'Etu anyị si buru asụsụ Igbo gaa mahadum Oxford' - Nwelue na Umenyirioha

Aha onyonyo, Etu anyị si buru asụsụ Igbo gaa mahadum Oxford - Nwelue na Umenyirioha

Onyeka Nwelue na Ikechukwu Umeonyirioha ekwuola na ebumnuche ha bụ ime ka ndị ọcha mụta etu e si asụ Igbo, ọ bụ nke a mere ha ji malite atụmatụ ịkụzi asụsụ Igbo na Mahadu Oxford, na mba United Kingdom.

Ha kwuru nke a na mkparịtaụka ha na BBC Igbo nwere n’ụbọchị Satọde, Febrụwarị 19, 2022.

Aha mmadụ abụọ a wuru ewu n’akwụkwọ akụkọ niile na Naịjirịa dịka ike a ha kpara pụtara ihe.

Onyeka Nwelue, onye bụkwa odeakwụkwọ, kwuru na ọ bụ ya hibere ngalaba a kpọrọ james Curreh Society, na Mahadum Oxford.

“Otu a bụ iji kwalite agụmagụ nakwa ndị odeakwụkwọ si mpaghara Afrịka,” Nwelue kwuru.

“James Currey n’onwe ya bụ onye ya na Chinua Achebe hibere atụmatụ ‘African Writers Series’ n’afọ 1962.”

“Iji cheta nwoke a nakwa mbọ ọ gbara ịkwalite ndị ode akwụkwọ Afrịka, anyị hibere otu a n’aha ya.”

“Ọ bụ n’ime otu a ka anyị ji ewepụta atụmatụ dị icheiche maka nkwalite asụsụ Igbo na asụsụ Afrịka ndị ọzọ.”

“Ihe anyị bu n’obi bụ ka ndị ọcha mụta ma na-asụ Igbo, dịka anyị onwe anyị si mụta ma na-asụkwa bekee.”

N’aka nke ya, Ikechukwu Umeonyirioha kwuru na ya gụrụ asụsụ Igbo na Mahadu Nnamdi Azikiwe dị n’Ọka, Anambra steeti.

O mechara gafee mba Chaịna, ebe ọ nọ na-amụta asụsụ Chaịna ma na-akụzikwara ha Igbo.

“Oge m nọ na mahadum, ọ dịghịrị m mfe ịgwa ndị mmadụ na m na-agụ Igbo, maka ha ga na-akparị ma na-achị m ọchị,” Umeonyirioha kwuru.

“Mana o kwesịghị ịdị otu a, asụsụ anyị kwesịrị ịbụ ihe anyị ji eme ọnụ. Taa, ọ na-agụ ndị ọcha agụụ ịmụta asụsụ Igbo.”

“Mụ onwe m na-asụ asụsụ Chaịna nke ọma, na-ede ya ede, jirikwa ya na-akụzi ihe.”

Engligbo abụghị ihe ọjọọ, e kwesịrị ịkwado ya

Umenyirioha kọwara na ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ na-asụ Igbo ma na-etinyetụkwa ya obere bekee.

“Engligbo abụghị ihe ọjọọ,” o kwuru. “Ọ dịghị mma ịchị onye na-amụta Igbo obere obere ọchị.”

N’otu aka ahụ kwa, Onyeka Nwelue kwuru na ya onwe ya etinyela ụfọdụ mkpụrụokwu ‘Engligbo’ n’ime akwụkwọ o bipụtara.

“N’akwụkwọ m bụ ‘The Abyssinian Boy’, etinyere m okwu a bụ “nwayọly” n’ime ya.”

“Ọ bụrụ na nke a dabaa, otu ụbọchị, ị ga-ahụ okwu ahụ abanye n’ọba okwu bekee, ọ bụ etu a ka asụsụ si eto eto.”

Ọ dị mkpa ka ọmụmụ asụsụ Igbo na-abawanye

Ikechukwu Umenyirioha kwuru na ọ dị mkpa ka e nwee otu na-akwalite ọmụmụ asụsụ Igbo, dịka otu a kpọrọ ‘Society for Promotion of Igbo Language and Culture’ (SPILC) n’oge gara aga.

Ugbua, otu SPILC anwụọla, mana Umeonyirioha rịọrọ ndị ọkammụta n’asụsụ Igbo ka ha tutekwa ya bụ otu n’ọnwụ.

“Ọ bụrụ na anyị akwadoghị asụsụ anyị ma wulite ya, onye ga-emere anyị ya”? ka ọ jụrụ.

Ikechukwu Umeonyirioha bụ onye nkuzi na mahadum Oxford na-agbasi mbọ ike ịhụ na asụsụ Igbo kwụ chịm na mba ụwa
Nkọwa foto, Ikechukwu Umeonyirioha bụ onye nkuzi na mahadum Oxford na-agbasi mbọ ike ịhụ na asụsụ Igbo kwụ chịm na mba ụwa

Nkwalite asụsụ Igbo abụghị ịkwado Biafra

Onyeka Nwelue na Ikechukwu Umeonyirioha kọwakwara na mbọ ha na-agba ịkwalite asụsụ Igbo, abụghị nkwado maka nnwereonwe Biafra.

Ha kwuru na ha ahụla etu ụfọdụ mmadị si eji akụkọ maka nkuzi asụsụ Igbo na Mahadum Oxford na-ekwu na nnwereonwe Biafra eruwela nso, "mana o nweghị ihe ọbụla gbasara ihe anyị na-eme na Biafra".

"Ọrụ anyị na James Currey Society gụnyekwara ịkwalite asụsụ Afrịka dị icheiche, ọ bụghị naanị Igbo," ha kwuru.