Ụka Katọlik agọlahụla ụkọchukwu Cajethan Obiekezie katọrọ Gọvanọ Soludo na pati APGA

Ebe foto si, Soludo
Ụka Katọlik nke Awka Dayọsis n'Anambra Steeti akatọọla otu ụkọchukwu ha aha ya bụ Cajethan Obiekezie maka okwu o kwuru gbasara Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo nakw pati ya bụ 'All Progressives Grand Alliance' (Apga).
N'akwụkwọ ozi si n'aka onye ji ọkw Chancellor na dayọsisi ahụ bụ Fr Charles Ndubuisi, ha kwuru na "Awka Diocese akwadoghị ihe Cajetan Obiekezie kwuru", ma kwukwaa na ọ bụ n'ike nke onwe ya ka o kwuru ihe ahụ, ọ bụghị n'ikike nke dayọsis Awka.
Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo, "ozi ahụ Fr Cajethan Obiekezie zisara nwereike imebi ọdịmma na mmekọrịta dị n'etiti ụka Katọlik na ụka Anglịkan n'Anambra steeti nke dịbara kamgbe gboo."
Fr Ndubuisi kọwara na ụka Katọlik nwere ikike izisa oziọma Kraịst nye mmadụ niile n'ihi na ọ bụ ikike nke Kraịst n'onwe ya nyere ụka, "mana enwere usoro doro anya a ga-agbaso n'izisa oziọma a".
"Ofufe nru Mass dị asọ nakwa ikwu okwu chukwu dị na ya abụghị ohere mmadụ nwere iji gbasawa ozi nke onwe ya maọbụ katọwa mmadụ, maọbụ kwuwe okwu ọbụla nwereike ime aha ọma mmadụ," Fr Ndubuisi dere.
Akwụkwọ ozi ahụ gara n'ihu kwuo na Dayọsis Awka ga na-aga n'ihu ịkụziri ndị ụkọchukwu ya etu ha ga-esi na-edebe 'pulpit' ebe a na-anọ ekwusa oziọma asọ; ọ bụrụkwa na onye ọbụla n'ime ha agahie, a ga-enye ya ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.
Ihe Cajetan Obiekzie kwuru

N'onyonyo nke fesarala ebe niile na soshal midia, ụkọchukwu Cajetan Obiekezie katọrọ Gọvanọ Soludo maka na ọ sị na Peter Obi agaghị emeri ntuliaka onyeisiala na 2023.
N'ihi nke a, Obiekezie gwara ndị ụka ya niile ka onye ọbụla ghara ịtụnyere pati Soludo bụ APGA na ntuliaka ndị omeiwu steeti bụ nke a ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị.
"Onye ọbụla nọ n'APGA maọbụ onye ọbụla tinyere foto Soludo n'akwụkwọ achụmnta vootu ya, anyị agaghị atụrụ ya vootu," ka Obiekezie kwuru.
Mana ndị isi ụka Katọlik nke Awka Dayọsis kwuru na Obiekezie na-ekwuru onwe ya.
Nke a abụghị nke mbụ Awka Dayọsis na-agọlaụ ụkọchukwu Obiekezie maka okwu o kwuru.
Na Nọvemba 2021, oge a na-achọ ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti, Obiekezie kwuru okwu katọọ Willie Obiano onye na-achị Anambra steeti n'oge ahụ, katọọ ụka Anglịkan n'Anambra steeti, ma katọkwaa pati 'All Progressives Congress', dịka o kwuru na ha chọrọ iji aka ike tinye onye dị ha mma ka ọ chịwa Anambra Steeti.
Ụka KAtọlik n'Akwa dayọsis katọwkara okwu ahụ n'oge ahụ.
Soludo na Fr Ebube Mụọ Nsọ

Ebe foto si, CHUKWUMA SOLUDO/FACEBOOK/FR EBUBE MMUONSO/FACEBOOK
Cheta na ụdị ihe dị otu a mekwara n'ọnwa Jeụwarị afọ a oge ụkọchukwu Katọlik ọzọ a ma ama bụ Emmanuel Obimma katọrọ Soludo maka na o kwuru na Peter Obi agaghị emeri.
N'oge ahụ, Obimma, onye e ji 'Ebube Muo Nsọ' mara kwuru na naanị ihe Soludo ma n'ọchịchị ya bụ "ịnakọ ndị mmadụ ụtụ isi aghara aghara ebe ndị agboro abịala were ọnọdụ n'Anambra Steeti niile".
"Soludo sị na Peter Obi agaghị enweta mmeri na ntuliaka, Soludo ị bụ Chukwu?Kedụ uru ị ga-erite na ịkwatu nwanne gị?”
Mana Bishọp ụka Katọlik n'Ọnịcha Achdayọsis bụ Valerian Okeke kaọrọ Fr Ebube Mụọ Nsọ maka okwu ya, ma kwuo na ofufe mass dị asọ abụghị ebe ụkọchukwu na-anọ ekwupụta uche ya, kama ọ bụ naanị maka ikwusa oziọma.









