Mụ na Tinubu enweghi nsogbu ọbụla mere m ji akwado Peter Obi - Ayo Adebanjo

Aha onyonyo, 2023 Election: O nweghi ihe ọjọọ m nwere megide Tinubu kama... - Pa Ayo Adebanjo
Mụ na Tinubu enweghi nsogbu ọbụla mere m ji akwado Peter Obi - Ayo Adebanjo

Pa Ayo Adebanjo bụ onyeisi otu ndị Yoruba a kpọrọ Afenifere ekwuola na nkwado ọ na-enye ndị Igbo na ntuliaka afọ 2023 abụghị ka o megide Tinubu.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị ala ha na-akatọ ya maka ịhapụ Tinubu bụ onye Yoruba ibe ya ma na-akwado Peter Obi.

N'okwu ya "O nweghi esemokwu ọbụla mụ na Tinubu nwere, onye m mere Gọvanọ Legọs Steeti.

"Ntuliaka afọ 2023 abụghị maka agbụrụ kama ọ bụ maka ileban anya na nsogbu dị n'obodo.

"Otu Afenifere ekwuola ebe ha kwụụ na ntuliaka na-abịa ma kọwaa ihe mere ha jiri kwụrụ na ya, ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọbụla mma, ha leba anya n'ihe bụ isiokwu".

Bola Tinubu na Ayo Adebanjo

Ebe foto si, TInubu/BBC

Adebanjo gara n'ihu kwuo na ndị Yoruba enweela ohere ịchị Naịjirịa dịka onyeisiala site n'aka Olusegun Obasanjo, chịa dịka osote onyeisiala site n'aka Yemi Osinbajo.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Ugwu achịala ugboro abụọ site n'aka Umaru Musa Yaradua nakwa Muhammadu Buhari ebe ndị mpaghara mba mmiri (South South) achịala site n'aka Goodluck Jonathan.

Mana ugbua na ọ bụ ohere ndị Igbo ịchị ma ọ bụrụ na a chọrọ ọdị mma na ịdị n'otu Naịjirịa.

Mana Gọvanọ Ondo Steetị bụ Rotimi Akeredolu sị na otu Afenifere anaghị ekwuru ndị Yoruba n'ihe banyere ntuliaka afọ 2023.

Kirie ihe o kwuru n'uju;