Princess Ada Ogbu na-azọrọ APC ọkwa sịnetị n'Enugu adịla njikere ịma ụmụnwoke aka

Aha onyonyo, Ụmụ Nwaanyị bata n'ọchịchị obodo adị mma - Princess Ada Ogbu

Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, onye ji ọkọlọtọ pati All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa sinate na mpaghara Enugwu East bụ Princess Ada Ogbu ekwuola na ya zuru ka emee ịzọta ma welatara ndị mpaghara ahụ oke ha n'ọchịchị Naịjirịa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ogbu kwuru na oge eruola mgbe onye ọbụla ga-apụta n'igwe kwado ya bụ nwaanyi n'ihi na oge agaala mgbe ọ bụ nani ndịnwoke na-aga ụlọomeiwu ukwuu Naịjirịa.

Princess Ada Ogbu

Ka ọ dị ugbua, a naanị ụmụnwaanyị isii nọ n’ụlọomeiwu ukwuu nke Naịjirịa. Ha isii bụ Stella Oduah Uche Ekwunife na-anaọchịteanya Anambra steeti, Monsurat Sunmonu onye si Oyo steeti, Fatimat Raji Rasaki, Grace Okoji Oku, Oluremi Tinubu na Binta Garba.

Naanị otu nwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka Naịjirịa nke anya bụ Princess Chichi Ojei.

Ọtụtụ ihe na-eche ụmụnwaanyị aka mgba n'okwu isonye n'ọchịchị nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa mana dị Ogbu kwuru, ọ gaghị ele ihe ndị a anya n'atụmatụ ya.

O gakwara n'ihu kwee nkwa na ngwa ngwa ya rigoro dịka sinetọ, na ya ga-arụzị okporoụzọ ndị dị na mpaghara ya, nye ndị ntorobịa ọrụ, rụọ ụlọọgwụ ma nyere ndị onweghị ka ọ hara ha aka.

Ntuliaka ndị ụlọomeiwu ukwu ga-abịa ụbọchị Satọde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị 2023.

Gere ihe Ada Ogbu kwuru n'uju n'ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a.