Aisha Buhari: Ugboro ano nwunye onyeisiala tiri mkpu n'ọha

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị mmadụ amarala nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ka onye adịghị atụ okwu ụjọ.

Ya metụ ọrịakụ Buhari n'obi, o kwupụta ya.

Nke na-ewu ugbua bụ okwu o kwuru n' ụbọchị anọ nke ọnwa Decemba 2018 na nzukọ a kpọrọ 'National Women Leadership Summit e mere n'Abuja.

Nwunye onyeisiala sị na agbanyeghị na ọ bụ nde kwuru nde mmadu tụnyere Buhari na ntuliaka nke 2015, ọ bụ naanị mmadụ abụọ maọbụ ji ọgbataụhịe gọọmentị ya.

Okwu ya a nwuru ọkụ na soshal midia.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ụtụtụ mmadụ na-ajụzị ndị bụ ndị a Aisha Buhari kpọrọ aha.

N'ọnwa Ọktoba nke 2017, nwunye onyeisiala bara onyeisi ụlọọgwụ di n'obi onyeisiala bụ Husian Munir mba maka etu ụlọọgwụ ahu dị.

Dịka nke a mere ọhụrụ, ọ bu kwa n'ọha ka Oriakụ Buhari kwuru okwu a.

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Okwu ọzọ Aisha Buhari kwuru dara ụda ọfụma bụ mgbe ya na BBC mere mkparịtaụka n'afọ 2016.

Na ya bụ mkparịtaụka, Aisha kwuru na site otu ihe dị, na ya agaghi ikwado di ya.

Aha nkeananụānụ, "If it continues like this, I'm not going to be part of any [re-election] movement," says Aisha Buhari

Okwu tara akpụ, nke mere Buhari na onwe ya jiri tinye ya ọnụ mge ya na onyeisiala Jamani bụ Angela Merkel nwere nzukọ n'afọ ahụ.

Aha onyonyo, Nigeria President Muhammadu Buhari makes his controversial comments

Mgbe ahu ka Buhari si na nwunye bu onye isi ekwu.

4) Ka APC mechara ntuliaka imeulo ha, Aisha Buhari gara n'akara ya na Twitter ba ezigbote mba maka etu ha bu ntuliaka siri ga.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị mmadụ sị na o bu makana nwanne ya nwoke enweteghị ọkọrọto iji zụọ ọchịchị gọvanọ Adamawa n'okpuru APC.

Nke bụ eziokwu bu na enwebeghi nwunye onyeisiala Naịjirịa na-aputa ekwu okwu banyere ọchịchị di ya n'ọzọ a. Aisha pụrụiche.