Peter Obi: Ọ bụghị ụnyaahụ ka a kpachiri ọbaego ya - Ike Abonyi

Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images

Onye ndụmọdụ Uche Secondus bụ Ike Abonyi, gwara BBC na o teela aka a kpachiri ọbaego Peter Obi.

Ọ gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ n'ime izuụka gara aga ka Peter Obi chọpụtara na o nweghi ike iwere ego n'ọbaego ya.

"Ọ malitere ịkọrọ ndị otu PDP nke mere na ha depụtara akwụkwọ ịkatọ ya bụ ihe" bụ ihe Abonyi kwuru.

Ka otu PDP wepụtachara akwụkwụọ na-akatọ etu e si kpachie ọbaego niile Peter Obi na ndị be ya nwere, ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Val Obienyem, kọwara na ihe dị etu ahụ mere n'ezie.

Obienyem kwuru na ụjọ adịghị atụ ha makana ọ maara na aka Peter Obi dị ọcha.

O kọwara na ha ji ndidi eche ka gọọmentị etiti bụ ndị ha na-atụ aka pụta kwuo ihe mere ha ji kpachie ọbaego Obi ka ha wee saghachị ha makana "ahụ okwu, ahụ ọsịsa ya".

O kwuru na kamgbe ihe a mere, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ makana Obi bụ onye ndị mmadụ nabatara dịka onye na-azọ oche osote onyeisiala n'okpuru pati PDP.

Cheta na otu PDP site n'aka ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kola Ologbondiyan, depụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Dec 8, 2018, na-akatọ mkpachi a kpachiri ọbaego Obi.

Otu PDP kwuru na ọ bụ makana ụjọ ji otu pati APC maka etu ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si akwado Atiku na Obi.

N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ EFCC bụ Tony Orilade, ekwuola na aka ha adịghị na mkpachi ọbaego Obi.

N'ọnụ ya, "ebela ọyọrọ ọyọrọ ebe ọ na-ekwesighị ka e bee ya."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: