Enugu East Senatorial Election: Ụjọ ndụ m na-atụ m - Ada Ogbu

Ada Ogbu

Ebe foto si, Ada Ogbu Nara

Onye ji aha pati 'All Progressives Congress' (APC) azọ ọkwa ịnọchite anya mpaghara Enugu East n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ada Ogbu ekwuola na ya na-atụ ụjọ ndụ ya dịka ndị ekperima na-awakpo ya ma jiri ọnwụ na-eyi ya na ndị ọrụ ya egwu.

Nke a na-abịa dịka a wakporo ebe Ada Ogbu haziri ọgbakọ achụmnta vootu ya n'obodo Ugbooka, n'Enugwu n'ụbọchị Sọnde.

Dịka Ada Ogbu n'onwe ya si gwa BBC, ndị ekperima wakporo ebe ahụ ọ haziri ọgbakọ, kurichaa ihe niile dị ebe ahụ, ma oche, tebulu, 'canopy', na ihe ndị ọzọ e kwesịrị iji mee ya bụ ọgbakọ.

"Ha tikwara ụfọdụ ndị ọrụ m ihe, merụchaa ha ahụ, ma sị ha gwam na ha achọghị ịhụ m na mpaghara ahụ ọzọ," Ada Ogbu gwuru na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC nwere n'ụbọchị Mọnde.

"Ihe zọrọ m bụ na anọghị m n'ọgbọ ebe ahụ, kama ndị ọrụ m bu ụzọ gawa iji kwadoo ụfọdụ ihe tupu m bịarute."

Ndị uweojii Enugwu steeti sị na mkpesa dị otu a erutebeghị ha ntị.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu kwuru nke a oge BBC zigaara ya ozi n'ekwentị.

Ihe mere mbụ agaghị eme ọzọ

Victor Oyibo Chukwu

Ebe foto si, Victor Oyibo Chukwu

Nkọwa foto, Victor Oyibo Chukwu, na-azọbu ọkwa Sineti mpaghara Enugu East na Labour Party lara mmụọ n'ọnwa Febrụwarị dịka ndị ojiegbe wakporo ya ma gbagbuo ya.

Cheta na ọ bụ na mpaghara Enugwu East ka ndị ojiegbe gbagburu onye 'Labour Party' na-azọkwa ọkwa sineti ebe ahụ, aha ya bụ Victor Oyibo Chukwu, n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị afọ a.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mazị Chukwu si ọgbakọ achụmnta vootu ya na-ala oge ndị ekperima wakporo ụgbọala ya ma gbagbuo ya na mmadụ ise nọ n'ụgbọala ya, ma mụnye ụgbọala ahụ ọkụ.

Nke a mere ka Ada Ogbu kwuo na ụjọ ndụ ya na-atụ ya, ka ihe mere mbụ ghara imekwa ọzọ.

"Abalị olemole gara aga, otu onye ọrụ m nwetara ozi iyi egwu, nke gwara ya ka ọ kwụsị ịrụrụ m ọrụ ma ọ bụrụ na ọ hụrụ ndụ ya na nke ndị ezinụlọ ya n'anya," Ada Ogbu kwuru.

"Enweela ọtụtụ mwakpo, mana nke ụnyaahụ (bụ Sọnde, Maachị 5) bụ nke kacha gbapụta ihe.

"Aga m ede akwụkwọ taa degara ndị uweojii, iji mee ka ha mara kpọmkwem ihe na-emenụ.

"Ọtụtụ oge anyị nwere ọgbakọ, ị ga-ahụ ụfọdụ ụmụ okorobịa na-ese ahịhịa ka ha na-agagharị n'okirikiri ebe ahụ, na-eche obere ihe ga-eme ka ha wakpo anyị."

Ada Ogbu kwuru na ndị iro ya na-ewepụ akwụkwọ 'poster' niile o ji atụ vootu n'ebe ọbụla ha hụrụ a, nke bụ otu ụzọ ha si eyi ya egwu ka ọ kwụsị ịzọ ọkwa Sinetọ ọ na-azọ.

Oge BBC kpọrọ Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti n'ekwentị, ọ zaghị.

O mechara zaghachi ozi anyị zigaara ya n'ekwentị ma kwuo sị: "Anyị anatabeghị mkpesa ọbụla maka mwakpo dị otu a. Onye ọbụla nwere mkpesa maka mwakpo ọbụla, ya wega ya n'ụlọọrụ ndị uweojii dị ya nso ka anyị mee ihe maka ya."