Bola Tinubu: Agụ ‘Bourdillon’ adọriela Osinbajo, Amaechi, Rochas Okorocha na ndị ọzọ

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Bola Ahmed Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ ndị otu patị All Progressive Congress bụ APC n’aha ịchafụ.
O ji vootu 1271 were merie na ya bụ ntuliaka.
Onye na-esota ya n’azụ bụ Rotimi Amechi nwetara vootu 301.
Dịka o siri dị ugbua, ọ bụ Bola Ahmed Tinubu ga-anọchite otu APC na ntuliaka onyeisiala Naijirịa nke a ga-eme n’afọ 2023.
Ọ bụ ya na ndị gụnyere osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo, onye bụbu Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha, Tunde Bakare, Rotimi Amechi na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
APC Primaries 2022: Ngụkọ na-egosi na Bola Tinubu ka enweta vootu ugbua na ntuliaka imeụlọ APC


Dịka ngụkọ ka na-aga n’ihu, onyeisi otu pati All Progressives Congress (APC) na Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka enwete mkpọpụta aha na ndị tụnyere ya vootu.
Vootu Bola Tinubu na-arị elu ugbua ebe aha ndị ọzọ na-eso ya bụ aka chibụrụ Rivas steeti Rotimi Amaechi, na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo.
A na-agụ vootu ndị delegate mmadụ tụrụ 2260 dịka anya ọha na-ele ntuliaka APC bụ pati nọ n’ọchịchị Naịjrịa kemgbe 2015.
A malitere ngụkọ vootu a n’ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Weneze, ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun, 2022.
Ndị 'delegate' si Kaduna steeti bụ ndị ikpeazụ tụrụ vootu nke butere atụmvootu a na-eme na ntuliaka imeụlọ ndị pati APC n'isi njedebe
Lee ọnụ ọgụgụ so ngụkọ vootu ndị pụtara ịzọ ọkwa ugbua
- David Umahi - Vootu 38
- Tunde Bakare – Vootu 0
- Rotimi Amaechi – Vootu 301
- Yemi Osibanjo Vootu 235
- Rochas Okorocha – Vootu 0
- Yahaya Bello - Vootu 47
- Jack Rich – Vootu 0
- Ogbonnaya Onu - Vootu 1
- Ahmed Lawan - Vootu 152
- Ben Ayade - Vootu 37
- Ikeobasi Mokelu - Vootu 0
- Bola Ahmed Tinubu - Vootu 1271
N'ebe elekere iri. e mechara buru akpati e ji tụọ vootu gawa ebe a ga-anọ gụkọọ vootu.
Etu ndị 'delegate' si tụọ vootu gụnyere:
- Mmadụ 81 si Imo steeti tụrụ vootu
- Mmadụ 51 si Yobe steeti tụrụ vootu
- Enugwu, mmadụ 51 tụrụ vootu
- Ekiti, mmadụ 48
- Edo, mmadụ 52
- Taraba, mmadụ 46
- Rivas steeti, mmadụ 69
- Borno steeti, mmadụ 81
- Ondo steeti, mmadụ 51
- Krọs Riva, mmadụ 54
- Ọshụn steeti, mmadụ 90 wdgz
Ndị 'Delegates' APC ka na-atụ vootu na ntuliaka ime ụlọ pati ha

Elekere ise nke isi ụtụtụ Wenezde na-akụ dịka ntuliaka ime ụlọ otu pati APC ka na-aga n’ihu.
Ndị nnọchịteanya ‘delegates’ si Niger steeti, Borno steeti, Cross Riva steeti na Ondo steeti na-ebinye aka ugbua dịka ha na-atụ vootu ha.
Ndị mmadụ ka gbakọ n’ama egwuregwu nke Eagles square dịka a na-eche ka steeti niile tụchaa vootu ha tupu ngụkọ amalite.
Akụkọ ka na-abịa.
Anyị agaghị ekwe ka otu PDP dọhachi anyị azụ - Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị ekwuola na otu pati APC agaghị ekwe ka otu PDP dọhachi Naijirịa azụ.
O kwuru na a ga-enwe onye mmeri ma nwee ndị emeriri emeri kama o si ka mmadụ niile were obinwanne soro ya bụ mpụtara ntuliaka.
Uju Ohanenye, Badaru, Akpabio, Amosun na ndị ọzọ wepụrụ onwe ha iji nye Bola Tinubu ohere imeri

Ebe foto si, Screen Grab
Muhammadu Badaru bụ gọvanọ Jigawa steeti ewepụla onwe ya dịka ndị so azọ ọkwa onye ga-eji okolọtọ APC zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023.
O kwuru na ọ bụ iji nye bọla Tinubu ohere ịzọ ya bụ ọkwa.
Uju Kennedy ohanenye kwuru na ọ na-arịtụ n'ihi na ọ bụ Bola Tinubu ga-arụ ọrụ dịka onyeisiala nke ọma.
Kayode Fayemi wepụkwara onwe ya iji nye Tinubu Ohere imeri ma sị ndị na-akwado ya ka ha tinyere Bola Tinubu.
Godswill Akpabio bụ onye mbụ wepụrụ onwe ya maka Bola Tinubu. O kwuru na ọ bu maka ọdịnma pati APC na Naijirịa ka o jiri mee etu a ma sị ndị na-akwado ya ka ha dọnyere Tinubu ukwu.
Ndị ọzo bụ Ibikunle Amosun onye bụbu gọvanọ Ogun Steeti, onye bụbu onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Dimeji Bankole na omeiwu Ajayi Boroffice.

Ebe foto si, Muhammadu Badaru/Website
Ugbua bụ oge ndị ọwụwa anyanwụ - Ogbonnaya Onụ

Ebe foto si, Ogbonnaya Onu/Facebook
Ogbonnaya Onu kwuru na enweghị onye ọ ga-eji maka ya rituo.
Ma jụọ sị, " Kedụ ebe ikpe ziri ezi nọ ma ọ bụrụ na ọbụghị onye si ọwụwa anyanwụ ga-enweta ohere iji ọkọlọtọ pati a zọọ ọkwa onyeisiala"
Nichola Felix ewepụla onwe ya iji nye Yemi Osibanjo ohere imeri ntuliaka imeụlọ otu APC
Otu onye sọ azọ iji okolọtọ APC zọo ọkwa onyeisiala Naijirịa bụ Nichola Felix ewepụla onwe ya iji nye Yemi Osibanjo ohere iji ọkolọtọ APC zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa.
APC Presidential Primaries: Buhari, Osinbajo, Bola Tinubu na ndị ọzọ bịarala n'ogige ntuliaka imeụlọ APC
Dịka a na-eche ka ebido ntuliaka imeụlọ otu patị APC taa bụ ụbọchị Mọnde, ụbọchị asaa nke ọnwa Juun.
Lee ka ọnọdụ ebe ahụ dị ugbua dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari, osote ya b Yemi Osibanjo, Rotimi Amechi, Bola Tinubu na ndị ọzọ wuchirila n'ogige a.




APC Presidential Primaries: Etu ntuliaka ịhọpụta onye ga-efe ọkọlọtọ ha n'ọkwa Onyeisiala si aga
Taa ka a ga-ama dike ga-efe ọkọlọtọ pati All Progressive Congress (APC) iji zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023
Nke a na-abịa dịka ndị pati a gbakọtarala n'Eagle Square dị n'Abuja ime ntuliaka ime ụlọ a ga-eji họpụta onye ahụ.
Dịka o siri dị, ọ bụ mmadụ iri abụọ na atọ ga-aba n'ọgbọ ịmata onye ga-enwete ọkolọtọ ahụ.

A malitela imere ndị delegates accreditation maka ntuliaka ịhọpụta onye ga-efe ọkọlọtọ ha n'ọkwa Onyeisiala si aga


N'ụbọchị ole na ole ka ọtụtụ ndị Gọvanọ APC si mpaghara Ugwu nwere nkwekọrịta ka a họpụta onye si mpaghara Ndịda.
Ebe kepukepu ọzọ kwuru na onyeisioche APC bụ Abdullahi Adamu họpụtara Ahmed Lawan bụ onyeisi ndịomeiwu dịka onye a kpọrọ 'consensus candidate'

Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari na nzukọ ya na ndị Gọvanọ nwere sị na "O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n'isi".
Ọ sị ka e nye onye ọbụla na-azọ ọkwa ohere ka ndị pati ha nwee ike họpụta onye ha chọrọ.
Dịka ọ dị ugbua mmadụ iri abụọ na atọ ndị na-azọ ọkwa a ga-aba n'ihu ọrụ maka ntuliaka a.

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Oleekwanu ndị nnukwu mmanwụ obi kara ga-apụta zọọ ọkwa onyeisiala n'aha APC?

Ebe foto si, Ahmed Lawan/Twitter
Ahmad Lawan
- Ahmad Ibrahim Lawan bụ onyeisi ụlọ omeiwu Naịjirịa .
- Ọ malịtere ịchị n’ọkwa ahụ n’ọnwa Juun, 2019.
- Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye ọkamụta.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum nke Maiduguri ebe ọ natara ọzụzụ na ngalaba Geography
- Tupu ọ banye ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ kuziburu nkuzi na mahadum Maiduguri
- Ọ na-anọchịteanya mpaghara Yobe North n’ụlọ omeiwu Naịjirịa n’okpuru pati All Progressives Congress.
- A mụrụ ya n’ụbọchị 12 nke ọnwa Jenụwarị, 1959 dịka ọ dị afọ 63 ugbua

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter
Bola Tinubu
- Ọ bụ onye ngụkọ ego ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
- Tinubu bụ aka chibụru Legọs steeti dịka gọvanọ bido n’afọ 1999 ruo afọ 2007.
- Ọ dị afọ 70 dịka a mụrụ ya n’ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị, 1952 n’Osun Steeti.
- Ọ bụ onyeisi otu pati All Progressives Congress na Naịjirịa kembe 2013.
- Nne ya bụ Abibatu Mogaji nke bụ onyeisi ahịa a ma ama.
- Ọ natara ọzụzụ na ngalaba ngụkọ ego na mahadum Richard J. Daley College nke Chicago, nakwa mahadum Chicago State.
- Ọ malitere ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 2012 n’okpuru pati Social Democratic Party.
- O so na ndị hibere pati National Democratic Coalition bụ pati gbara mbọ ịhụ Moshood Abiola nwetere ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 1993.
- O so na ndị nwere agba gbakọtara hibe pati All Progressives Congress (APC) bụ nke chụpụrụ pati People's Democratic Party (PDP) n’ọkwa ọchịchị n’afọ 2015

Ebe foto si, Rotimi Amechi/Twitter
Chibuike Rotimi Amaechi bụbu minista njem Naịjirịa ma bụrukwa aka chịbụrụ Rịvas steeti.
- A mụrụya n'obodo Ubima dị n'okpuruọchịchị Ikwere dị na Rịvas steeti n'ụbọchị 27 nke ọnwa Mee, 1965.
- Nna ya onye larala mmụọ bụ Fidelis Amaechi ebe nne ya bụ Mary Amaechi.
- Ọ gụrụ akwụkwọ Prịamarị ya n'ụlọakwụkwọ St. Theresa site n'afọ 1970 ruo afọ 1976.
- Ọ gụchara akwụkwọ Sekọndịrị ya n'afọ 1982 n'ụlọakwụkwọ Government Secondary School Okolobiri.
- Ọ natara ọzụzụ na ngalaba ihe gbasara asụsụ Beekee na mahadum Port Harcourt bido n'afọ 1983 ruo afọ 1987.
- Na mahadum ahụ ka mmasị ya n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nọ malite dịka o so otu ndị ndọrọndọrọ nke ụmụakwụkwọ mahadum ma mecha bụrụ onyeisi otu na-ahụ maka ụmụakwụkwọ mahadum na steeti ahụ bụ National Union of Rivers State Students.
- Mgbe o fechara ala nna ya site n'atụmatụ National Youth Service n'afọ 1988, o malitere ịrụ ọrụ na amo Clinics and Hospital Ltd bụ ụlọọrụ aka chịbụru Rịvas steeti bụ Peter Odili.
- N'ụlọọrụ ahụ, ọrụrụ ọrụ dịka onye na-ahụ maka mgbasa ozi tupu ọ banye ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị nke gọọmentị dịka onye odeakwụkwọ otu National Republican Convention nke okpuruọchịchị Ikwere dị na Rịvas steeti.


Ebe foto si, Yemi/Twitter
Yemi Osinbajo
- Yemi Osinbajo bụ Osote Onyeisiala Naịjirịa.
- Ọ malịtere ọchịchị n’ọkwa n’afọ 2015.
- Ezigbo aha ya bụ Oluyemi Oluleke Osinbajo.
- A mụrụ ya n'ụbọchị 8 nke ọnwa Maachị afọ 1957 n'ime ezinaụlọ Opeoluwa na Olubisi Osinbajo.
- Ọ bụ onye Legọs Steetị.
- Ọ bụ onye ọkaiwu ma rụọ ọrụ dịka ọkaikpe gọọmentị Legọs Steetị site n'afọ 1999 ruo 2007.
- Ọ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Pati All Progressive Congress ma bụrụ osote onyeisiala Naịjirịa kamgbe afọ 2015 rute ugbua.
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Dolapo Osinbajo n'afọ 1989 ha mụtara ụmụ ebe otu n'ime ha bụ Fiyinfunoluwa Osinbajo.

Ebe foto si, Tunde Bakare/Twitter
Tunde Bakare
- Ezi aha ya bụ Babatunde Gbolahan Bakare, ọ bụ onye Abeokuta dị n'Ogun Steetị, a mụrụ ya n'afọ 1954.
- Ọ hụrụ akwụkwọ na Grammar School dị n'Abeokuta, mahadum Legọs Steetị.
- Ọ bụ onye ọkaiwu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa ụkọchukwu.
- Ọ zọrọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari zọrọ ọkwa n'afọ 2011 mana ha dara.
- Ọ rụrụ ọrụ ụkọchukwu n'ụlọụka Deeper Life, Redeemed tupu o mepee nke ya.
- Ọ bụ onyeisi ụka The Citadel Global Community Church.
- O nwere mgbe a nwuchiri ya n'ọnwa Maachị afọ 2022 mgbe o gbasara ozi ma katọọ onyeisiala Naịjirịa nọ mgbe ahụ bụ Olussegun Obasanjo.
End of Akụkọ ndị ọzọ banyere Ntuliaka ime ụlọ APC

Anayo Rochas Okorocha
- Anayo Rochas Okorocha dị afọ 60 dịka a mụrụ ya n’ụbọchị 22 nke ọnwa Sepụtemba 1962
- Ọ bụ onye Ogboko, Ideato South nke Imo steeti
- O gụrụ akwụkwọ na mahadum Jos ebe ọ natara ọzụzụ na ngalaba Public Administration
- Ọ lụọla nwuye ma jide ụmụ isii (ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwaanyị atọ)
- Ọ bụ onye na-arụ ọrụ inyere ndị mmadụ aka site n’ụlọọrụ Rochas Foundation Inc ma bụrụkwa onyeisi ụlọorụ Rochas Group of Companies Limited.
- N'Afọ 2011, Anayo Rochas Okorocha si otu pati PDP were banye otu All Progressive Grand Alliance (APGA) were zọọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti e kwesịrị ime n'afọ 2011.
- N'ọnwa Disemba afọ 2010 ndị APGA machiri ya maka ha sị na ọ kpara akwa na-abụghị maka ọdịmma patị ha.
- N'ọnwa Maachị afọ 2013 ka Rochas na ndị ọzọ wepụtara otu patị App Progressive Congress.
- N'ọnwa Maachị afọ 2019, otu APC machịrị Rochas maka ịkpa agwa ha sị na omegidere ọdịmma Patị ha.
- Okorocha ṅụrụ iyi ọrụ dịka onye ome iwu na-anọchite anya Imo-west n'ụlọ omeiwu n'ọnwa Jun afọ 2019.

Ebe foto si, David Nweze Umahi/Facebook
David Nweze Umahi
- E ji Dave Nweze Umahi mara ya.
- Ọ gbara afọ 58 dịka a mụrụ ya n’ụbọchị 25 nke ọnwa Jụlaị n’afọ 1964.
- Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchị ma bụrụkwa gọvanọ Ebonyi steeti kemgbe afọ 2015 ruo ugbua.
- Ọ bụ onye Uburu dị n’okpuruọchịchị Ohaozara nke Ebonyi steeti.
- Ọ natara ọzụzụ na ngalaba Civil Engineering na mahadum Enugu State University of Science and Technology
- Ọ malitere ọrụ dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 2007 mgbe ọ malitere ịrụ dịka onyeisi oche otu pati PDP n’Ebonyi steeti
- Ọ mechara bụrụ osote gọvanọ steeti ahụ n’okpuru gọvanọ Martin Elechi n’afọ 2011.
- Ọ malitere ịchị Ebonyi steeti dịka gọvanọ n’afọ 2015 ruo ugbua.
- N’ọnwa Maachị 2022, n’ihi na Dave Umahi si pati PDP bụ ebe ọ nọ nwete mmeri na ntuliaka wụba APC, ụfọdụ ndị pati PDP na steeti ahụ wegara ụlọikpe ukwu dị n’Abuja mkpesa ka a chụtuo Umahi n’ọkwa dịka gọvanọ.
- Ụlọikpe natara mkpesa a ma nye iwu ka a chụtuo ya mana Umahi mechara nwete mmeri n’ụlọikpe mkpeghara nke Enugu ma nọsike dịka Gọvanọ n’ọnwa Eprel, 2022

Ebe foto si, Kayode Fayemi/Facebook
Kayode Fayemi
- Ezi aha ya bụ John Olukayode Fayemi.
- Ọ gbara afọ 57 dịka a mụrụ ya n’ụbọchị itolu n’ọnwa Febụwarị, 1965 .
- Ọ malitere ịchị dịka gọvanọ Ekiki steeti n’afọ 2018 ruo ugbua .
- Ọ bụ onyeisi otu gọvanọ ndị Naịjirịa kemgbe afọ 2018.
- Ọ bụbu Minista na-ahụ maka mepụta ihe ọ natara chi na Naịjirịa n’afọ 2015.
- Ọ natara ọzụzụ na ngalaba ‘History, Politics and International Relations’ na mahadum nke Ibadan nakwa ọzụzụ n’ihe gbasara agha na mahadum King's College nke Lọndọn.











