O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n'isi - Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmad Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola gbowam na o nweghi onye ọbụla o tere mmanụ n’isi dịka onye ga-anọchite anya n’ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
O kwuru nke a mgbe ya na ndị gọvanọ pati ya bụ APC nwere ọgbakọ n’ehihie Mọnde n’Abuja ma sị na e kwesịrị ịkwanyere pai ha ugwu.
Ọ sị “O nweghi onye ọbụla m tere mmanụ n’isi n’ime ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha APC, e nweghi onye nke kacha amasị m, o nweghi onye m na-amagide ka a họpụta ya.
Buhari gwara sị na obi dị ya ọcha banyere nke ahụ ma gwa ndị Gọvanọ APC ka ha mee etu ahụ.
“A họpụtara unu dịka e ji họpụta m, hapụ nụ ka ndị pati mee ntuliaka ma họpụta onye ha chọrọ, O nweghi onye ga-ete onye ọbụla mmanụ”.
Nke a na-abịa dịka Gọvanọ ndị si mpaghara Ugwu kpebiri ma kwechiri na e si na mpaghara Ndịda họpụta onye ga-azọ ọkwa a.
Ha rịọkwara Onyeisiala mgbaghara maka etu akwụkwọ nkwekọrịta ha jiri gbaa n’anwụ.
Ihe ndị a na-atụ anya ga-eme na ntuliaka ime ụlọ APC taa

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị nkwado otu pati All Progressives Congress (APC), ndị ntaakụkọ na ndị ọzọ ọrụ banyere ntuliaka dịịrị na-agbakọta n'ama sara mbara nke Eagles Square, Abuja maka ntuliaka ime ụlọ otu pati ahụ.
APC hibere ntuliaka ime ụlọ ha taa bụ Mọnde ụbọchị isii nke ọnwa Juun, 2022, a na-atụ anya na ya bụ ntuliaka ga-amalite n'ebe mgbede.
Cheta na pati ehigharịala ntuliaka aka ugboro ugboro tupu ụlọọrụ Inec ehibe izu mbụ n'ọnwa Juun ka ọ bụrụ ohere ikpeazụ ha.
Iji kwado onwe ha, ndị isi otu patị APC banyere nzukọ imeụlọ iji hazie ihe olemaole na ya bụ oru ndọrọndorọ ọchichi n'ụbọchị ụka.
Dịka o siri dị, ndị ntaakụkọ na ọtụtụ ndị nchekwa juputara ebe ahụ n'ụbọchị Sọnde iji chekwaa ma gbaa aka ebe ihe na-eme ebe ahụ.
Ndị gọvanọ APC niile sonyekwara ya bụ nzukọ, a na-atụanya na ha ga-ehiwe nzukọ dị iche iche maka nghopụta ime ụlo pati ha na-akwado.
Akụkọ ka na-abịa

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ihe ise a na-atụ anya ya na ntuliaka ime ụlọ APC
Ọtụtụ ndị Naịjiria eburula oche nọrọ ala na-eche dịka ndị pati All Progressives Congress (APC) na-akwado ime ntuliaka ime ụlọ nke ha ga-eji họpụta onye ga-efe ọkọlọtọ ha dịka onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023.
Dịka APC si kwuo, ya bụ ntuliaka ga-eme n'Abuja, isiobodo Naịjiria, site n'ụbọchị isii ruo asatọ nke ọnwa Juun afọ 2022.
Dịka a na-akwado ya bụ emume, ụfọdụ na-atụ anya ụfọdụ ihe ndị pụtara okwu n'ime isu a, na-agba anya ka tọọchị ịmata ihe ga-eme na ya bụ ọgbakọ - ọkachasị etu a Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị na-azọ ọkwa ka ha gbaa izu n'ime onwe ha ma họpụta onye kpọrọ akpọ, kajara akaja ga-abụ onye ga-efere ha ọkọlọtọ pati ahụ na ya bụ ntuliaka.

Lee ihe ndị a na-atụ anya ga-eme na ntuliaka ime ụlọ APC:

1) Atụmvootu iji mara onye ga-efe ọkọlọtọ APC:
Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ iri abụọ kwụrụ nde otu narị naịra (N100m) iji zụta akwụkwọ mmasị iso zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru APC, mana ọ bụ naanị otu onye ka isi ya ga-apụta mgbe a ga-apịachi ntuliaka a.
Ndị nnọchiteanya a họpụtara na steeti niile dị na Naịjiria (Bekee kpọrọ delegates) ga-atụrụ mmadụ 23 ahụ (bụ ndị otu nnyocha APC nyochara) vootu iji mara onye vootu ya ga-akarịcha.
Ha niile ga-achị obi ha n'aka, mana ọ bụ naanị onye vootu ya kacha nnukwu ga-abụ onye ga-azọnwu ọkwa onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023, n'okpuru pati APC.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
2) Nchọpụta ma ọchịchị ọ ga-eru onye Ndịda aka na pati ahụ:
N'akwụkwọ ozi ndị gọvanọ ndị Ugwu nọ na pati APC binyere aka nso nso a, ha kwuru na ha na-akwado atụmatụ onye si Ndịda Naịjiria ịchị Naịjiria n'afọ 2023.
Ndị gọvanọ ahụ dị mmadụ 11 kwuru na ha agwala ndị Ugwu niile na-azo ọkwa ahụ ka ha gbalịa wụsa ọwa ngwa ngwa.
Ha kwuru na ọ bụ n'ihi na onye si mpaghara Ugwu (Onyeisiala Muhammadu Buhari) achịala afọ asatọ, mere ha ji kwere na ọ ga-adị mma ka ndị Ndịda chịa.
Mana nke a ọ ga-abịa na mmezu? Echi ka anyị ga-amata.
3) A chụpụrụ ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa n'ezie?
Akụkọ pụtara dịka kepukepu n'izu a na ụfọdụ ndị agaghị esonyezi na ntuliaka ime ụlọ APC dịka nnyocha e mere ha gosiri na ha etozughi.
Kepu kepu ahụ kwuru na ọ bụ John Odigie-Oyegun - bụ onyeisi otu nnyocha ndị na-azọ ọkwa n'APC - gwara ndị ntaakụkọ na o sila na 23 budata ọnụọgụgụ ndị ga-eso azọ ọkwa onyeisiala ruo 13.
Mana nke a o mere eme ka ọ bụ akụkọ ụgha?
N'ụbọchị ntuliaka imeụlọ kpọmkwem ka ndị na-eche ga-amata n'ihi na ndị Igbo na-ekwu na ekwe kụọ, ama agbaa.
4) Naanị otu nwaanyị so azọ ọkwa onyeisiala n'APC

Ebe foto si, Uju Ken-Ohanenye Facebook
N'ime aha mmadụ 23 kwupụtara mmasị ha iso zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru APC, naanị otu mkpụrụ nwaanyị so ya; aha ya bụ Uju Ken-Ohanenye - onye Awka, n'Anambra steeti.
Dịka o si akpọ onwe ya, Uju bụ onye ọkaiwu kwuru na ọ bụ "mmanya ọhụrụ nọ n'ime karama ọhụrụ".
5) Onye kacha pee mpe n'afọ na ndị so azọ ọkwa a?

Ebe foto si, Miracle Center International
N'ime mmadụ 23 a so azọ ọkwa a, Felix Nicholas bụ ụkọchukwu ụlọụka Miracle Center International na mba Amerịka, bụ onye kacha pee mpe n'afọ.
Nicholas dị afọ iri anọ (40), zọburu ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 n'okpuru Peoples Coalition Party (PCP).
Ndị ọzọ dị ebe afọ site 40 ruo 73 (Ken Nnamani na Robert Ajayi Boroffice bụ ndị nke dị afọ 73).
Ewezuga ihe ise a, kedụ ihe ndị ọzọ ị na-atụ anya ya na ntuliaka imeụlọ APC ga-eme?









