2023 Presidential Election: A ga- akagbuli ntuliaka Naijiria?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Nduka Orjimuo
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Ndị pati abụghị ha nọ n'ọkwa ga-agbali ime ihe a sị na ọ gaghị ekwe omune - ụlọikpe ịkagbu ntuliaka onyeisiala e mere na Naijiria, mba kachasị nwe ọnụọgụgụ mmadụ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Peter Obi na Atiku Abubakar ndị gbara onye nke abụọ na onye nke atọ na ntuliaka a na-eche na a kachasị zọsie ike kemgbe ọchịchị ndị agha bịara na njedebe n'afọ 1999 na-aga ụlọikpe ịga gbagha mpụtara ntuliaka ahụ nke Bola Tinubu ji pasent 37 n'ime vootu a tụrụ merie.
Mana kedụ ihe akaebe ha nwere? Ha enwenwuru ike inweta nkagbu mpụtara ntuliaka ahụ?

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter
Kedụ oge ha nwere iwepụ okwu n'ụlọikpe?
Mkpesa niile banyere ntuliaka na Naijiria kwesịrị iru ụlọikpe abalị 21 e ji kpọpụtacha mpụtara ntuliaka. E meghị otu ahụ, agaghị anabata ya.
Ya bụ Peter Obi na Atiku Abubakar nwwere ohere iziga mkpesa ha n'ụlọikpe dị n'Abuja tupu abalị 31 nke ọnwa Maach, nke ha merela, dịka akwụkwọ akụkọ si kwuo.

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Peter Obi/Facebook
Nke a ga-eme ka a malite ikpe ikpe a ọsịsọ ma ọ bụụ obere ntuliaka.
Mana ọ ga-ata akpụ iwepụta ihe aka ebe ihe mere n'ọgbọ atụmbvootu 176,000 maọbụ ọgbọ nchịkọta vootu dị 8,000 bụ ebe m a nabatara mpụtara vootu a tụrụ na ntuliaka onyeisiala.
Oge ole ka ọ ga-ewe inweta mkpebi ikpe a?

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter
A na-atụ anya na ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka Bekee kpọrọ 'tribunal' ga-ekpebi ikpe n'abalị 180.
Dịka Obi na Abubakar gbara akwụkwọ ha iche iche, a na-atụ anya na mkpebi ha ga-abịa n'oge dị iche iche.
Mana mkpebi 'tribunal' abụghị ebe ikpe na-ebi, ndị o metụtara nwere ike ịgbagharị akwụkwọ n'ụlọikpe Kachasị iji nweta mkpebi ikpeazụ.
Nke a ga-ewe abalị 60, nke pụtara na ọ ga-ewe ọnwa asatọ.
Pati anọghị n'ọkwa ha aga-emerinwụ?

Ebe foto si, LP/PDP/Facebook
Na-agbanyeghị na o nwebeghị mpụtara ntuliaka onyeisiala akagburula na Naijiria, o meela n'ọtụtụ ntuliaka e merela.
Obi so na ndị riterela na nke a.
Ọ nọrọ afọ atọ tupu o nweta ohere ịbanye ọkwa dịka gọvanọ Anambara steeti n'afọ 2006 dịka o merichara na ntuliaka n'afọ 2003.
Ọ gara n'ụlọikpe pụụ iche maka ntuliaka nakwa Ụlọikpe Mkpegharị
Ị gara ebe ahụ gosinwuo na ọ bụ ya nwetara vootu kachasị na ntuliaka, ụlọikpe were kpọpụta ya dịka onye meriri.
Kedụ ihe iwu Naijiria kwuru maka izipụ mpụtara ntuliaka?

Oge ndị ntaakụkọ jụrụ ya ihe akaebe o nwere gosiri na ọ bụ ya meriri na ntuliaka, Obi ekweghị ekwu, mana aAtiku sịrị, na "usoro e si mee ya nakwwa mpụtara ya dajọrọ".
I lee anya na okwu otu nọchitere PDP kwuru oge a na-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ tupu ndị Labour na PDPD azọpụ ebe ahụ n'iwe, ihe ga na-arụtụ aka bụ etu e si zipụ mpụtara ntuliaka sited n'ọgbọ atụmvootu.
N'afọ gara aga, e binyere aka n'iwu maka nhazi usoro ntuliaka 2023 nke kwuru na )atụmvootu nakwa izipụ mpụtara ya ga-abụ dịka Independent National Electoral Commission (Inec)] si nye ntuziaka".
Iwu ahụ nyere Inec iwu ka ha bipụta usoro a ga-esi mee ntuliaka malite na-edenye mpụtara na ọgbọ atụmvootu rue n'ebe nchịkọta mpụtara na wọọdụ.
Inec bipụtara usoro ha ga-esi mee ntuliaka bụ ebe ha kwuru na ndị ọrụ ha ga:
- E ji igwe ziga mpụtara site n'ọgbọnta vootu gaa n'ebe nchịkọta mpụtara.
- A ga-eji igwe 'Bimodal Voter Accreditation System' a kpọrọ BVAS n'ịchafụ sere mpụtara ahụ dị n'ibe akwụkwọ EC8A ziga n'ọbaọzi ha a kpọrọ 'Inec Result Viewing Portal (IReV) na Bekee.
Iji igwe were ziga mpụtara bụ iji hụ na ozi e ziri anwụrụ ruru eluigwe ọsịsọ, ma hụkwa na mmiri abaghị ya bụ mpụtara na ntị.
Mana ọtụtụ ndị tụrụ vootu kwuru na ndị ọrụ Inec enweghị ike mee ka ebe ụfọdụ ekweghị mee ya otu ahụ, nke mere e ji atụ uche na nke a bụ ụzọ ha ji chọọ ime wuru wuru na ntuliaka.
Inec sị na ọ bụ maka na ozi na-abịa n'ọba ozi ha kaịrị na ọ bụ ya mere na ha ebipụtaghị mpụtara dịka ọ na-abata.
Mana o ruela otu izuụka e mechara ntuliaka nanaị pasent 12 mpụtara bụ ihe dị n'ọbaozi ha.
Otu nnukwu ọkaiwu Naijiria bụ Yemi Candide Johnson gwara BBC na usoro Inec abụghị iwu Naijiria, na a ga-akagbu ntuliaka naanị ma enwee ihe gbara ọkpụrụkpụ pụtara n'ihi agbasoghị iwu ntuliaka.
"Ọ bụrụ na ịhapụ igbaso iwu emetụtaghị mpụtara, a gaghị akagbu ya.
" Ọ bụrụ na mpụtara na mpaghara ụfọdụ esoghị iwu, a ga-emegharị ya naanị n'ebe mpụtara pụrụ nnukwu iche.
Kedụ ihe ndị gbara akwụkwọ ga-egosi ụlọikpe?

Dịka iwu ntuliaka si dị, onye wwetara mkpesa ga-egosi na agbasoghị iwu metụtara mpụtara ntulaiaka n'ụzọ pụrụ iche.
Ọmụma atụ ebe wuru wuru maọbụ tigbuo-zogbuo mere n'ọtụtụ ọdọ atụmvootu maọbụ ọdọ nchịkọta vootu.
Ndịiche dị n'etiti vootu Tinubu na nke Abubakar ruru nde vootu abụọ, a ga-atụkwasị voootu 700,000 na nke a iji iji nweta ihe vootu Obi ji bekarịa nke Tinubu.









