Atiku Abubakar: Peter Obi chọọ ka anyị na ya kpaa maka njịkọ, ụzọ anyị ghee oghe

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Facebook
Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha PDPD bu Atiku Abubakara ekwupụtala njikere ya ka ya na onye zọrọ ọkwa ahụ n'aha Labour Party bụ Peter Obi kpaa etu party abụọ ahụ ga-esi jikọọ ọnụ nke bekee kpọrọ 'alliance'.
Atiku kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja na mgbede Tọzde.
"Peter chọọ ka anyị na ya nwee mkparịtaụka, ụzọ anyị mepere emepe".
Atiku, onye kwuru nke a n'ọsịsa ajụjụ ma ọ na-ewute ya na ya na Peter Obi arụkọghị nakwa na ọ pụtara ịzọ na-agbanyeghị na ọ bụ ndị Ndịda Anyanwụ ka oke ahụ ruru na pati ha, sịrị, " Mgbe Peter hapụrụ PDP banye 'Labour party' anyị ebidobeghị ntụliaka imeụlọ anyị ịhọpụta onye ga-anọchite anya anyị, ya mere na okwu ma ọ ga-anọchite anya anyị apụtaghị ."
"Ọ bụ eziokwu na o were vootu anyị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na South South kama nke a agaghị eme ya onyeisiala maọlị. Ị maara na tupu ị bụrụ onyeisisla na Naịjirịa ị ga-enweta vootu na mpaghara ndị ọzọ."
Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naịjirịa bụ Inec n'ịchafụ kpọpụtara Bola Ahmed Tinubu nke otu APC dịka onye meriri ntụliaka onyeisiala nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
Mana ụfọdụ ndị soro zọọ ya gụnyere Peter Obi nke otu 'Labour Party' bụ ọkwa anabataghị ya bụ mmerị.
Obi ekwuola na ọ gaga ụlọikpe ịgbagha ya ma gosipụta na ọ bụ ya mereriri.
N'otu aka ahụ, Atiku kwuru n'ozi na "ntuliaka ahụ e mere n' ụbọchị Satode, abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, bụ " Ntuliaka kacha njọ kemgbe anyị nwetara ọchịchị onyekwuoucheya."
O kwuru sị, "Ana m adọnye ndị ọbụla na-alụ ọgụ megide mkpagbu ukwu oge niile".
"Ana m echeta mbọ m gbarala maka Naịjirịa nke mere na ndị ụweojii asatọ nwụrụ dịka ha chọrọ ịzọ ndụ m na nke nwa m nwoke. Nke a mere ka m gbaa ọsọ hapụ Naịjirịa nwamgbenta".
Atiku gara n'ihu kpọpụta etu njem ya n'ịhụ na Naịjirịa nwere ezi ọchịchị onyekwuoucheya. Ọ kpọrọ aha ndị dịka MKO Abiola na nwunye ya, Alfred Rewane na ọtụtụ ndị ọzọ jirila ndụ ha chụọ aja maka ọdịmma Naịjirịa.
Ihe o kwuru maka Ntụliaka onyeisiala afọ 2023

Ebe foto si, Screengrab
Atiku kwuru na ntụliaka afọ 2023 bụ nke kacha nye ndị Naịjirịa ohere ka ha hazigharịa ihe; iwu ntụliaka ọhụrụ, Igwe BVAS na etu igwe mmadụ siri pụta oge ntụliaka a butere nke a. Kama ebum n'obi niile kụrụ afọ n'ala.
O kwuru sị, " Ntuliaka a emere bụ ya kacha njọ kamgbe anyị wetara ọchịchị onye kwuo uche ya. Nyocha na-egosi na ntụliaka a bụ nke kacha njọ kamgbe ehiwere Naịjirịa".
Atiku gara n'ihu sị, "Amaghị m ihe mere ọchịchị Inec jiri were ọsọ kwuputa onye meriri ntụliaka a agbanyeghị mkpesa ndị mmadụ. E kpebiela m na ntụliaka nke onyeisiala na nke omeiwu riri mperi, anyị anabataghị ya".
O kwukwara na ndị nyocha nke Naịjirịa na ndị si ofesi kwuru na ya bụ ntụliaka agaghị nke ọma.
Ọ kwuru na ya maara na ya bụ mpụtara ntụliaka kpaliri iwe ndị ntoroọbịa kama ọ rịọrọ ha ka ha soro ụzọ udo.
O kwuru sị, "Etu anyị siri hazie ntụliaka anyị dị mkpa karịa onye a sị na ọ bụ ya meriri".
Ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya

Ebe foto si, Screengrab
Ndị ntaakụkọ bịara ya bụ emume jụrụ ya ajụjụ maka ị ga ụlọikpe, ma jụọ kwa ya ma dịka akụkọ na-ekwu na Tinubu ehiwela nzụkọ maka udo ma ọ ga-eso?
Ọ zara sị, " Amaghị m maka atụmatụ ọbụla gbasara nzụkọ a dịka i siri kwuo. Gbasara ị ga ụlọikpe, ndị ọkaiwu anyị ebidola nyocha ha, mgbe ha mechara patị anyị ga-ama ihe anyị ga-eme".
Onye ntaakụkọ ọzọ sị, " Ọtụtụ ndị mmadụ atụkwasịghị ụlọikpe obi ugbua, ị chere na ị ga-enweta ikpe ziri ezi"?
Ọ zara sị, "Maka ụlọikpe, a kpụpụrụ m onyeisiala Naịjirịa mgbe m bụ osote ya ụloikpe, enweghị ọkaikpe m mara mana emechara m nweta ụfọdụ mmeri megide ya. Ya mere agaghị m asị ma ọ bụ otu ụlọikpe ka ọ bụghị tutu m nwalee ya".
Mgbe a jụrụ ya ma ọ bụrụ na ọ nweteghị ikpe dịka o siri tụọ anya ihe ọ ga-eme, Atiku zara sị, " M ga-ekpesara ya Chineke".









