Owerri Bole enyela m ọrụ ma nyekwa ndị ntoroọbịa karịrị 30 ọrụ - Adaeze Uwakwe
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Nnachi Orji
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Adaugo Uwakwe akọwaala etu o siri malite ụlọnri a kpọrọ 'Owerri Bole' n'isi obodo Imo Steeti.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC News Igbo nwere, Adaeze Uwakwe kpughere na ọ bụ di ya kpalitere mmụọ ya ịmalite ụlọnri ahụ oge ọ dị ime ada ya nwaanyị n'afọ 2021.
"Di m hụrụ ogede 'bole' n'anya nke ukwuu. Ọ bụ n'azụ ụlọ anyị ka anyị malitere ụlọ nri a, ma na-ere ya n'ịntaneetị iji hụ na ndị bi gburugburu Owere nwetere onwe ha".
"Tupu o ruo afọ isii, ụlọnri anyị amụbaa, nke na anyị apụghịkwa ịnọ n'ụlọ eme ya ọzọ. Ọ bụ ya mere anyị jiri chọọ obere ụlọahịa ebe anyị ga-anọ na-ere ahịa anyị. Ndị na-azụ anyị ahịa nwere nnukwu ịhụnaanya na 'bole' anyị na-ere n'Owere, nke mere ha jiri malite inye mkpesa ka anyị chọta ebe ha ga-anọsa ahụ ka ikuku kusa ha dịka ha na-eri 'bole'.
"N'afọ 2024, anyị chọtara ebe buturu ibu karịa ebe anyị nọbu na mbụ ma gbakwunye nri ndị ọzọ n'ihe ndị anyị na-esi, mana oge anyị malitere, ọ bụ naanị 'bole', azụ, anụ ọkụkọ, anụ torotoro na ngwọngwọ ka anyị na-esi."
Adaugo Uwakwe kwuru na nne ya bụ onye na-esi nri ọdinaala, dịka o si n'aka ya ka mụta ọtụtụ nri ọ na-esi.
O kwuru na ndị Owere nabara ihe ọ na-eme nke ọma, ma jiri obi ha niile na-azụ ya ahịa.
"N'ụbọchị mbụ anyị gbasara ozi maka ihe anyị na-eme na Facebook nakwa Instagram, ha jiri obi ha nabata ya. Ha nwere ọnụnụọkụ n'obi ịchọpụta ndị a na-eme 'bole' n'Owere. Ọ bụ ọnụnụọkụ n'obi ahụ mere ha jiri were ọsọ zụọ anyị ahịa ma hụkwa nri anyị n'anya, bịa bụrụzie ndị na-azụ anyị ahịa oge niile."
Nwaada Ukwakwe kọwara na ụlọnri Owerri Bole enyela ya ọrụ ma nyekwa ọtụtụ ndị ọzọ ọrụ.
"Kemgbe anyị malitere n'afọ 2021, anyị ewerela mmadụ karịrị 30 n'ọrụ. Ka ọ dị ugbua, anyị nwere ndị ọrụ 15 anyị na-akwụ ụgwọọnwa. E wezuga nke a, anyị nwekwara ngalaba ọzọ, ndị ọrụ ha bụ ịga n'ime obodo dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma na-ekesa nri anyị."
Ihe ndị ụlọnri Owerri na-ere gụnyere ogede, nkwọbi, ụkwa, abacha, agwa a gwọrọ agwọ, ogede a gwọrọ agwọ, isi ewu, osikapa ọdịnaala nakwa nri ọdịnala ndị ọzọ.
Nwaada Uwakwe kọwara na dịka ụzọ ha si akwụghachi obodo ụgwọ, o nwere ụfọdụ ezinaụlọ ndị ha na-akwụ ụgwọ site n'ụlọnri Owerri Bole.
O kwuru na o nwekwara ụmụnwaanyị ajadu Owere Bole na-enye nkwado site n'ịkwụrụ ụmụ ha ụgwọ akwụkwọ.
Ọ gbara ụmụagbọghọ ibe ya ume ka ha ghara ilekwasị anya n'ihe ndị ha na-ahụ na soshal midịa n'ihi na ọ bụghị ha niile bụ eziokwu.
"Soshal midịa emebiela ọtụtụ ihe. Ihe ndị mmadụ na-ahụ n'ịntaneetị na-eme ka ha na-eche ihe ndị na-abaghị uru, na-amaghị na soshal midịa abụghị ihe mere eme. Biko, ihe ọbụla ị na-eme, ọ bụ imepụta achịcha, maọbụ ịkwa akwa, maọbụ isi nri, mee ya nke ọma."



