Ihe mwakpo mere Peter Obi na Edo steeti

Aha onyonyo, Ihe mwakpo mere Peter Obi na Edo steeti
Ihe mwakpo mere Peter Obi na Edo steeti
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
Lee Ihe mere Peter Obi na ndị otu ya mgbe ha gara Edo steeti
Nkọwa foto, Lee Ihe mere Peter Obi na ndị otu ya mgbe ha gara Edo steeti

Peter Obi onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 gbanahụrụ ọnwụ n'ụbọchị Tuezde abalị iri abụọ na anọ ọnwa Febụwarị afọ 2026, na Edo steeti ebe ha na ndị otu ya gara ị nabata Olumide Akpata na pati African Democratic Congress nke bụ pati ọhụrụ Peter Obi sonyere.

Cheta na Olumide Akpata ji Labour Pati zọọ ọkwa gọvanọ na Edo steeti afọ 2024 tupu ọ banye ADC.

Ndị ojiegbe ana amaghị ndị ha bụ wakporo Peter Obi na ndị ọzọ ha na ya so dịka ha si na ụlọọrụ pati ADC ebe ha gara me emume nnabata Akpata na-aga ebe obibi onye ndu pati ADC na Edo steeti bụ John Odigie-Oyegun.

Ọtụtụ ndị mmadụ akatọla mwakpo a dịka e nwere ndị boro ebubo n'aka gọọmenti Edo steeti so n'ihe mere mana gọọmenti Edo sị n'aka ha na aka gọọmenti etiti adighị ya n'ime.

Cheta n'afọ 2025 Peter Obi chọrọ ị ga njem nleta n'Edo steeti mana gọvanọ steeti ahụ bụ Monday Okpebholo yiri ya egwu na nchekwa ya anọghị ya n'aka ma ọ bụrụ na ọgwaghị ya tupu ọ bịa.

N'aka nke ọzọ, mgbe Peter Obi chọburu I ga Benue steeti maka njem nleta enyemaka n'afọ 2025, gọvanọ steeti ahụ bụ Hyacinth Alia dọrọ Obi aka na ntị ka ya ghara ị bịa ma ọ bụrụ na ọgwaghị ya.

Monday Okpebholo na Hyacinth Alia bu gọvanọ abụọ gbarụrụ ihu maka ọbịbịa Peter Obi na steeti ha.