Ebe dị icheiche ndị mmadụ na-arụ Inec aka na ntuliaka 2023

Ndị ọrụ Inec
Nkọwa foto, Ndị mmadụ pụtara ịtụaka n'ụbọchị 25 Febụwarị 2023 ntuliaka

Ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa abịala ma gaa, ụlọọrụ haziri ya bụ ntuliaka, bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) akpọpụtakwala Bola Ahmed Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ ga-anọchi Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ụbọchị 29 nke ọnwe Mee 2023.

Mana site n'ụbọchị e mere ntuliaka rue mgbe amalitere ngụkọ vootu, ruo ugbua, ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwuputa ebe dị icheiche ha sị na ndị orụ Inec riri mperi nke ukwuu n'ụbọchị ntuliaka.

Ụfọdụ kwuru na emeghị ntuliaka na mpaghara ha, ebe ndị ọzọ kpesara na ndị ọrụ Inec enweghi akụrụngwa ntuliaka, nakwa akụrụngwa ezughi oke.

N'ebe ndị ọzọ, ọ bụ ndị obodo ahụ ji aka ha ga bute ndị Inec bata be ha ịhụ na ntuliaka gara n'ihu.

BBC Igbo nyochara mmehie ndị a nakwa akaebe ndị so ya pụta ihe were dekọọ ya n'akụkọ a, lee ka o si kwụrụ.

Ndị mmadụ kwụ na-eche Inec n'Isuofia dị n'Anambra steeti

Ebe foto si, Munonyeyi Ezeabasili

Nkọwa foto, Ndị na-eche ka ndịọrụ Inec bịarute ebe ha ga-anọ tụọ vootu, n'Isuofia, Anambra steeti

Ebidoghi ntuliaka n'oge

Ndị mmadụ na-eche ka ndị Inec bịarute ebe ha ga-anọ tụọ vootu n'Isuofia, Abia Steeti

Ebe foto si, Muononenyi/Twitter

N'ihe ndị mmadụ bu n'obi karịa n'ebe Inec nọ bụ na ha abịaghị n'oge.

Ụfọdụ ndị mmadụ gara na soshal midia ịgosi iwe ha na Inec eruteghi n'ọgbọ ntụliaka ha n'oge.

Cheta na onyeisi ngalaba Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde 24 Febụwarị na ntuliaka ga-amalite ebe elekere 8:30 nke ụtụtụ ma bịa na njedebe ebe elekere 2:30 nke ehihie.

N'ebe akpọrọ Amuvi Arochukwu n'Abia steeti, ọ bụ na mgbede ka ndị Inec ji rute n'obodo ha ma malite ntuliaka.

Ndị bi na mpaghara Amuwo Odofin, Ọkọta gwara BBC na ọ bụ ebe elekere asaa n'abali ka ha bidoro ntuliaka.

Etu a ka ọ dịkwa ebe dịgasi icheiche na Naịjirịa.

Ụfọdụ si na ha malitere tụwa vootu n'elekere 9 n'abalị.

Ebe ndị Inec abịaghị chaachaa

N'ime obdodo Ahiazu Mbaise ebe ndị obodo na-eche ka ndị Inec bịa meere ha ntuliaka

Ebe foto si, Umuodu Amuzi Ahiazu Mbaise

Nkọwa foto, N'ime obdodo Ahiazu Mbaise ebe ndị obodo na-eche ka ndị Inec bịa meere ha ntuliaka

O nwere ụfọdụ ime obodo gwara BBC na emeghị ntuliaka chaachaa na mpaghara ha n'ihi na ndịọrụ Inec abịahị abịa.

Ebe ndị dịka Ahiazu Mbaise, Ọsụ, Ọlụ na Oru West dị n'Imo steeti.

Ndị obodo ndị ahụ gwara BBC na ndị Inec bịara mana ha ewetaghị akụwkọ e ji atụrụ Onyeisiala nakwa ngwaọrụ ha ndị ọzọ.

Mgbe BBC kpọrọ ndị Inec ha asị na ha ma maka obodo ndị ahụ mana ha ga-emecha tụọ vootu ha n'ụbọchị 26 Febụwarị.

Mana o nweghị onye hụrụ ndị Inec n'ụbọchị Sọnde dịka ha kwere na nkwa.

Ụfọdụ obodo ndi a kwuru na dịka nke a mechara, ụfọdụ hụrụ mpụtara ntuliaka a kpọrọ maka mpaghara ha n'isiụlọọrụ Inec n'Abuja.

Ụfọdụ n'ime ha malitere ịme ngagharị iwe maka nke a.

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe

Ndị Ọsụ, Ọlụ na Oru West mere ngagharịiwe n'ụlọọrụ Inec n'Imo steeti n'ụbọchị Tuzde maka na ha kwuru na o nweghi ntuliaka mere na mpaghara ha mana ha nwere mpụtara n'aka ndị Inec.

Ha kwuru na ọ gbagwojuru ha anya etu ha siri nwee mpụtara mana ha emeghi ntuliaka ọbụla.

E nweghi akwụkwọ (result sheet) e ji ede mpụtara ntuliaka

Ebe ndị mmadụ gbakọrọ ịtụ vootu

Ebe foto si, Mr Macaroni/Twitter

N'ụbọchị ahụ kwa, akụkọ ọzọ na-apụta n'ụfọdụ ebe bụ na ndị ọrụ Inec bịara ọrụ enweghi akwụkwọ a kpọro 'result sheet' e ji edepụta mpụtara ntuliaka ma mdo ya n'ahụ aja n'ebe a nọrọ tụọ vootu.

N'otu ọgbọ ntuliaka dị n'Ikoyi Legọs ebe onye ntaakụko BBC gara, onye ọrụ Inec kwuru na ha ejighi ya bụ akwụkwọ bịa maka na enyeghi ha ya.

Okwu ọzọ selitere isi n'ebe ahụ bụ na mpụtara ntuliaka nke ọkwa onyeisiala enweghi ike banye n'ikuku dịka e si ezipu ndị ọzọ.

Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ihe ahụ mere kwuru sị "anyị nọ ebe ahụ site n'elekere 3 nke ehihie mgbe a tụchara vootu gafee elekere 6 nke mgbede ebe ndị ọrụ Inec na-anwa izipu ya bụ mpụtara gaa n'ọbaozi Inec, mana ọ gaghị" ka o kwuru.

Ọ sịkwa na ha zipuru mpụtara ntuliaka nke ndị ụlọmeiwu ukwu nakwa nke ndị ụlomeiwu nta ọ gaa siriri werere.

Ịtụfee vootu n'oke

Ngụkọ mpụtara ntuliaka Naịjirịa

N'ụbọchị Monde mgbe ngalaba Inec PDP, Action Alliance, ADC, Labour Party na ndị ọzọ agbajọọla mpụtara ntuliaka sị Ekiti steeti.

Iwe ha bụ na atụfere vootu oke nke pụtara 'over voting' na Bekee.

Dịka onyeisi Inec na steeti ahụ si kwuputa, ọ bụ APC meriri n'Ekiti.

Ọnụọgụgụ kacha nta kamgbe 1999

Ngụkọ Inec maka ndị niile pụtara mee ntuliaka 2023

Ebe foto si, Inec

Nkọwa foto, Ngụkọ Inec maka ndị niile pụtara mee ntuliaka 2023

Ngụkọ Inec gosiri na ọnụọgụgụ ndị pụtara ịtụ vootu na ntuliaka 2023 bụ nke kacha nta kamgbe 1999.

Dịka ha si kwuo, vootu niile a tụrụ bụ 24, 965, 218.

Mana ihe BBC hụrụ na mpaghara dị icheiche eyighị afọ 2019 mgbe ọdọ ntuliaka tọgbọrọ chakoo, ebe ndị ọrụ Inec chegidere ndị mmadụ.

Ndị ọzọ a maama dịka Ngozi Okonjo-Iweala, hụkwara ya bụ ihe kọwara ọnụọgụgụ etu a:

Etu ndị mmadụ jiri pụta n'anya m n'iso mee ntuliaka 2023
Nkọwa foto, Etu ndị mmadụ jiri pụta n'anya m n'iso mee ntuliaka 2023
Ndị pụtara n'Okpara Square n'Enugwu ịtụ vootu
Nkọwa foto, Ndị pụtara n'Okpara Square n'Enugwu ịtụ vootu
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post