Revolutions: Arab Spring, 'Bread Revolution" na ugboro anọ ndị ọzọ ọha mmadụ sị ndị ọchịchị na o zuola bụ na o zuola

Sri Llanka, egypt,China

Ebe foto si, Reuters/AFP

Dịka ndị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya si kwuo, mbanye Peter Obi n'okwu ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha Labour Party agbanweela ọtụtụ ihe ọkachasị etu ụmụamala nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eso ịzọ ọkwa ọchịchị.

Ije ahụ nke malitere dịka ụfọdụ ndị ntorobịa nọ na soshal midia kporo oku ka ọ hapụ otu PDP bụ gaa na obere pati zọọ ọkwa onyeisiala kama i were ọnọdụ osote onyeisiala emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ jụwa ọ bụ ihe Bekee kpọrọ "revolution" na-emezi dịka ọtụtụ malitere iti uche ọzọ na ịhọpụta onye ha nwere olile anya na ọ ga-agbanwe etu ihe si aga na Naijiria.

Akara njirimara
Ozi Twitter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

Revolution bụ nnukwu mgbanwe mere na mberede were wegharịa usoro ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ akụnaụba mba n'ụzọ pụrụ iche.

Mana ị ma na ọ bụghị mbụ ụmụamala na-agwa ndị ọchịchị na nnu aghala ofe?

Dịka ọkammụta n'ihe mere oge ochie na mahadum 'University of Melbourse bụ Peter Mcphee si kwuo, ụfọdụ n'ime njirimara 'revolution' gunyere nsogbu taarala nchara,; ngagharịiwe, ndị dị na otu dị iche iche itikọ aka megide gọọmentị nọ n'Ọchịchị ; nnụpụisi nke na-akarị ndị nọ n'ọchịchị dịka ndị agha na aga kwụnyere ndị nnupu isi nakwa nkewa otu ndị jikọburu ọnụ megide gọmmenti n'ọchịchị dịka ha na-azọ ọchịchị.

Lee ụgboro ise n'ụwa ndị a na-achị achị gwara ndị na-achị ha na a gbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi na ọnọdụ ịgba isis akwara wetara ha:

"Arab Spring'

Arab Spring

Ebe foto si, Reuters

Etu o si malite: 'Arab Spring' bụ ngaghariwe megidere gọọmenti nọ n'ọchịchị nke mere na mba ndị dị n'Arab n'ihe dịka afọ iri gara aga na ụma(2010s).

Ya bu ngosi iwe malitere na mba Tunisia n'abalị 17 nke ọnwa Disemba afọ 2010(17/12/2010) dịka otu nwokorobia ji baro agba mgbere akwụkwọnri aha ya bụ Mohamed Bouazizi ji iwe mụnye onwe ya ọkụ n'ihi mmekpa ahụ ndị uweojii.

E bugara nwa amadi ahụ ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ nwụọ n'abalị anọ nke ọnwa Jenụwarị(4/1/2011) mana onyonyo ebe o zunyere onwe ya ọkụ efesaalarịị na soshal midia na mba ha kuzuru iwe ndị ntorobia mba ahụ nke kpalietere ngaghariiwe megide ọchịchi ncịgbu onyeisiala ha oge ahụ bụ Zinedine Ben Ali bụ onye nọrọla ọkwa ya afọ 23.

Mohammed Bouazizi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Tupu Mohammed Bouazizi bụ onye gụrụ mahadum n ma naere akwụkwọnri n'ihi enweghị ọrụ anwụọ n'ụlọọgwụ, onyeisiala ha oge ahụ bịara leta ya
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ngaghariiwe ahụ nke mere ndị ntorobia mba ahụ wujuo ama na mpaghara dịche iche na mba ahụ mere ka Ben Ali rituo n'ọkwa ga ọ gachara abali iri, rie mbọmbọ mbọ ọzọ, gbaga Saudi Arabia.

Ihe mere na Tunisia kpalitere ọgbaghara na mba ndị ọzọ gbara ya gburugburu dịka Ijipti, Syria,Bahrain,Libya nakwa bụ ebe ndị mmadụ mere nghahrịiwe maka ọchịchị aka ike, ụbịam na nrụrụaka ndị ọchịchị.

Ijipt: Mmiri juru awọ afọ n'Ijipt malite n'abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2011 dịka ọgbaghara dapụtara ka ụmụamala mba ahụ siri onyeisiala mba ha bụ Hosni Mubarak bụ onye nọ®ọla n'ọkwa ya afọ 30 na o zụola.

Mubarak gbaara arụkwaghịm n'ọnwa Febụwarị 11, otu afọ ahụ ka ọ gachara abalị 17 ngaghariiwe megide ọchịchị ya ji malite, nyefee ndị agha mba ahụ ọchịchị. A họpụatara Mohammed Morsi bụ onye otu 'Muslim Brotherhood' na-akwado na ntuliaka e mere n'afọ 2012 mana ndịagha mba ahụ kwaturu ma weghara ọchịchị Generalu Abdel Fattah el-Sisi buruzie onyeisiala.

Arab Spring

Ebe foto si, Reuters

Yemen: Ngaghariiwe na mba Yemen nke nke mere na Tunisia na Ijipti kpalitere, malitere n'abalị 27 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2011. Ndị na-eme ngagharịiwe ahụ gunyere ụmụakwụkwọ mahadum na ndị ntorobia bụ ndị na-eti mkpu maka enweghị ọrụ, ajọ ọnọdụ akunaụba mba ahụ na nrụrụaka chọrọ ka Onyeisiala ha bụ Ali Abdullah Saleh rituo n'ọkwa ya. A kwuturu Saleh n'ọkwa, Praim Minista mba ahụ nakwa ndị omeiwu ha nọ na pati nọ n'ọchịchị gbakwara arụkwaghịm. Otu agha nnupussi jihad bụ alqaeda werekwara ọnọdụ na mba ahụ.

Arab Spring

Ebe foto si, Reuters

Bahrain: Ụmụamala mba Bahrain malitere ngaghariiwe nke ha n'abalị 15 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2011 na-eti mkpu ka agbanwe usoro ọchịchị mba ahụ eze mba ahụ bụ--- ji ndị uweojii chụsaa ndị na-eme ngaghariiwe ahụ e mere ọtụtụ ọnwa, gbagbuo ụfọdụ ndị mmadụ.ma merụọ ọtụtụ ahụ.

Libya: Ngaghariiwe nke ụmụamala Libya malitere n'abalị 15 nke ọnwa Februwari, afọ 2011 megide Ọchịchị Muammar Gadafi nọọ®ọla n'ọkwa afọ 42 siri n' ikwe n'aka ghọọ njide dịka ọ ghọrọ agha.

Dịka Gadafi ji ndi uweojii chụwaa ndị aka ha dị na ngaghariiwe ahụ ghọrọ agha, mba Amerika, Briten na Fransi tinyere aka megide Gadafi bụ onye e mechara nwụchie ma gbuo.

Arab Spring

Ebe foto si, EPA

Syria: Ọgbaghara malitere n'abalị isii nke ọnwa Maachị afọ 2011 na Syria dịka ụmụaka na-eto eto dere ihe n'aja ụlọaakwụkwọ ha megide onyeisiala ha bụ Bashar al-Assad..

Ahụhụ a tara ha maka ihe ha dere kpalitere ngaghariwe nke e mere n'udo mana ọgbaghara dapụtara mgbe gọọmenti ji aka ike sochie ndị na-eme ngaghariiwe.

Ikwe n'aka ghọrọ njide dịka agha dara na mba ahụ.

A sị na agha ahụ so kpalite otu ISIS ma mụnyekwuo ọkụ n'ọgbagharia dị na Iraq.

Ebe ngaghariiwe 'Arab Spring' dowere isi mba ndị meere ya

Naani na Tunisia ka nnupuisi 'Arab Spring' wetaara ha ihe ọma.

N'ebe ndị ọzọ, ọnọdụ ha kawanyere njọ dịka ndị ọchịchị bụ ndị na-apịabu ụmụamala ha ụtara,ha jizi akpị apịawa ha azụ.

Na Tunisia, e mere ntuliaka nke webatara ọchịchị onyekwuoucheya na mba ahụ n'Ọnwa Oktoba afọ 2011. E tinyere ikike nye kwuo uche ya n'Iwu mba ahụ nakwa ikike iji intanet agbasa ozi n'iwu mba ahụ n'afọ 2014.

Mana na Libya, Syria na Yemen, ngagharịiwe ahụ butere agha nke tara isi puku kwuru puku mmadụ, mere ọtụtụ ụmụamala mba ndị a ndị enweghịkwa be dịka ha gbara ọsọ ndụ.

Gọọmentị ụfọdu mba ndị a kpachiri ikike onye kwuo uche ya, kpachie ndị mmadụ ji intanet na soshal midia ekwu uche ha nakwa ikike ndị ntaakụkọ ịgbasa ozi.

Sri Lanka

Ngaghariiwe Sri Lanka

Ebe foto si, Reuters

N'afọ 2022, ụmụamala Sri Lanka gwara ndị ọchịchị ha n'o zuola dịka ha mere ngagharịiwe ọtụtụ ọnwa n'ihi nnukwu ụkọ mmanụ ụgbọala, nri , ọkụ latrik nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa ka a pụtachara na nsogbu covid-19.

Ndị obodo ji iwe wakpoo obi onyeisiala mba aha oge ahụ bụ Gotabaya Rajapaksa n'ọnwa Jụlai afọ 2022.

Rajapaksa riri mbọmbọ ọsọ gbapụ na mba ahụ.

Onọdụ ha ugbua: Ọ gaala ọnwa isii ya bụ ihe mere. Ụlọomeiwu ha họpụtara onye ji ọchịchị ganye na mba ahụ emem ntuliaka aha ya bụ Ranil Wickremesinghe. Ihe ka siri ike na mba ahụ, ebe Wickremesinghe ji ọkụ na mmiri sochie ndị na-eme ngagharịiwe.

'Haiti Revolution'

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Haiti bụ bụ mba ndị bụ ohu bụcha ndị isi ojii esi n' Afrịka ree n'ohu nye ndị ọcha kulitere sị ndị nwe ha n'Ọgụstụ afọ1791 na mmegbu na mkpagbu ha ezuola.

Ha kulitere gbusịsịa ndị nwe ha, ma isunye ugbo ha ọkụ.

Onye duru ndi ohu ibe y na ngaghariiwe ahụ bụ Tousaint L'Ouventure

Iji weta udo, ụlọomeiwu mba ahụ nke bụ ndị Fransi na-achịbu ha, tinyere iwu nyere ndị ojii mba ahụ ikike inwere onwe ha.

'Chinese Revolution'

Ndị Chaina

Nnupuisi a mere n'afọ 1911 bụ ya butere mgbanwe wetara usoro ọchịchị 'communism' na mba CHaina.

Tupu nke a emee, ọ bụ otu ezinaụlọ na-achị (Qing dynasty)na mba ahụ.

Mana e meriri mba ahụ n'ọtụtụ agha ha lụrụ nke mere ka ụmụamala kwụsị ịkwanyere eze ha ugwu.

Mana okwu ebighị na mba ahụ dịka Chaina si na mmiri ọkụ danadeye n'ọkụ dịka onye ndu ha bụ Mao Zedong malitere n'afọ 1966 ibu agha megide ndị iro ya nọ na 'Cọmmunist Party'

Mao nyere ndị ntorobia ikike imemila agwa ọbụla megidere omenala Chaina nke mere ka ndị na-eto eto kulitere medewe ndị mụụ ha, ụmụakwụkwọ ndị nkuzi ha..

E gburu ọtụtụ ndị, gbaa ma ụlọakwụkwọ na ụlọ okpukperechi na mba ahụ ọkụ, ebe ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ na mba ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ.

Ya bu tigbuo-zogbuo bere ka Mao nwụrụ n'afọ 1966.

'American Revolution'

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Nnupuisi a dapụtara n'etiti Briten na mba America 13 ha na-achị dịka Briten tinyere ha ego ụtụ isi iji nweta ego ha ji ụgwọ ego ha mefuru n'agha afọ asaa ha na mba Fransị lụrụ.

Ọgbaghara butere tigbo-zogbuo dara n'afọ 1773 dịka mmadụ 12 ji iwe tunye igbe tii karịrị narị atọ n'ime mmiri Boston Harbour kama ịkwụ ụgwọ isi n'elu tii ndị a nke e mechara kpọwa 'Boston Tea Party' n'afọ 1774.

Ndị nnọchiteanya si mba 12 gara okwu maka ikwu ka e wepụrụ ha ụtụisi ahụ bụzị ndị mechara chịwa mba ndị a tupu Amerịka enweta nnwereonwe n'aka mba Briten.