Ihe dọkịta kwuru gbasara nsogbu ntị Nnamdi Kanu na-enwe - Ifeanyi Ejiofor

Nnamdi Kanu na ndị Ọkaiwu ya
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị Ọkaiwu ya

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola etu Mazi Kanu si enye mkpesa maka nsogbu ọ na-enwe na ntị ya n'ụlọ mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS ebe e ji ya eji kamgbe ọnwa June 2021.

Ejiofor kwuru na Mazi Kanu nyere mkpesa a oge ọkaiwu ya ọzọ bụ Mike Ozekhome (SAN) gara leta ya n'isi ụlọọrụ ndị DSS dị n'Abuja n'ụbọchị Mọnde.

"Otu ihe dị mkpa Onyendu (Nnamdi Kanu) kwuru bụ na ndị DSS enweghị akụrụngwa ahụike a ga-eji leta ahụike ya anya, ọ kachasị ntị akaekpe ya na-egbu ya mgbu n'ihi ihe ndị ọrụ nchekwa tiri ya oge ha jichiri ya na mba Kenya n'ọnwa June 2021," Ejiofor kwuru.

"Nnamdi Kanu kọrọ na otu dọkịta ndị DSS zitere ka ọ bịa lee ya ahụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 2022, gwara ya na ọ bụrụ na ntị a na-egbu ya mgbu akwụsị ruo ụbọchị 45, a ga-awa ya ahụ iji mezie ihe mebiri na ntị ya.

"Mbọ niile anyị gbara ka ndị DSS rube isi na ndụmọdụ si n'aka dọkịta ha onwe ha zitere amịtabeghị mkpụrụ ruo taa."

Ejiofor kwuru na Mike Ozekhome deturu ihe niile a Nnamdi Kanu gwara ya n'akwụkwọ iji wegara ya ụlọikpe ma gbochie ihe ọjọọ ọbụla ime Mazi Kanu.

Ihe Ejiofor dere maka ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ihe Ejiofor dere maka ọnọdụ ahụike Nnamdi Kanu

O kwuru na ya onwe ya bụ Ejiofor ahụghị Nnamdi Kanu anya n'ụbọchị Mọnde, n'ihi na ndị DSS anaghị ekwe ka ndị ọkaiwu ya abụọ hụ ya n'otu oge, naanị otu onye n'ime ha ka ha na-ekwe ka ọ hụ ya n'otu oge.

"Mụ na ya ga-ahụ n'ụbọchị Tọzde (Febrụwarị 2, 2023) oge m ga-aga ileta ya," Ejiofor kwuru.

Ikpe Nnamdi Kanu ga-adị n'izuụka a

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ifeanyi Ejiofor kwuru na akwụkwọ mkpesa ha wegara n'ụlọikpe iji kwuo ka a manye ndị DSS na onyeisi ha ka ha hapụ Nnamdị Kanu ka ọ ga leta ahụike ya, ga-adị n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'izuụka a.

Cheta na ikpe ọzọ gbasara Nnamdi Kanu ka dịkwa n'Ụlọikpe Kachasị, dịka gọọmentị Naịjirịa na-agbagha ntọhapụ ụlọikpe mkpegharị tọhapụrụ Mazi Kanu.

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba 2022, ụlọikpe mkpegharị kwuru ka gọọmentị Naịjirịa tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu ma kwụọ ya ụgwọ iji tie ya aka n'obi maka imegide ikike dịịrị ya dịka mmadụ, n'ihi ụzọ aka ike ha si jichie ya na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.

Mana gọọmentị Naịjirịa gbaghara mkpebi ahụ n'ụlọikpe kachasị n'ụbọchị 23 nke Ọktoba. Kamgbe ahụ, ya bụ ike amalitebeghị n'ụlọikpe kachasị.

Gọọmentị Naịjirịa na-ebo Nnamdi Kanu - onye bụkwa nwa afọ mba UK - ebubo ịbụ onyeisi otu na-eyi ndụ egwu, ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa, ịkparị onyeisiala Muhammadu Buhari, nakwa inye ikike ka e gbuo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.