Igbo President: E kwuwe 'competence' ndị Igbo ga-ebu ndi Ugwu ụzọ nọgide n'ọkwa onyeisiala - Ayo Adebanjo
Ayo Adebanjo bụ onye ndu otu na-ekwuru ndị Ọdịda Anyanwu Naijiria a kpọrọ Afenifere akpoola oku ka e nye ndị Ọwụwa Anyanwụ ohere iwepụta onyeisiala ga-achị Naijiria n'afọ 2023.
"ọ sịrị "A gaghị enwelata udo rue oge rue oge oke ndị ọwụwa anyanwu ga-eru ha."
Adebanjo, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, o kọwara na ọ bụ oke ruru Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị Yoroba na ndị Ugwu werela oke ha.
O kwuru na ọ bụrụ na bụrụ na ha enyeghị ndị Ọwụwa Anyanwụ ohere, na o nwere ike ibute nkewa Naijiria.
O kwuru na mkpu tigbuo zọgbu a na-eti ugbua na Ọwụwa Anyanwu ugbua bụ n'ihi na a na-akpapụ ndị Igbo.
Adebanjo bụ otu okenye Yoroba a ma maka n'ikwuru ndị enweghị ndị na-ekwuru ha, kwuru na ndị mpaghara Yoroba pụtara ugbua ịzọ dịka Tinubu, Osinbajo, Fayemi.
Onye ọkaiwu, Adebanjo kwuru na nsogbu Naijiria gbadaro ụkwụ n'iwu ala Naijiria bụ nke o kwuru na bụ ndị agha chịkọtara ya, na akpọghị ụmụ Naijiria oku bịa tinye ọnụ n'ide ya. na onye so otu Nadeco lụọ ọgụ June June 12,
Ọ gara n'ihu katọọ ọnọdụ nchekwa ugbua Onyeisiala Buhari nọ n'ọkwa ọchịchị.
Ma kpọ ndị ntorobịa oku ka ha hapụ oke ọchịchị ma gba mbọ etu ha esi napụta ụmụụmụ ha n'aka ọchịchị nchịgbu.
Onye bụ Ayo Adebanjo?

Onye Ijebu-Ogbo dị n'Ogun steeti, Ayo Adedebanjo bụ onye ndu otu Afenifere, otu na-ekwuru ndị Yoroba.
Ọ bụ ọkaiwu mna onye ndọrọndọrọ ọchịchị aka ochie na Naijiria dịka o so na ndị nsonso Nnamdi Azikiwe nakwa Obafemi Awolowo, onye ndu ndị Yoroba a mara ama lara mmụọ.
Ọ rụrụ ọrụ ntaakụkọ tupu ọ gụọ maka ịbụ onyeọkaiwu na mba Briten.
Ọ bụ onye kwenyere na mpaghara ọbụla ịnọọ nna-eri nke ha kpatara bụ nke Bekee kpọrọ 'restructuring' maọbụ 'true federalism.'
Ọ bụ onye a ma ama dịka onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye nakwa o onye otu Nadeco.
Ihe anyị ga-eme ma a hapụ inye Ọwụwa Anyanwụ Onyeisiala na 2023- Ndị ntorobịa Ohaneze
Ndị ntorọbịa Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha na-ele anya ịmata ma ndị agbụrụ ndị ọzọ aga eso kwado inye ohere ka onye Igbo rịgoro ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 iji mara ụkwụ ha ga-azọpụ.
Onye na-arụ dịka onye ndu otu Ntorobia Ohaneze Bekee kpọrọ "Ohaneze Youth" bụ FCC Jones Onwuasoanya gwara BBC Igbo nke a ụbọchị Fraide n'ọsịsa okwu nke onye ndu otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo.
Na nsonso a, Adebanjo, onye kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo na ọ bụ ndị Owụwa Anyanwụ ka oke iwepụta onyeisiala Naijiria na 2023 boro ndị ntorobia ebubo ịnọ na mmiri ncha ana-aba Igbo anya n'ihi oke akpịrị.
N'ọsịsa ya,Onwuasoanya kwuru na "Ihe Adebanjo kwuru abụchaghị asị" kama o kwuru na ọ bụ nkịtị ka ndị ntorobia na-agba iji mata maoke Ọwụwa Anyanwụ aga-erute ha.
E meghị otu ahụ, na ndị ntorobia Igbo ga-agwa Naijiria ihe ọkụ ji ntị oke eme.
"Anyị na-elegodi anya mara ma ndị anyị na ha so nwere Naijiria aga eme ihe ha kwesịrị ime site na inye onye Igbo si Ọwụwa Anyanwụ Ọchịchị na 2023."
"Mana ọ bụrụ na nke ahụ emeghị, agaghị m anọ kwuo si na anyị ga-aga n'ihu na-edowe iwu,na-achọ udo."
"Ekwechaghị m na anyị dọọrọ ka iyi kama m ga-asị na anyị na-ekpe udo,."
" Kama tigbuo-zọgbuo, anyị na-agba mbọ ịrịọ ndị anyị na ha na-eme ihe."
"E mechaa 2023, ọ bụrụ na onye Igbo enwetaghị ọchịchị, anyị agaghị ekwe nkwa na anyị ga-aga n'ihu na-edowe Iwu Naijiria."
O kwuru na kemgbe ndị ntorobia na-achọ nnwereonwe na-akpa aghara ugbua n'Owuwa Anyanwu na ọ bụ ndị ntorobia anya dị mma na-ejilata ha ka ha hapụ ime ihe ha chọrọ.
Mana e nyeghị Igbo oke ha na 2023, na ha ga-ahapụ ndị ahụ ka ha mee ihe masịrị ha.
Kirie ajụjụọnụ a nke Uche Akolisa gbara n'uju n'elu: