Electoral Amendment Act: "Emezuola m nkwa m kwere inye Naịjirịa usoro ntuliaka bụ ọkaibe" - Buhari

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ya emzuola nkwa o kwere na ya ga-enye ụmụ Naịjirịa usoro ntuliaka bụ ọkaibe.
Buhari kwuru nke nisi ụlọọrụ gọọmentị dị n'Abuja oge o binyere aka n'iwu ntuliaka ahaziri ọhụrụ bụ nke a kpọrọ 'Electoral Amendment Act 2022", taa bụ Fraịde, Febrụwarị 25, 2022.
Ndị nọ ya oge Buhari binyere aka n'iwu a gụnyere: Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmad lawan, nakwa onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila.
N'okwu ya, Buhari kwuru na obi dị ya mma ịhụ na iwu ntuliaka ọhụrụ a nwerer ụfọdụ ihe dị iche nke ga-eme ka ntuliaka na Naịjirịa kawanye mma, ma belata nrụrụaka.
O kwuru sị: "Mbọ niile a anyị gbara bụ iji gbado ụkwụ na nkwa anyị kwere nke bụ iwepụta usoro ntuliaka nke ga akwụdosi ike, ma bụrụkwa nke anyị niile ga-eji na-anya isi."
"E nwere ọtụtụ ndịiche dị n'etiti akwụkwọ iwu nke a na nke e megharịrị n'afọ 2021."
"Ọ dị ọtụtụ mgbanwe nakwa atụmatụ ọhụrụ dị n'iwu nakwa ụfọdụ teknụzụ ọhụrụ bụ nke ga-eme ka ntuliaka na Naịjirịa kawanye mma, ma mekwaa ka ụmụ Naịjirịa nwee ike ịtụ vootu ha n'ụzọ kwesịrị ekwesị."
Kama Buharị rụtụrụ aka na ngalaba iwu ahụ nke o kwuru na ọ dabaghị adaba, nke bụ ngalaba nke 84(12).
Dịka Buhari si kwuo, ngalaba ahụ kụchapụrụ onye ọbụla ji ọkwa na gọọmentị isonye n'ịtụ vootu na ntuliaka imeụlọ nke pati ọ nọ n'ime ya iji hopụta onye ga-anọchi pati ahụ na ntuliaka ọbụla.
Onyeisiala kọwara na ime otu a bụ ịnapụ mmadụ ikike dịịrị ya isonye na ntuliaka dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa si nye onye ọbụla ikike.
Buhari gwara ndị omeiwu ka ha gbanwee ngalaba ahụ.
Ihe mere Buhari ji jụ ibinye aka n'iwu a n'afọ 2021

Ebe foto si, Presidency
Cheta na onyeisiala Buhari ekweghị ebinye aka n'iwu ntuliaka a ahazigharịrị ọhụrụ oge ndị omeiwu buteere ya n'afọ 2021.
N'akwụkwọ ozi o zigaara ndị omeiwu n'ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba 2021, Buhari kwuru na ụfọdụ ihe dị n'iwu ahụ megidere iwu Naịjirịa.
Ihe gbara ọkpụrụkpụ o ji jụ ibinye iwu ahụ aka bụ maka na ndị omeiwu dere na usoro a ga-eji na-eme ntuliaka imeụlọ na pati dị icheiche bụ naanị usoro nke bekee kpọrọ 'direct primaries'.
Onyeisiala kọwara na okwesịghị ka ọ bụrụ iwu na pati niile ga-eso usoro 'direct primary', kama ọ ka mma ka e tinye usoro ndị ọzọ, ka ndị pati dị icheiche were aka ha họrọ nke ga-akara ha mma.
Ihe Buhari jiri jụ ibinye aka na Electoral Bill n'afọ 2018 - Dr Mcginger Ibeneme

Ebe foto si, Getty Images
Chetakwa na n'afọ 2018, Onyeisiala Buhari jụkwara ibinye aka n'iwu nhazigharị ntuliaka, bụ "Electoral Act Amendment Bill 2018", nke gaara ịbụ iwu a gaara iji hazie ntuliaka nke afọ 2019.
Buhari sị na ihe mere ya ejighi binye aka n'iwu a bụ maka na onwere ebe edochaghị ya anya etu ndi omeiwu si dee ya bụ iwu.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na e me iwu a ugbua, na ọ ga-enye nsogbu makana ntuliaka nke 2019 adịla nso, nke mere na onwereike gbagwojuo ndị mmadụ anya.
N'agbanyeghi ihe Buhari kwuru maka ihe mere o ji mee ihe a, ọtụtụ mmadụ sị na ọ bụghị ezi obi ka o ji mee ihe a.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ihe na-eme n'obodo bụ Dọkinta Mcginer Ibeneme gwara BBC na ihe Buhari mere gosiri na ọ chọghị ime ntuliaka nke 2019 etu ziri ezi.
Dọnkinta Ibeneme gakwara n'ihu kwuo na ụdịrị ihe a Buhari na pati ya bụ APC na-eme ugbua bụ ụdịrị ihe PDP mere na ntuliaka nke 2015.
Gee Ibeneme ntị ebe a.
N'otu okwu ahụ, ọnu na-ekwuru APC na Legọs Steeti bụ Joe Igbokwe gwara BBC na obi Buhari dị ọcha mgbe ọ jụrụ ibinye aka n'akwụkwọ iwu a.
Igbokwe sị na onwere ihe Onyeisiala hụrụ n'iwu ahụ mere o jiri sị ka edegharịa ya.
Ọ gakwara n'ihu katọọ PDP, si na ndị mmadụ ekwesighi ige ha ntị.
Lee ihe okwuru.
Akụkọ ka na-abịa.












