Akụkọ kachasị n'abali a: Ibrahim Idris akpụpụla Sineti ụlọikpe

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Mgba anyị ga-ama onye ike ga-agwụ

Ibrahim Idris

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na ndị agha enwebeghị ike ịkwusị ogbugbu mmadụ na Benue steeti

Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris a gaala ụlọikpe ị gbochi oku ndị ụlọomeiwu nta bụ sinetị na-akpọ ya.

O kwuru na onyeisiala Naịjirịa jiri aka ya họpụta ya na ndị ga-eso ya mee njem ọrụ na Bauchi mgbe ha na akpọ ya oku a.

N'Afrịka

Ụgbọala ndị kwụ n'ahịrị

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị mba Uganda amaala iwu ga-akwụsị mbubata ụgbọala karịrị afọ iri n'ise n'ochie

Ha na-enwe olileanya na nke a ga-ebelata ọnwụ na-esi na mberede okporo ụzọ ụgbọala ochie na-ebute.

Ụfọdụ mmadụ katọrọ iwu a na-ekwu na ọ ga-ebutere ndị ogbenye ahụhụ

N'akụkọ ofesi

Guiseppe Conte na Sergio Matarella

Ebe foto si, AFP

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na mba Italy a họrọla Guiseppe Conte dịka Praim Minista ha ebe emere emụme ị du ya n'ọkwa ọchịchị taa.

Cheta na kemgbe ọnwa maachị emere ntụliaka, mba Italy enwebeghị ịke ị họpụta onye ga-abụ praim minister ha

N'egwuregwu,

Aha onyonyo, Ihe onyonyo na-egọsị uwe ọhụrụ ndị Sụpa Igụls

"Dịka nwa-afọ Naịjirịa m bụ, ọ bụ iwu dịara m na m gotere uwe a ị ji kwado otu m"

Ihe na ihe ndị ọzọ bụ ihe ndị Naịjirịa na-ekwu ebe ha kwụ na ahịrị kemgbe ụzụ ụtụtụ iji gote uwe asọmpị iko mba ụwa nke Naịjirịa.

Ọ na-ewuewu na ndị mba ụwa niile na-ekwu na uwe Naịjirịa bụ nke kachasị masị ha.