2023 Campaign kickoff: Lee ndị niile na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa

Ebe foto si, OTHER
Taa bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba 2022 ka ịchụnta vote ga-amalite n'uju na Naịjirịa maka ntuliaka afọ 2023.
Ịchụnta votu a ga na-aga n'ihu ruo ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị, nke na-esote ụbọchị ntuliaka kpọmkwem bụ Febrụwarị 25.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na asatọ bụ ndị ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa iji nọchie anya Muhammadu buhari, onye ọchịchị ya ga-akụrụ ọnụ n'ụbọchị 29 nke Mee 2022.
Lee ndị niile ga-eso zọọ ọkwa nakwa atụmatụ ịchụnta vootu ha:
Bola Ahmed Tinubu – All Progressives Congress (APC)

Ebe foto si, Babajide SanwoOlu/Twitter
Bola Ahmed Tinubu, dị afọ iri asaa, bụbu Gọvanọ legọs steeti site na 1999 ruo 2007.
Ọ meriri ọkwa sineti iji nọchite anya mpaghara Legọs West n'afọ 1993, mana onyeisiala oge ahụ bụ Sani Abacha kagburu ya bụ ntuliaka.
Tinubu so na ndị gbara mbọ ka ọchịchị laghachite n'aka ndị nkịtị, ọgụ a mere ka ọ gbaa ọsọ ndụ pụọ na Naịjirịa na 1994, ma mechaa lọghachi oge Abacha nwụchara na 1998.
Nkwa o kwere na ọ ga-eme ma ọ banye ọchịchị bụ iburu ọrụ ọma onyeisiala Buhari rụrụ gaa n'ihu.
Onye bụ osote Tinubu na ntuliaka a bụ Kashim Shettima, bụbu gọvanọ Borno Steeti.
Atiku Abubakar - Peoples Democratic Party (PDP)

Ebe foto si, Reuters
Atiku amalitela ịchụnta vootu ya dịka o wepụtara akwụkwọ atọ o dere iji kwuo ihe ọ ga-eme ma ọ banye n'ọchịchị.
O wepụtara akwụkwọ atọ a n'emume ịchụnta vootu o mere n'Abụja taa bụ Sepụtemba 28.
Atiku rụrụ ọrụ dịka osote onyeisiala Naịjirịa malite na 1999 ruo 2007.
Atiku azọọla ọkwa onyeisiala, ugboro ise: 1993, 2007, 2011, 2015, na 2019; nke a ọ na-azọ ugbua bụ nke isii.
Otu ọkpụrụkpụ ihe Atikwu kwere nkwa ọ ga-eme ma ọ banye n'ọchịchị bụ ịhazigharị ọchịchị Naịjirịa, nke bekee kpọrọ 'restructuring'.
Onye bụ osote Atiku na ntuliaka a bụ Ifeanyi Okowa, bụ gọvanọ Delta Steeti ugbua.
Obi Peter Gregory – Labour Party (LP)

Ebe foto si, Cosmos Nayaba
Peter Obi bụ Gọvanọ Anambra steeti malite na 2007 ruo 2014.
Ọ bụ nnukwu onye ọchụnta ego a ma ama, ma rụkwaa ọrụ dịka onyeis ụlọọrụ dị icheiche.
Obi banyeburu pati PDP oge ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ, mana o mechara pụọ banye 'All Progressives Grand Alliance' (APGA) ebe ọ nọ merie ọchịchị gọvanọ.
O mechara laghachi na PDP, ma zọọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa na 2019.
Na Mee 2022, Obi pụkwara ọzọ na PDP banye Labour Pati ebe ọ nọ merie ntuliaka imeụlọ ịzọ ọkwa onyeisiala.
Obi na-ekwe nkwa na ọ ga-eme ka Naịjirịa bụrụ mba na-arụpụta ihe nke ọtụtụ mba ụwa ga na-azụrụ, ọ kachasị ịkọpụta ihe oriri.
Onye ya na Peter Obi na-azọ ọkwa a bụ Yusuf Datti, onye ọchụnta ego a makwa ama, ma bụrụkwa onye nwe ụlọakwụkwọ mahadum Baze University.
Musa Rabiu Kwankwaso – New Nigeria Peoples Party (NNPP)

Kwankwaso bụbu gọvanọ Kano steeti na mpaghara Ugwu Naịjirịa ruo afọ itoolu.
Ọ rụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta nchekwa, nakwa dịka onye omeiwu Sịnetọ
Ọ zọkwaala ọkwa onyeisiala Naịjirịa ugboro abụ, na 2015 nakwa 2019. 2023 ga-abụ nke atọ ọ na-azọ ọkwa a.
Kwankwaso nwere otu ndị nkwado ya a na-akpọ Kwankwasiya, nke bụ otu a ma ama nke ukwu na mpaghara Ugwu, ọ kachasị na Kano steeti.
Onye ya na ya so azọ ọkwa a bụ Isaac Idahosa, onye bụ nwa otu nnukwu ụkọchukwu a ma ama bụ Benson Idahosa larala mmụọ.
Sowore Omoyele – African Action Congress (AAC)

Ebe foto si, Sowore
Sowore bụ onye a ma ama na Naịjirịa maka ịgba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ.
Ọ bụkwa ya nwe ụlọọrụ ntaakụkọ a ma ama bụ Sahara Reporters, ma bụrụkwa onye hibere otu a kpọrọ 'Revolution Now'.
Oge ọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum legọs, Sowore bụ onyeisi otu ụmụakwụkwọ a kpọrọ 'Student Union Government' malite na 1992 ruo 1994.
O so na ndị lụrụ ọgụ ka ọchịchị laghachi n'aka ndị nkịtị na Naịjirịa, oge ndị agha kagburu ntuliaka nke 1993.
Nwa amadị a dị afọ 51 azọbuola ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019.
N'ọnwa Ọgọst afọ ahụ, ndị nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS nwụchiri Sowore ma bo ya ebubo na ọ chọrọ ịkwatụ ọchịchị Naịjirịa n'ihi na ọ dara ada na ntuliaka.
Onye ya na Sowore na-azọ ọchịchị ugbua bụ ọkaiwu Haruna Garba Magashi
Kachikwu Dumebi – African Democratic Congress (ADC)

Ebe foto si, Dumebi Kachikwu
Dumebi Kachikwu bụkwa onye ọchụnta ego a ma ama.
O meriri Kingsley Moghalu, bụbu osote Gọvanọ ụlọakụ etiti Naịjirịa, iji bụrụ onye ga-eji ọkọlọtọ ADC zọọ ọkwa onyeisiala na 2022.
Kachikwu kwuru na ya ga-ekpochapụ na nsogbu ndị na-eyi ndụ egwu.
Sani Yabagi Yusuf – Action Democratic Party (ADP)

Ebe foto si, Yusuf Yabagi
Sani Yabagi Yusuf bụkwa ya bụ onyeisi oche otu ADP.
Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, Yabagi rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ 'Nigerian National Petroleum Corporation.
Ọ zọbuola ọkwa onyeisiala na 2019, mana tupu oge a, ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ Niger Steeti n'otu 'All Peoples Party (APP) na 1999.
Onye ya na Sani Yabagi so azọ ọkwa a bụ ụkọchukwu Okey Udo.
Imumolen Christopher – Accord Party (AP)

Ebe foto si, Imumolen Christopher
Imumolen so nd ndị afọ ha kachasị nta n'ime ndị niile na-azọ ọkwa onyeisiala na 2023; ọ dị naanị afọ 39.
Nwaamadị a bụ ọkammụta na ngalaba mmụta Engineering.
Ọ bụkwa ya hibere ụlọọrụ a na-akpọ 'Joint Professional Training and Support International Limited (JPTS)', ndị ọrụ ha bụ ịzụpụta ndị ọkachamara na ngalaba Engineering.
Onye ga-abụ osote ya na ndọrọndọrọ a bụ Mazi Bello Bala Maru, onye rụburu ọrụ dịka ode akwụkwọ Zamfara steeti.
Al-Mustapha Hamza – Action Alliance (AA)

Ebe foto si, Hamza Al-Mustapha
Al-Mustapha dị afọ iri isii na abụọ jibu ọkwa 'Major' n'otu ndị agha Naịjirịa.
Ọ bụ ya bụ onyeisi ndị nchekwa aka chịburu Naịjiria n'oge ndị agha bụ Sani Abacha.
Oge ọ bụ onye agha, Al-Mustapha gara ọrụ na mba dị icheiche dịka Chad, Liberia, Gambia na Sierra Leone.
Oge Al-Mustapha na-arụrụ Abacha ọrụ, a ma ya dịka onye agha dị ike, nke na ọtụtụ ndị ka ya n'ọkwa na-akwanyere ya ugwu.
E boro ya ebubo ọtụtụ ihe ọjọọ dị icheiche, nke gụnyere ogbugbu Kudirat Abiola, bụ nwunye Moshood Abiola.
Almustapha nọrọ na mkpọrọ ruo afọ 2013 oge ụlọikpe tọhapụrụ ya.
Onye ya na Al-Mustapha so azọ ọkwa a bụ Emmanuel Chukwuka.
Umeadi Peter Nnanna – All Progressives Grand Alliance (APGA)

Ebe foto si, Peter Umeadi
Umeadi bụ ọkaikpe a ma ama, onye rụburu ọrụ dịka ọkaikpe kachasị nke Anambra steeti.
Ọ sị na ihe ọ ga-eme ma o merie ọchịchị bụ ime ka iwu na ikpe ziri ezi kwụdosie ike na Naịjirịa.
Ọkammụta Umeadi gụrụ akwụkwọ na Mahadu Naịjirịa dị na Nsukka. Ọ dị afọ iri isii na asaa.
Osote ya bụ Mohammed Abdullahi Koli dị afọ 65.
Nnamdi Charles Osita – Action Peoples Party (APP)
Adenuga Sunday Oluwafemi – Boot Party (BP)
Osakwe Felix Johnson – National Rescue Movement (NRM)
Abiola Latifu Kolawole – Peoples Redemption Party (PRP)
Adebayo Adewole Ebenezer – Social Democratic Party (SDP)
Ado-Ibrahim Abdumalik – Young Progressives Party (YPP)
Nwanyanwu Daniel Daberechukwu – Zenith Labour Party (ZLP)








