Peter Obi jiri si na PDP pụọ?

Ebe foto si, Peter Obi
Peter Obi chiburu Anambra Steetị na-achọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha PDP apụọla na pati ahụ.
O kwuru nke a n'ozi si n'akara Twiter ya pụta n'ụbọchị Wenezde 25 Mee, 2022.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'akwụkwọ ozi o degaara onyeisi pati PDP bụ Sịnetọ Iyorchia Ayu n'ụbọchị Tuzde 24 Mee, afọ 2022 sị na Obi esepụla aka n'ịzọ ọkwa Onyeisiala n'aha pati ahụ.
Obi sị na obi dị ya ụtọ iwulite obodo Naịjirịa n'aha PDP mana ọtụtụ ihe ndị na-emegasị na pati ha ugbua mere o jiri raa ya ahụ ịganihu isonye na pati ahụ.

Ebe foto si, Peter Obi
Ọ sị na mbọ ọ na-agba ịzọpụta Naịjirịa n'aka ọdịda ka dị ire na-agbanyeghi n'ụzọ ọ ga-esi eme ya nwereike ịdị iche.
Obi gara n'ihu kelee onyeisi pati ya maka ma sị ya jisie ike n'ihe ọ na-eme na pati ahụ.
Nkwupụta a Obi mere gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya dịka ha na-ajụ 'kedụ ebe ọzọ o nwereike itinye isi?'
Peter ekwubeghi pati ọzọ ọ ga-abanye maọbụ ihe ọzọ ọ ga-eme dịka ọ dị ugbua mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'oge gara aga, ọ sị na o nweghi onye maara echi
Mgbe PDP ga-eme ntuliaka ime ụlọ

Arụkwaghị m Peter Obi gbara na-abịa dịka ọ fọrọ ụbọchị atọ ka e mee ntuliaka ime ụlọ nke PDP maka ọkwa Onyeisiala.
Nke a ga-adị n'ụbọchị 28 na 29 Mee, afọ 2020 n'Abuja.
Ndị gosiri mmasị ha n'ịzọ ọkwa ahụ gụnyere; Atiku Abubakar, Bukola Saraki, Sam Ohabunwa, Aminu Tambuwal, Nyesom Wike, Bala Mohammed and Ayo Fayose.
Ndị ọzọ bụ Anyim Pius Ayim, Emmanuel Udom, Dele Momodu, Mohammed Hayatu-Deen na ndị ọzọ.
Ihe i kwesịrị ịma maka Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi
A mụrụ Peter Gregory Obi n'Ọnịcha na 19 July 1961.
Ọ gara ụlọakwụkwọ Praịmarị Sancta Maria Primary School Onitsha nakwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Christ the King College, Onitsha.
O nwere ụmụnne anọ.
Ọ gara mahadum University of Nigeria, Nsukka (B.A), Lagos Business School, Nigeria, Harvard Business School, Boston, London School of Economics, Columbia Business School, New York nakwa Institute for Management Development, Switzerland
A ma ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị na onye oji ego achụ ego.
Ọ bụ osote Atiku Abubakar na ntuliaka 2019 n'okpuru otu patị People's Democratic Party PDP.
Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ododziakụ Margaret Brownson Usen n'afọ 1992. Ha mụrụ ụmụ abụọ.










