'Ihe m ji hapụ ọrụ Nọọsụ n'Amerịka chọọ ịnọchite Enugu-North na South n'Ụlọnnochiteanya'

Juliet Egbo na-azọ ọkwa ịnọchite Enugu-North na Enugu-South n' Ụlọomeiwu Nta n'aha otu APC gwara BBC ihe mere o ji azọ ọkwa ahụ.
Egbo bụ onye lụrụ ọrụ nọọsụ n'ala Bekee bụ ebe o si na-enyere ọtụtụ ndị obodo aka dịka o si metụta ahụike kwa mgbe kwamgbe.
O kwuru na ọ bụ ọkụ iweta mmepe obodo mere ya jiri hapụ ọrụ ahụ ike wee lata Naijiria ka ya gosi na nwaanyị bụ ihe.
Ọ kọwara mkpa ọ dị "Ka nwaanyị jee' nọchite ndị mpaghara Enugu-North na Enugu-South n'Ụlọomeiwu Nta.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
O kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-abụ ha merie, ha echefuo ọha ndị tunyere ha.
O kwuru na ịzọ ọkwa ahụ bụ iji hụ na ọrụ enyemaka ọ na-arụ dịka onye nkịtị ga-abawanye ma ọ banye ọkwa gọọmentị.
Egbo gara n'ihu kwuo na na ugbua bụ oge ekwesiri ịkwado ụmụ nwaanyị isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị iji wee mezie obodo ka ọ dị mma.
O kwuru na nwaanyị ọbụla na-eji obi nne na obi ume ala were na ama nkpa ndị ọ na elekọta mgbe niile were kwuo na oge eruola mgbe gọmenti ga akwado ka ụmụ nwaanyị nọ n'ụlọ one iwu gbagota n'ọnụ ọgụ.
Lee ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ ka ịnụrụ nkata anyị na Juliet Egbo nwere n'Enugwu n'uju:
Onye bụ juliet Egbo?
Oriakụ Egbo bụ onye ọrụ nọọsụ na mba Amerika ihe karịrị afọ iri abụọ. Ọ na azọ ya bụ ọkwa House of Reps ị ga nọchite anya Enugwu north and South na pati APC.


