Akwụkwọozi nwere "Transmission" akpala ṅdịomeiwu ọchị

ụlọomeiwu

Ebe foto si, @Senatepresident

Nkọwa foto, Ndị ụlọomeiwu na onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim adịghị na mma nke na ha kwuru na ha enweghị ntụkwasa obi n'ime Idris

Akwụkwọozi onyeisiala Muhammadu Buhari degara ndị ụlọomeiwu ukwu Naijiria banyere nhazigharị iwu ka a ga-esi na-eke ọrụngọ gbasara mmanụ dị n'ime okeosimiri na nke dị n'elu ala( Deep Offshore and Inland Basin Production Sharing Contracts Amendment bill) akpalitela ọchị na Sineti n'ihi okwu bekee, "Transmission" nke dị na ya.

Dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na-agụ akwụkwọozi ahụ, ya na ndị otu ya dapụrụ n'ọchị oge ọ gụpụtara "Transmission"Buhari dere akpalitere ọchị n'ụlọmeiwu ukwu.

O were nwa oge tupu Saraki tachie ma gbalikwa ịgụ akwụkwọozi ahụ ọzọ mana mgbaliya mere ka ọchị daa karịa.

Akwụkwọozi ahụ nke isiokwu ya bụ ' Transmission of the Deep and Inland basin Production Sharing Contracts Amendment Bill 20118," bụ iji gwa ụlọomeiwu ka ha lebanye anya n'akwukwọiwu ahụ ma mee ya ka ọ bụrụ iwu.

Cheta na nsonso a, otu ihe nkiri fegharịrị na soshal midia nke na-egosi ebe onyeisi ndị uweojii ala Naijiria bụ Ibrahim Idris na-ata ire ebe ọ na-agụpụta akwukwoozi ebe ọ na na-adọga ịkpọpụta okwu bekee, "Transmission."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: