International Literacy Day: Asụsụ Igbo na-eme ka ụmụaka ghọta 'Maths' ọfụma

Aha onyonyo, Nwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ

Taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Sepụtemba bụ ụbọchị eji echeta agụmaakwụkwọ kwa afọ iji chetara ndị mmadụ uru ọ bara ị gụ akwụkwọ.

Ọ bụ ngalaba akpọrọ 'United Nations Educational ,Scientific and Cultural Organisation' kewapụtara ụbọchị a ka otu dị iche iche lebaanya na nsogbu a na-enwekarị n'ihe gbasara agụmakwụkwọ.

Isiokwu nke afọ a bụ agụmakwụkwọ n'asụsụ dị iche iche.

Ihe nkiri ọzọ ga-amasị gị:

Mgbakọ na mwepụ a na-ara gị ahụ? Kirie ka nwaanyị a si eji asụsụ Igbo akụziri ya ụmụaka a.

Cynthia Adaeze Chinule kwuru na ọ chọpụtara na ụmụaka o ji asụsụ Igbo akụzirị mgbakọ na mwepụ na-aghọta ya karịa mgbe e ji asụsụ Bekee kuziere ha.

Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke,Uche Akaolisa

Akụkọ ndị ga-amasị gị: