PDP Governorship Primaries: Lee ndị ga-eji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ na Naịjirịa

Ndị ji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ n'afọ 2023

Ebe foto si, Other

Pati People Democratic Party (PDP) ga-eme ntuliaka ime ụlọ ịhọpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ na steetị dị iche iche na Wenezde 25 Mee, 2022.

N'Ọwụwa Anyanwụ, Steetị ndị dịka Abia, Enugwu, Ebonyi na-eme nke ha, ebe Anambra na Imo esoghi ugbua maka na ntuliaka gọvanọ agaghị adị na steetị ha n'afọ 2023.

N'Abia

Ọkammụta Uchenna Ikonne ga-eji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ n'Abia Steetị

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

Ọkammụta Eleazar Uchenna Ikonne meriri dịka onye ga-eji aha PDP zọọ ọkwa gọvanọ Abia Steetị n'afọ 2023.

O ji vootu narị anọ, iri isii na asatọ (468) merie mmadụ itoolu ndị ọzọ zọsara ya ọkwa ahụ nke gụnyere Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye dị mbụ sepu aka na ntuliaka ahụ.

Ikonne kwere nkwa ịchị ọchịchị nnabata onye ọbụla ma ọ bụrụ o merie na ntuliaka Gọvanọ n'afọ 2023.

Onye haziri ntuliaka ahụ e mere n'Umuahia bụ Gọvanọ chiburu Ekiti Steetị bụ Ayodele Fayose.

N'Enugwu

Peter Mba

Peter Mba meriri na ntuliaka ime ụlọ iji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu Steetị.

O ji vootu narị asaa iri na itoolu (790) merie ndị dịka Sịnetọ Ike Ekweremadu (onye esoghi mee ntuliaka ahụ), Sịnetọ Gilbert Nnaji na ndị ọzọ.

Tupu ntuliaka aka hụ ebido, ndị dịka Kingsley Ude, Erasmus Anike, Ifeanyi Nwonye, Gilbert Nnaji, Barr Nwabueze Ugwu, Jehu Onyekwere, Gabriel Ajah, Beloved Dan Anike ji aka ha rituo ma sị ka Mba zọwa.

Ebe Sinetọ Ike Ekweremadu dị na mbụ sị ka ọ naghịzi azọ mana ọ kọwaghị ihe mere o jiri mee mkpebi ahụ.

Rivers Steetị

Fubara Siminialayi

Ebe foto si, RSGH

Na Rivers Steetị, onye bụbu onye ngụkọego gọọmentị ha bụ Fubara Siminialayi meriri dịka onye ga-eji aha PDP zọọ ọkwa.

O ji vootu narị asaa iri abụọ na otu (721) merie Isaac Kamalu na George Kelly na-eso ya n'azụ.

Cheta na mbido ọnwa Mee afọ 2022, ụlọọrụ EFCC sị na ha na-achọ Fubara Siminialayi na mmadụ atọ ndị ọzọ achị maka ebubo izu otu ijeri narị naịra na iri asaa (N117bn).

Delta

Sheriff Oborevwori win

Ebe foto si, Other

Sheriff Oborevwori bụ onyeisi ndị omeiwu na Delta Steetị meriri, o ji vootu narị ise na iri itoolu na asaa (597) merie ndị dịka Olorogun David Edevbie na James Manager.

Akwa Ibom

Umo Bassey

Ebe foto si, Other

Ụkọchukwu Umo Bassey bụbu kọmishọna na-ahụ maka ala meriri n'aha PDP.

O ji vootu narị itoolu, iri itoolu na atọ (993) merie mmadụ iri na abụọ zọsara ya ọkwa.

Legos

Olajide Adediran, bụ onye a ma ama maka ọgbakọ ọ na-ahazi a kpọrọ 'Lagos4Lagos Movement' meriri iji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ.

Adediran bụ a na-akpọkwa Jandor, nwetere vootu narị isii na iri asaa na itoolu (679) merie ndị ha na ya so zọọ ọkwa.

Jigawa

Mustafa Lamido bụ nwa Sule Lamido bụbu Gọvanọ Jigawa meriri iji aha PDP zọọ ọkwa Gọvanọ.

Mustafa nwetere vootu narị asatọ na isi abụọ na itoolu (829).

Gombe

Na Gombe steetị, Jibrin Barde meriri na ntuliaka ime ụlọ PDP maka ọkwa gọvanọ.

Barde ji vootu otu narị na iri isii merie mmadụ ise ndị ọzọ.

Nasarawa

Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ

Ebe foto si, Other

David Ombugadu, bụbu onye omeiwu n'ụlọome nta nwetere mmeri ịzọ ọkwa Gọvanọ n'aha PDP.

Ombugadu nwetere vootu narị abụọ na iri anọ na asaa (247) merie Nuhu Angbazo, nwetere vootu 203.

Borno

Mohammed Jajari meriri na ntuliaka ime ụlọ maka ọkwa gọvanọ.

Jajari ji vootu 487 votes merie Mohammed Imam, nwetere vootu 362.

Kaduna

Isah Ashiru meriri na ntuliaka ime ụlọ PDP n'ọkwa gọvanọ.

Ashiru ji aha PDP zọọ ọkwa n'afọ 2019, ji vootu 414 merie na ntuliaka ahụ.

Kwara

Yahman Abdullahi, bụbu onye omeiwu nta meriri iji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ.

Abdullahi nwetere vootu 518 n'ime mmadụ 574 tụrụ vootu.

Plateau

Caleb Mutfwang bụ onye meriri na nke PDP ịzọ ọkwa Gọvanọ.

Mutfwang, bụbu onyeisi okpuruọchịchị Mangu nwetere vootu 252 ma merie mmadụ iri na atọ ndị ọzọ.

Bauchi

Ibrahim Kassim, meriri n'aha PDP maka ọkwa Gọvanọ Bauchi State.

Kassim bụbu odeakwụkwọ gọomentị steetị ahụ nwetere vootu 655.

Sokoto

Sa'idu Umar, bụbu odeakwụkwọ gọomentị Sokoto steeti meriri iji aha PDP azọ ọkwa Gọvanọ na 2023.

Umar meriri na enweghi onye ọbụla mara ya aka n'ihu na ntuliaka ime ụlọ ahụ dịka ndị ọzọ sepuchara aka.

Ihe mere Enyinnaya Abaribe na Ike Ekweremadu ji sepu aka ha n'ịzọ ọkwa Gọvanọ n'aha PDP

Senator Abaribe and Senator Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Senator Abaribe and Senator Ike Ekweremadu

Ụfọdụ ndị a ma ama na pati ahụ chọburu ịzọ ọkwa Gọvanọ pụtara n'ụtụtụ taa ma kwuo na ha agaghịzi esonye na ntuliaka ime ụlọ ahụ.

Ndị a bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchịteanya Abia South nakwa Sịnetọ Ike Ekweremadu na-anọchiteanya Enugu West n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa.

Nkwupụta ha a gbara ọtụtụ ndị mmadụ gharịị maka na ndị a anọteela aka n'ụlọomeiwu ma nwee agba na pati PDP nke steetị ha.

Nke a mere ọtụtụ mmadụ ji na-ajụ 'kedụ ihe mere ndị a ji sepu aka n'ịzọ ọkwa a?'

Gịnị mere ha ji wụsa ọwa?

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, Enyinnaya Abaribe/Facebook

N'ozi Abaribe wepụtara n'ụbọchị Wenezde 25 Mee, nke ọ kpọrọ "Agaghị m esonye na ntuliaka ime ụlọ PDP n'Abia Steeti".

Abaribe sị na ihe bụ isi isekpu ntị mere o jiri sepu aka n'emume ahụ bụ na ndị "Papa Nnukwu" ekweghi inye ndị niile na-azọ ọkwa ohere nhatanha.

Ọ sị nke pati ahụ chọrọ iji naanị mmadụ atọ a kpọrọ 'adhoc delegates' na-abụghị ndị delegates niile kwesịrị isonye na ntuliaka ahụ.

Abaribe sị na ụlọọrụ Inec ekwuola na ha akwadoghi ụdị atụmatụ ntuliaka ime ụlọ ahụ nke pati ya n'Abia chọrọ ime.

N'okwu ya "Mụnwa bụ Sịnetọ Enyinnaya Harcourt Abaribe agaghị esonye n'atụmatụ a."

"Agaghị m esonye na ntuliaka ime ụlọ nke PDP maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Abia Steetị ga-adị na Wenezde 25 Mee, 2022, isonye na ya bụ ịkwado mpụ na nrụrụaka nke ụlọikpe ga-elebeanya na ya."

Abaribe gara n'ihu gwa ndị nkwado ya ka ha dere jụụ na ọ ga-ekpuhe ihe ọzọ ọ ga-eme n'oge na-adịghị anya.

Sịnetọ Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

N'otu aka ahụ Sịnetọ Ike Ekweremadu wepụtara ozi site n'ọnụ Ogbo Asogwa bụ onye na-ahazi achụmnta vootu ya.

N'okwu ya "Nke a bụ ime ka ndị nkwado anyị na Naịjirịa mara na Sịnetọ Ike Ekweremadu agaghị esonye na ntuliaka ime ụlọ nke PDP maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugwu Steetị ga-adị na Wenezde 25 Mee, 2022.

"Anyị na-ekele ndị nkwado anyị nakwa ndị Naịjirịa maka ịdọnyere anyị ukwu ịhụ na e hiwere ụzọ a ga-eji nwete Enugwu ọhụrụ"

"Anyị na-arịọ ka unu dere jụụ na anyị ga-eme ka unu mata mkpebi nakwa atụmatụ ọhụrụ anyị ga-ewepụta."

O nwebeghi onye maara kpọkwem ihe mere Ekweremadu jiri sepu aka ya na ntuliaka ime ụlọ ahụ.