APC Governorship Primaries: Lee ndị ga-eji ọkọlọtọ APC azọ gọvanọ na Naịjirịa

Ebe foto si, Emenike, Nwifuru, Nnaji and Sanwolu
Otu All Progressive Congress (APC) emeela ntuliaka imeụlọ iji họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ na Steetị dị iche iche na Naịjirịa.
E mere ntuliaka ahụ na steetị dị iche iche n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Mee afọ 2022.
Ntuliaka a jupụtara ndị n'ọchị na ndị n'akwa dịka e nweela ndị nwerela mmeri n'ụfọdụ steetị.
Lee ndị nwere mmeri na steetị ndị a.
Abia

Ebe foto si, Ikechi Emenike
Ikechi Emenike meriri dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ọkwa Gọvanọ.
Emenike ji vootu narị isii iri asaa na abụọ merie na ntuliaka ahụ.
Cheta na Alex Otti sepuru aka ya n'ịzọ ọkwa ahụ ma bo ebubo na nrụrụaka aka abatala na ntuliaka ahụ.
Dịka ntuliaka ahụ na-aga n'ihu ndị dịka Paul Ikonne, Uche Ogah wuchiri ebe ahụ ma mee ngagharịiwe sị na ebe ahụ abụghị ebe e kwesịrị ime ntuliaka a.
Mana ndị ọrụ nchekwa weere ọnọdụ iji hụ na udo chịrị.
Ebonyi

Ebe foto si, Ebonyi Online
Francis Ogbonnaya Nwifuru meriri dịka onye ga-eji aha APC azọ ọkwa Gọvanọ n'Ebonyi Steetị n'otu ngalabe ebe e mere ntuliaka a.
Nwifuru ji vootu narị asaa iri anọ na atọ (743) merie ndị zọsara ya ọkwa.

Ebe foto si, Elias Mbam
N'otu aka ahụ otu mpaghara APC n'Ebonyi haziri ntuliaka nke ha n'ebe ọzọ ebe Elias Mbam ji vootu narị asaa iri anọ na otu (741) merie n'ebe nke ya.
Enugwu

Ebe foto si, Uchenna Nnaji
Uchenna Nnaji meriri dịka onye ga-eji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'afọ 2023.
Nnaji bụ naanị onye zọrọ ọkwa ahụ nwetere vootu otu puku na iri asaa (1070).
Legọs
Onye na-achị ugbua bụ Babajide Sanwo-Olu bụ onye ji ọkọlọtọ ahụ maka na ọ chọrọ ịga nke ugboro abụọ ya.
Naanị ya pụtara maka ịzọ ya bụ ọkwa, nke mere na ọ bụ ya ji vootu niile a tụrụ.
Sanwo-Olu ekeleela ndị niile tụụrụ ya vootu nakwa ndị isi pati ya maka inye ya ohere nke abụọ ya.
Gombe
Gọvanọ steeti ahụ bụ Muhammadu Inuwa Yahaya bụkwa onye meriri iji ọkọlọtọ APC gaara ha ihu ọgụ na 2023.
Ọ kwa naanị ya pụtara ịzọ ya bụ ọkwa na steeti ahụ na APC.
Ọ nweghị onye ụjọ kwere maa ya aka mgba.
Nasarawa
Ọ bụkwa gọvanọ steeti ahụ bụ Engr. AA Sule bụ onye bu ya bụ ọkọlọtọ ga-agara APC ihuagha.
O ji vootu 735 meirie Fatima Abdullahi bụ nwnye mbụ onyeisioche pati APC bụ Abdullahi Adamu.
Ndị deligati niile dị 147 si okpuruọchịchị iri na atọ (13) niile nke steeti ahụ tugbadooro Sule vootu ka ọ pụta gaara ha ọzọ.
Borno
Gọvanọ steeti ahụ bụ Ọkammụta Babagana Zulum bụ onye chịkọọrọ vootu niile atụrụ ebe ahụ.
O ji vootu niile dị 1411.
Ogun
N'Ogun, Dapo Abiodun bụ gọvanọ steeti ahụ ji vootu 1168 merie mmadụ ise ndị ọzọ zọsara ya ya bụ ọkwa.
Ndị ọzọ ha na ya gbara ya bụ mgba gụnyere Abdulkabir Adekunle Akinlade, Biyi Otegbeye, Modele Sarafa-Yusuf, Owodunni Opayemi nakwa Remi Bakare.
Abiodun ji vootu dị 1168 n'ime 1170 merie ndị ọzọ.
Vootụ abụọ lara n'iyi ebe ahụ.
Delta
Na Delta steeti, Ovie Omo-Agege ji vootu 1190 merie ndị ha na ya zọrọ ya bụ ọkwa.
Omo-Agege bụ Osote onyeisi Sineti na Naịjirịa ma bụrụkwa onye nnọchite anya Delta Central Senatorial District.
Zamfara
Bello Matawalle bụ gọvanọ steeti ahụ ka jisikwa ya bụ ọkọlọtọ ike maka ịzọ ya bụ ọkwa gọvanọ nke ugboro abụọ ya.
Rivers
Tonye Cole bụ onye meriri ya bụ ntuliaka imeụlọ ịzọ ọkwa gọvanọ nke steeti Rivers.
O ji vootu 986 merie ndị ọzọ.
Lee ka ha siri kee ya bụ vootụ na River steeti: Michael West 43, Tonye Cole Patrick 986, Bernard Mikko 2, Magnus Abe 1, Sokonte Davies 49, Ojukaye 190.










