Market women in politics: Ihe mere ụmụnwaanyị na-ere ahịa ji dị mkpa n'oge achụmnta vootu

Ụmụ nwaanyị na-ere ahịa

Ebe foto si, David Eleke

Ụmụnwaanyị bara ezigbo uru n’obodo ọbụla dị n’ụwa n’ụzọ dị iche iche.

Ha na-arụ ọrụ n’obodo dịka nne, ndị mmepụta, ndị na-achịkwa oge, ịhazi ezinaụlọ, obodo nakwa ọgbakọ dị iche iche, gụnyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

N’ihi nke a, onye ọbụla maọbụ otu ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa na Naịjirịa anaghị eleli ụmụnwaanyị anya, maka na Igbo tụrụ ilu sị na “e lelie nwaite anya, ọ gbọnyụọ ọkụ.”

Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị sị na ụmụnwaanyị esoghi n’ihe a na-eme, onye ahụ jikere ịkụ afọ n’ala na ntuliaka.

Ụmụnwaanyị na-ere ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụnwaanyị mejupụtara ọkara ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa niile, mana a bịa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha anaghị enweta ọkwa ọchịchị dị o kwesịrị.

Kama a bịa n’ihe banyere mmadụ inwete mmeri na ntuliaka, ụmụnwaanyị maara ka e si akwado mmadụ ọfụma, ma nwoke ma nwaanyị.

Nke a mere n’oge ntuliaka na Naịjirịa, ndị niile na-azọ ọkwa na-agba mbọ ịdọta mkpụrụobi na nkwado ụmụnwaayị ọkachasị ndị na-ere ihe n’ahịa dị iche iche.

Ngwa nri

Gịnị mere Ụmụnwaanyị a ji dị mkpa na ntuliaka?

Ụmụnwaanyị na-ere ahịa

“Ụmụnwaanyị bụ ndị na-enwe ofu obi ma a bịa n’ọgbakọ ọbụla ha so na ya”, nke a bụ ihe otu nwaanyị na-ere ngwa nri n’ahịa ọhụrụ Ngwa Road dị n’Aba gwara BBC Igbo.

Nwaanyị a na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na oge ntuliaka aka ọbụla, na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị na-akpọ ha oku site n’aka ndị ndu ha n’ahịa.

“Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa ka anyị kwado ha n’oge ntuliaka, ha na-esi n’aka ndị ndu ụmụnwaanyị n’ahịa ebe a.”

Mgbe a jụrụ ya ihe mere ndị na-azọ ọkwa ji echeta ha n’oge ntuliaka a, ọ sị “ha maara na anyị na-enwe ofu obi, onye ọbụla anyị kwadoro na-emerikaarị na ntuliaka.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị a na-eji ihe onyinye na nkwa dị iche iche abịa, iji rata ụmụnwaanyị ka a tụọrọ ha vootu.

Kama ha merie na ntuliaka, agaghị ahụ azụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a anya ọzọ.

Ndị na-ere ahịa na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwaanyị ọzọ Abiodun Hassan na-ere anụ ọkụkọ n’ahịa Obalende dị na Legọs gwara BBC na ụmụnwaanyị nọ n’ahịa ha ekpebiela na ha agaghị akwado ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ntuliaka ugbua.

 N’okwu ya “mgbe ọbụla anyị kwadochara ha, ha meriri ha anaghị emezu ihe ha kwere anyị na nkwa.”

“Ọ bụ mgbe ha na-achọ vootu ka ha na-eji echeta anyị.”

Shehu Sani bụbu onye sịnetọ na Naịjirịa sị na ụmụnwaanyị na-ere ahịa bụ ndị mkpokọta pụrụiche, ndị na-apụta n’igwe eme ihe.

Ọ sị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị maara nke ahụ na ọ bụ mere ha ji achọ nkwado ụmụnwaanyị a.

Sani sị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-esi n’aka ndị ndu ụmụnwaanyị ndị a arata ha.

Ndị na-ere ahịa ụzọ

Ebe foto si, Iwaria

Otu onye ọkachamara na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Toyin Taiwo sị na dịka ntuliaka afọ 2023 na-abịa nso, na ihe na-ebe ka na-ebe.

“Ọtụtụ ụmụnwaanyị ga-adabakwa n’aka ndị na-azọ ọkwa maka na ihe siri ike ma dịkwa oke ọnụ ahịa.”

“Ha ga-asị ka ha were ohere a rite ihe n’aka ndị a makana ọ bụrụ ha banye n’ọchịchị o nwereike ha agaghị ahụ ha anya ọzọ.”