Igbo Language: Maka ndị sị na o nweghị ebe e ji asụsụ Igbo eje, leekwa ihe ndị mere ya asụsụ e ji eje mba

Ebe foto si, @m.aexpressions
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
N'afọ 2006, ngalaba otu 'United Nations' na-ahụ maka omenala na sayensị bụ 'United Nations Educational, Cultural and Scientific Organization' (UNESCO) buru amụma na "ọkara asụsụ a na-asụ n'ụwa ga-efu na ngwụcha afọ otu narị na-abịa abịa".
Asụsụ Igbo so na asụsụ ndị Unesco kwuru ga-ada mmiri n'oge na-adịghị anya dịka ha mara amụma na ọ ga-efu n'afọ 2025.
Otu 'Linguistic Society of America' kọwara 'asụsụ na-efu efu' (endangered language) dịka 'asụsụ nwere ike ikpochapụ na nsonso".
Ndị ọkachamara kwuru na ya bụ amụma nwere ike imezu n'ihi etu ndị igbo, ma okenye ma ụmụaka, si asọ ịsụ igbo maọbụ ide ya ede asọ, ebe ọtụtụ na-agwakọ ya na Bekee.
Amalinze Azi bụ onye nwere ụlọọrụ na-ahụ maka nkwalite asụsụ Igbo kwuru na "ọ bụrụ na ndị okenye agbalịsịghị ike. Ọdịda asụsụ Igbo ga-esi n'aka ndị okenye".
Amalinze kwuru sị: "Igbo enweghịkwa ndị okenye na-asụ Igbo akụghị mmiri dịka Nnamdi Azikiwe, Emeka Ojukwu na Alex Ekwueme."
Otu onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ Adaobi Tricia Nwaubani gwaburu BBC na "nne na nna m machiri ịsụ Igbo n'ụlọ anyị oge m dị obere".
Nwaubani, onye Ụmụahịa kọwakwara na nne na nna ya na-asụkwa naanị Bekee n'ụlọ ha, na-agbanyeghị na ha ji asụsụ Igbo too.

Mana ndị ọzọ na-ekwu na ọdịda asụsụ Igbo si n'aka ma ndị na-eto eto, ụfọdụ n'ime ha e jighị ya kpọrọ ihe.
Lee ụfọdụ ihe nka asụsụ na ide Igbo nwere ike i mere gị:
1. Igbo ka e ji ama Igbo

Ọkụkọ hapụ kwọm ọ ga-eji gịnị azụ ụmụ? Anapụ ogoli ihe o ji ama mma, mma ya arụọ.
Amalize kọwara na ọ bụ asụsụ bụ isi a hụrụ kwawa okpu n'okwu agbụrụ onye bụ.
"Asụsụ mere anyị Igbo. O bụrụ na enweghị asụsụ Igbo, o nweghị ihe dịka ndị Igbo," Amalinze kwuru.
"Asụsụ bụ isi omenala. Ndị Igbo amaghị asụ ịgbo nọ ka ndị nọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ."
2. Igbo bụ igodo e ji agbape ụzọ zoro ezo

Ilu Igbo sịrị na anya ka okenye ji agwa nwata ma ihe okwu. Ilu na okwu ka Igbo ji akụziri nwata ụzọ.
Ọ na-ata arụ na ntị iji asụsụ ọzọ akọwara nwa afọ Igbo ilu Igbo n'ihi na Igbo sị na "onye a tụọrọ ilu kọwaara ya, mara na ego e jiri lụọ nne ya lara n'iyi".
Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị asụsụ nwere ike ịkọwali nghọta dị n'ilu na okwwu Igbo n'ụzọ o zzuru oke ma rijuo afọ.
Ọzọ, onye Igbo nwere ike ịnọ n'etiti igwe mmadụ ya na nwanne ya agba nwanne ya izu nke ntị ọzọ agahị anụ maọbụ ghọta.
Amalinze sị na "ị ma asụ ma na-ede Igbo ga-eme ka gị na ndị be ụnụ na-akparịta, onye mba ọzọ agaghị anụ ihe ụnụ na-ekwu".
Mana ọ bụghị naanị nwafọ na nwa afọ iji ya gbaa izu bụ uru dị ya, asụsụ Igbo bụ okwu Igbo ji anabata ndị tozuru etozu n'otu nwere ogogo n'ala Igbo.
Otu ndị a gụnyere otu mmanwụ, otu ọgbọ, nze na ọzọ.
Ya bụkwa ihe e ji atọpe ihe omimi dị iche e ji Igbo zochie n'otu ndị a.
3. Igbo ga-enyeli gị ọrụ nwere agba

Maka ndị na-ajụ ebe e ji asụsụ Igbo eje, Ị matara n'ụfọdụ ụlọọrụ nwere agba n'ụwa dịka Google nakwa BBC nwere ọrụ bụ naanị ndị ma asụ nakwa ede Igbo nke ọma ka edobeere ya?
E nwekwara ọtụtụ ndị ọkammụta Naijiria nọ ala Bekee ndị ọ bụ nka na itinye uchu na nkwalite asụsụ Igbo mere ha ihe ha bụ taa.
Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere bụ onye gụrụ Igbo na mahadum kọwara, "Mgbe m na-agụ akwụkwọ, ụfọdụ na-ajụ anyị ihe e ji Igbo eme? Ufọdụ sị na ọ bụ ka ewere nara asambodo mahadum. O nweghị onye chere na BBC ga-emebe BBC Igbo"
"Ugbua ụwa niile na-achọ Igbo. Mgbe a na-ewe n'ọrụ na BBC, Igbo, a jụrụ m ma ama maka asụsụ Igbo. "















