Naanị otu nwaanyị so azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023

Ebe foto si, APM
Princess Ojei Chichi bụ naanị nwaanyị Independent National Electoral Commission (Inec) depụtara aha ya dịka onye so azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023.
Princess Chichi na azọchitere pati Allied Peoples Movement (APM) ọkwa a.
O si n'akụkụ ndịda Naịjriịa nke Delta steeti.
Osote ya bụ Ibrahim Mohammed dịka Inec siri depụta.
Lee aha ndị ga-eso zọọ ọkwa ọchịchị kpọmkwem na 2023 INEC wepụtara

Ngalaba nhazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission ewpụtela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa ọchịchị dị icheiche na gọọmentị etiti na ntuliaka 2023.
Inec bipụtara aha ndị a taa bụ Tuzde 20 Septemba 2022 dịka ha si kwubuo, ebe achụmnta vootu ga-amalite n'uju n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba 2022.
Lee ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ime akwụkwọ a Inec wepụtara:
Gọvanọ David Umahi ga-eso zọọ ọkwa Sineti

Ebe foto si, David Umahi
Dika ọ chịtaghị aja na ndọrọndọrọ imeụlọ ndị APC maka ọkwa onyeisiala, Gọvanọ Umahi ga-azọzi ọkwa Sineti nke Ebonyi South.
Aha ya dị n'akwụkwọ nke Inec, mana ha dere na ọ bụ mkpebi ụlọikpe kpatara nke a.
Cheta na ọ bụ nwanne David Umahi bụ Augustine meriri ntuliaka imeụlọ ndị APC maka ọkwa a, mana ọ rituuru Gọvanọ Umahi dịka ọ dachara na ntuliaka imeụlọ nke onyeisiala.

Ebe foto si, INEC
Onyeisi Sineti bụ Ahmad Lawan amabeghị ọnọdụ ya

Ebe foto si, Senate President/Facebook
Ka ọ dị ugbua, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Lawan agaghị eso zọọ ọkwa Sineti na 2023.
Lawan so na ndị zọrọ ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa onyeisiala, mana ọ nwetara naanị vootu 152.
Akụkọ kwuru na oge Lawan chọrọ ịlaghachi azụ ga zọọ ọkwa Sineti nke Yobe North, onye meriri ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa ahụ bụ Bashir Machina jụrụ ajụ irituru ya.
Ka ọ dị ugbua, Inec etinyeghị ma aha Ahmed Lawan ma nke Bashir Machina n'akwụkwọ a ha bipụtara.

Ebe foto si, Inec
Rochas Okorocha agaghị eso zọọ ọkwa ọbụla na 2023

Ebe foto si, Rochas Okorocha/Facebook
Rochas Okorocha bụ aka chịburu Imo steeti ma bụrụkwa onye na-anọchite anya Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, mana aha ya agaghị adị na ndị ga-eso zọọ ọkwa ọbụla na 2023.
Okorocha zọrọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka imeụlọ nke ndị APC mana o nwetaghị ọbụladị otu vootu.
N'oge ahụ, kepukepu pụtakwara na ọ si azụ ụlọ gbata akwụkwọ pati PDP maka ọkwa Sineti, mana odoghị anya ma akụkọ ahụ ọ bụ eziokwu.
Ka ọ dị ugbua, aha Okorocha adịghị n'akwụkwọ ndị Inec, ma na APC, ma na PDP.
Na APC, ọ bụ Osita Izunaso ka Inec wepụtara aha ya maka ọkwa Sineti nke mpaghara Imo West; na PDP ọ bụ Onyeriri Jones ka aha ya dị na ya.

Ebe foto si, Inec










