Peter Mba meriri iji aha PDP zọọ ọkwa Gọvanọ Enugwu Steetị

Peter Mbah

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook

Nkọwa foto, Peter Mbah bụ ọkaiwu PDP họpụtara ka o jiri ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa Gọvanọ

Otu Peoples Democratic Party (PDP) nke Enugwu Steetị mere ntuliaka ime ụlọ ịhọpụta onye ga-eji aha ha zọọ ọkwa Gọvanọ Enugwu Steetị.

E mere ntuliaka ahụ n'Okpara Square dị n'Enugwu n'ụbọchị Wenezde 25 Mee, 2022.

Na ngwụcha ntuliaka aka ahụ, a họpụtara Peter Mba dịka onye ga-efe ọkọlọtọ PDP na ntuliaka Gọvanọ n'afọ 2023.

Nke a mere aha nwamadị ji na-ewu ewu dịka ọtụtụ na-ajụ "Kedụ onye bụ Peter Mba?".

Onye ka Peter Mba bụ?

Peter Mba

Peter Mba bụ onye ọkaiwu nwere agba na onye oji ego achụ ego si Owoh dị na Nkanu East nke Enugu steeti.

Ọ bụ ya nwe ụlọọrụ Pinnacle Oil and Gas na-arụkwa ọrụ gbasara idozi ihe n'ọrụ mmanụ agbidi ma bụrụkwa onye nnọchite anya otu ụlọọrụ Fresno dị na Califonia, Amerịka.

O toro n'ọru ya site n'ọkwa nta ruo ebe ọ nọ ugbua dịka onye a ma ama na steeti ya.

Ọrụ obi ebere ọ na-arụrụ ndị mmadụ mere ka ọtụtụ hụ ya n'anya.

Mba bụ onye na-achịkọta ọha, bụrụkwa onye udo mere ọtụtu jikwa hụ ya n'anya.

Ọ bụ onye ma akọwa ọkwụ gbasara ego gụru akwụkwọ na Mahadum East London tupu ọ gaa ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu bụ ebe e siri nabata ya n'ụlọikpe.

N'afọ 2004 ka ọ nwetere asambodo nke masta na ihe gbasara ikpe ọrụ gbasara ụgbọmmiri a kpọrọ (LLM) n'ịchafụ na Legọs steei University.

Ọ bụkwa onyeisi ọtụtụ ụlọọrụ were nwere agba.

Ọ rubuola dịka kọmishọna ọkwụ ego dị n'aka nakwa onye nlekọta ndị ọrụ Bekee bụ Chief of Staff n'Enugu steeti bụ be ọ nọ mụta ọtụtụ ihe gbasara ọchịchị.

O nwetela ọtụtu nturu ugo n'aka ndị Rotary International District 9140, Certified Institute of Public Administration and Management, Newswatch Magazine.