Ụlọikpe Kachasị agbatiala oge mgbanwe ego ochie rue Disemba 31

Ego Naira ọhụrụ

Ebe foto si, CBN

Ụlọikpe Kachasị agbatịala ohere e nweere maka iji ego naira ochie azụ ahịa rue abalị 31 nke ọnwa Disemba afọ 2023.

Gọvanọ steeti atọ gụnyere Yahaya Bello nke Kogi na Nasir El-Rufai nke Kaduna kpụpụrụ Gọọmentị Naịjirịa nakwa ụlọakụ etiti ụlọikpe rịọ ka ụlọikpe manye ụlọakụ etiti ka ha gbatịa ohere ndị mmadụ nwere iweghachi ego oche ha ji.

Ego ochie

Ebe foto si, Getty Images

Na mkpebi onyere n'ehihie ụbọchị Fraide, Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Emmanuel Agim, nyere ntuziaka ka a ka nwere ochie N200,500 na N1000 azụ ahịa rue abalị 31 nke ọnwa Disemba,afọ 2023.

Ọkaikpe ahụ kwukwara na ọjụjụ onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ irube isi na mkpebi o nyeburu ka e nwere ego ochie eme ihe ganye ma e kpebie ikpe ahụ bụ, "ngosi ọdịda ọchịchị onyekwuoucheya."

Ọ gara n'ihu kwuo na Onyeisiala Buhari enweghị ikike ikpebi n'onwe ya ma ọ bụụ na ya na ndị imeobi gọọmentị nke gụnyere ndị gọvanọ wetara ikpe ahụ akpaghị ma kwekọrịta.

Ihe meburu

Imeụlọ ụlọikpe kachasị

Ụlọikpe Kachasị dọtịburu ohere ndị mmadụ nwere ịgbanwe ego ochie rue oge ụlọikpe ga-ebi ikpe a, mana Onyeisiala Buhari na CBN egeghi ntị dịka ha nyere ohere ka a kwụsị egochie ndị ọzọ n'abalị 10 nke ọnwa Febụwarị ma hapụ N200 rue Eprelu 10, 2023.

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa eyigharịala ikpe maka mmachi akwụkwọ ego naịra ochie

Ego Naira Ochie

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa akwụsịla nwa mgbe nta atụmatụ mmachi ego ochie nke CBN hiwere ma yigharịa ikpe maka nke a gaa ụbọchị atọ nke ọnwa maachị afọ 2023.

Nke apụtara na a ga-ekpegharị ya bụ ikpe dịka ụbọchị 6 gachara mgbe emechara ntụliaka.

Cheta na dịka ọnwa Febụwarị a na-ebido ka ụfọdụ steeti na Naịjirịa bịakutere ụlọikpe kachasị maka iwu nke CBN nyere nke kwuru na ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị bụ ụbọchị ikpeazụ ụlọakụ ga-anabata ego ochie nke N200, N500 na N1,000, ha gbara akwụkwọ sị ka ụlọ ikpe a kụchapụ ya bụ iwu.

N'izuụka gara aga ka onyeisiala Naịjirịa nyere iwu ka ahapụ akwụkwọ ego naịra ochie nke N200 ka e jiri ya na-egbo mkpa tutu ụbọchị 60 agacha, ma kwuo kwa na ego ochie nke N500 na nke N1000 agaghịzị adị ire dịka ego eji egbo mkpa ma sị ka ewega ha na ụlọọrụ CBN.

Atụmatụ a emeela ka ịnweta ego n'ụlọakụ na ebe ndị ọzọ sie ike, nke a ebutela ngagharịiwe na ọgbaghara n'ụfọdụ ebe.

Nke a butere mmebi ụlọ na akụrụngwa ọrụ ndị ụlọakụ n'aka ndị mmadụ iwe na-ewe.

Nasir El-Rufai nakwa Yahaya Bello (03-03-23)

Lee Steeti 10 na-ekwu ka ụlọikpe kụpụ iwu onyeisiala Buhari nyere maka ego ọhụrụ

Steeti iri na Naijirịa agwala ụlọikpe kachasị ka ọ kụpụ iwu onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari nyere nke machịrị iji akwụkwọ ego ochie nke N500 na N1000 gboo mkpa.

Gọvanọ Steeti ndị a gbara lwu a nklw nwere akara SC/CV/162/2023 n'ụbọchị Frịde site n'aka ọkaiwu ha bụ A.J Owonikoko.

Steeti ndị a bụ Kaduna, Kogi, Zamfara, Ondo, Ekiti, Katsina, Ogun, Cross River, Sokoto na Lagos steeti.

Ebe ọkiwu na anọchite anya gọọmentị Naijirịa n'ikpe a bụ ọkaiwu ukwu nke Naijirịa bụ Abubakar Malami na ọkaiwu ukwu nke Bayelsa na Edo Steeti.

Ndị mmadụ amalite isunye ọkụ n'etiti okporo ụzọ dị iche iche n'akụkụ Ibadan
Nkọwa foto, Ndị mmadụ amalite isunye ọkụ n'etiti okporo ụzọ dị iche iche n'akụkụ Ibadan

Ọgbaghara adapụtala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche maka ụkọ ego ọhụrụ Naịra

Akụkọ apụtala na ndị mmadụ ji iwe awakpo ụfọdụ ụlọakụ ebe ndị ngagharịiwe na-akwụchị okporoụzọ dị iche iche n’akụkụ Naịjria maka iwe ihe isi ike ụkọ ego ọhụrụ naịra na-akpata na Naịjirịa ugbua.

Ụlọakụ Etiti Naịjriịa gbanwere akwụkwọ ego naịra ochie nke ngalaba N200, N500, na N1000 ma nye iwu ka malite n’ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị ka a kwụsị iji ego ochie na-azụ ahịa na Naịjirịa.

Onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na ha mere nke a iji waghachite ọtụtụ ego dị n'aka ndị mmadụ karịa nke dị n'ụlọakụ.

Mana kemgbe ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba 2022 bụ ụbọchị ụlọakụ etiti kwuru na aga amalite ikesa ego, ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha ejibeghị anya ha hụ ya bụ ego ma fọdụzie iji ya zụọ ahịa.

N’ụbọchị Wenezde, ọgbaghara amalite ịdapụta n’akụkụ dị iche iche n’ihi ụkọ ego a nke gụnyere

Edo Steeti

Ọghaghara adapụtala n’akụkụ Benin dị iche iche bụ isi obodo Edo steeti dịka igwe ndị mmadụ ji iwe wakpo ụlọakụ dị iche iche nke gụnyere isi ụlọọrụ ụlọakụ etiti dị na steeti ahụ.

N’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, a hụrụ ebe ndị mmadụ gbakọtara n’ihu ụlọakụ etiti nakwa ụlọakụ ọzọ.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ka ndị ọrụ nchekwa malitere ịgba egbe aghara aghara iji chụsa iwe ndị mmadụ.

Ebe kepukepu na-ekwu na mmadụ abụọ anwụọla maka ya bụ ọgbaaghara.

Oyo steeti

Ndị nọchiri ụịzọ maka ngagharịiwe
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Igwe ndị mmadụ apụtala na-eme ngagharịiwe n'akụkụ mpaghara Apete dị n'Ibadan bụ isi obodo Oyo steeti maka etu mmanụ ụgbọala siri dị oke ọnụ nakwa ụkwa ego Naịra ọhụrụ dị na Naịjirịa ugbua. Ebe ndị ọzọ ọgbaghara na-adakwa na steeti ahụ bụ akụkụ Eleyele, Gbopa, Ologuneru, Apete, Sango, Poly road, Mokola nakwa Iwo Road.

Chetakwa na nke a ga-eme ya ugboro atọ a na-eme ngagharịiwe na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjiria n'ihi ụkọ ego naịra ọhụrụ a.

Onye ntaakụkọ BBC garụrụ Ibadan kwuru na emechiri ọtụtụ okporoụzọ na mpaghara ahụ.

Dịka o siri dị ndị mmadụ na-eme ngaghariiwe a sị na ha ga-emegide ya tutu gọọment e gboo ya bụ mkpa.

Ha gwara onye ntaakụkọ BBC sị, "Agụrụ na-egbu anyị. Anyị chọrọ ịzụta nrị a sị anya na ha anaghị ana ego ochie", dịka otu nwoke siri gwa BBC.

Otu agadị nwaanyị gwara BBC sị, " Eribeghị m nrị kamgbe ụtụtụ, ebe m gara iri nrị ha asị m ha na anaghị ana ego ochie".

Nwaanyị a gara n'ihu kwuo, "Nwa m nwoke zitere m ego, mgbe m gara ị were ego ha asị m na ha enweghị ego".

Delta Steeti

Ebe a na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, DSP Bright Edafe PPRO DELTA STATE

Ihe onyonyo na-egosi ebe amụnyere ogige ebe esi adọrọ ego na igwe ATM nke ụlọakụ na mpaghara okpuruọchịchị Udu nke Edo steeti taa bụ ụbọchị Wenezde.

Nke a na-eso ngagharịiwe dịka iwe na-ewe ndị mmadụ makụ ụkọ ego na steeti ahụ.

Ihe onyonyo gosiri ndị ntoroọbịa dịka ha ji okwute emebi mpio ụlọakụ ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Cheta na ndị ntoroọbịa Edo steeti meburu ngagharịiwe n'ọnwa Ọktoba afọ 2022 maka aka ike ha sị ndị ngalaba na-egbochi mpụ na nrụrụaka nke bụ EFCC n'ịchafụ na-enye ndị ntoroọbịa.

N'otu aka ahụ ka Gọvanọ Delta Steeti bụ Iferanyi Okowa edepụtala n'akara Twitter ya ma katọọ ya bụ ọgbaaghara.

O dere sị, "Anyị ghọtara ihe unu na-agabiga, kama anyị na-adụ ọdụ ka ndị mmadụ hara ibute ọgbaaghara n'ihi na ọ ga-eme ka ọkanyanye njọ".

N'aka nke ọzọ ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Steeti ahụ bụ Bight Edafe depụtara na Twitter ya sị, " ụfgọdụ ndị ntoroọbịa na ndị omekome sị na ha na-eme ngaghariiwe mụnyere ụlọakụ abụọ na ụgbọala abụọ ọkụ. Anyị anwuchiela mmadụ itolu n'ime ha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Kwara Steeti

Ndị uweojii pụtara ebe a na-eme ngagharịiwe.

Ebe foto si, BBC Yoruba

Ndị bi n''isi Obodo Kwara Steeti nke bụ Ilorin nọ n'iwe dịka ha na-ekwu na ụkọ ego na-enye ha oke nsogbu.

Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe pụtara mechie okporoụzọ ndị mmadụ na ụgbọala sị aga.

Ihe onyonyo Abubakar Sidiq Usaman onye nyemaka pụrụiche nke onyeisi ndị ọmeiwu bụ Ahmad Lawan tinyere na Twitter ya gosiri ebe otu nwa amadị na-ekwupụta iwe ya maka ọnọdụ ụko ego na Naijirịa.

Onye a kwuru sị, " Ka gọọmentị nye iwu ka ụlọọrụ naụlọakụ dị icheiche bido nawa ego ochie...ma ọ bụghị ya, enweghị onye ọbụla ga-eme ntụliaka".

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Rivas Steeti

Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ na Rivas Steeti chọpụtara na-emechiri ụfọdụ ụzọ nke dị na mpaghara Ozuoba na Rumuosi nke dị n'isi obodo Pọt hakụt n'ụtụtụ wenesde maka ụkọ ego.

Ihe na-eso nke a bụ dịka ndị ọkwọọ ụgbọala jụrụ ịnara ndị mmadụ ego N200, N500 na N1000 ochie nke mere ka ndị mmadụ tọọrọ n'ụzọ na amaghịzị ihe ha ga-eme.

Kama emechara wepụ ihe ha jiri dochie ụzọ dịka ozi rutere ha ntị na a ka na anara ego ochie.

Kama ime njem n'ime pọtakọtụ siri ike dịka ndị ọkwọọ ụgbọala ka siri ọnwu ị nara naanị ego ọhụrụ.