Gịnị ga-emezi ugbua otu Ipob chụrụ Emmanuel Kanu?

Emmanuel 'Kanunta' Kanu

Nwuchi Gọọmentị Naịjirịa nwuchiri onyendu otu nnwereonwe 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu n'afọ 2021 ebutela ọtụtụ nsogbu nye otu a, ọkachasị n'etiti ndị ndu ha dị ha na-ekewasị kamgbe ahụ.

Njichi e jichiri Kanu, onye nọbụ n'isi ihe niile gbasara ọchịchị Ipob emeela ka nnukwuu oghere dapụta n'isi ochichi otu a.

N'akwụkwọ ọzị ọhụrụ nke BBC hụrụ bụ nke onye nlekọta otu Ipob na Germany bụ Collins Chineduh binyere aka, o kwuru na Ipob na-enye nwanne Kanu bụ Kingsley Kanu (Kanunta) oche azụ dịka otu a ga-akwụsị ya ọrụ nwamgbenta.

Akwụkwọ ozi a boro ụfọdụ ụmụnne Kanu ebubo ma kwuo na ha na-akpa agwa ndị na-emegide ọganịhụ nakwa ịdịnaotu Ipob.

Chineduh so na ndị ọchịchị 'Directorate of State' (DOS) otu nke alaka Ipob bụ ndị nọ na mba Germany.

Na ya bụ akwụkwọ, ọ depụtara:

"Maazị Kingsley Kanu akpaala ọtụtụ agwa megidere iwu na ụkpụrụ Ipob dịka ọ na-ahụtazi onwe ya dịka onye karịrị iwu otu a."

Ọ gara n'ihu depụta ụfọdụ ihe ndị ọ sị Kingsley Kanu mere.

"Ọ gaala zigara ngalaba uweojii mba Germany na-ahụ maka mpụ ozi banyere otu onye Ipob nke megidere iyi ndị otu Ipob ṅụrụ."

"Ọ na-enye ndị ka ya n'ọkwa n'otu Ipob iwu ma hapụ iso usoro ọchịchị Ipob n'inye ya bụ iwu."

"Iji kpata nkewa n'otu a, onyela iwu ka e tinye Ogbonna Abraham bụ onye a chụpụrụla n'otu a dịka onye nlekọta ọhụrụ nke otu Ipob na Germany."

"Isi n'azụ nye onye nlekọta otu Ipob iwu ka ha hibe otu megidere iwu ga na-enwe ọgbakọ n'intanetị ma na-eme ihe otu a na-akwadoghi."

Chinedu gara n'ihu dọọ Kingsley aka na nti dịka o kwuru:

"E debanyere aha Ipob na mba Germany dịka otu nọ n'ukpuru iwu mba ahụ, ọ bụrụ na Maazị Kingsley Kanu gaa n'ihu na-emegide iwu otu a, ya chee aka ghọrọ ihe ọ ga-ahụ n'aka iwu mba ahụ."

Foto gosiri mgbe a nwụchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021.

Ebe foto si, Nigerian Government

Nkọwa foto, Foto gosiri mgbe a nwuchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021.

Chetakwa n'afọ 2020, onye bụbu osote onyendu otu a bụ Uche Mefor si n'otu a pụọ maka ọtụtụ nghọtaghie dapụtara n'etiti ya na Nnamdi Kanu nke gụnyere nghọtaghie n'usoro ọchịchọ nnwereonce Kanu na-eso, okwu etu e si emefu ego nakwa ihe ndị ọzọ.

N'oge gara aga, enwekwala mgbe ọtụtụ ndị nkwado otu a na mba Amereịka nakwa Briten si n'otu ahụ pụọ n'ihi ebubo nrụrụaka. Ihe a bụghịkwa oge mbụ ọgbaghara na-adapụ n'etiti ndị ndu Ipob.

N'otu aka ahụ na nso nso a, otu nwoke bụ ezigbo na-eso ụzọ Nnamdi Kanu na-akpọ onwe ya Prince Darlington nke ezigbo aha ya bụ Ogbalaeze Chukwubuikem zipụtara ihe onyonyo n'akara Facebook ya ebe o boro Emmanuel Kanu nakwa ụmụnne Nnamdi Kanu ọtụtụ ebubo nke metụtara nrụrụaka nakwa imegide ebumnobi otu Ipob.

Foto si n'ihe onyonyo Prince Darlington kesara na Facebook ya.

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Foto si n'ihe onyonyo Prince Darlington kesara na Facebook ya.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ihe onyonyo ahụ, Chukwubuikem ji mkpụrụ Ose Oji Igbo n'aka ṅụọ iyi dịka o kwuru na ọ bụrụ na ihe ndị ọ na-ekwu bụ ụgha ka ihe ọjọọ bịara ya mana ọ bụrụ na ihe ndị ọ na-ekwu bụ eziokwu ka ngọzị sochie ya azụ.

Ọ gara n'ihu kpọọ aha Emmanuel Kanu nke ọ sị na-akpọ onwe ya 'Fine boy' aha ma kwuo na ya na otu nwoke ọzọ nke aha ya bụ Kingsley Ezebiro jịkọrọ aka ọnụ na-ebuso ya agha maka etu o siri na-agba mbọ ịhụ na ha emefughi ego Ipob.

O kwuru na Emmanuel Kanu nwara ka o gobie ya n’oge gara aga site n’inye ya akwụkwọ ikike ịga biri na mba Cyprus, bụ ihe o kwuru so n’atụmatụ ha iwepụ ya n’ụzọ ka ha gaazie n’ihu na-eme ihe sọrọ ha n’aha Ipob.

Chukwubuikem rụkwara ndị ezinụlọ Maazị Nnamdi Kanu ndị ọzọ aka dịka Kingsley Kanu na Chinwe Kanu (gụnyere di ya ọ sị bụ Kingsley Ezebiro). Ọ gakwara n’ihu kpọkwa aha ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor nakwa aha otu nwaanyị nke ọ sị nọ n’isi nlekọta ego Ipob nke aha ya bụ Nnennaya Anya ma kwuo na ha niile na-akpa nkata na-ekesa ego Ipob.

Aloy Ejimakor zitere BBC Igbo ozi na Tuzde ma kụchapụ ebubo ndị a metụtara ya dịka o kwuru:

"Abụ m onye ọkaiwu kwụụrụ onwe m nke Maazị Nnamdi Kanu kpọrọ oku ka ọ hụ ihe ndị gbasara ikpe ya nakwa ikpe metụtara Ipob. Ọrụ m emetụtaghị ihe ọbụla gbasara ịnata maọbụ idobe ego Ipob, ihe ọbụla metụtara nke a agbasaghị m ma ncha." "Ana m eche na 'Da Prince' aghọtaghị ihe ọ na-akọ cha cha dịka ọ ma na ego Ipob anaghị agafee n'aka m cha cha."

Dịka o boro Emmanuel Kanu ebobo na ya na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụkọ ọrụ ugbua, ọ mara ya aka ka ọ pụta n’ihu ọha gọnar ihe ndị o kwuru.

N’ozi Kingley Kanu (Kanunta) wepụtara n'akara Facebook ya, ọ sara ụfọdụ ebubo ndị a Collins Chineduh boro ya nakwa nke Chukwubuikem boro ya.

Kingsley Kanu gara n'ihu kesaa ozi otu nwamadị aha ya bụ Ifeanyi Agu Best depụtara na Facebook bụ nke sịrị;

“Ezinaụlọ Maazị Nnamdi Kanu ka ndị ọzọ niile nwee ikike.”

O dekwara: "A chọrọ m ịgwa ọha na Collins Chineduh bụ onye a chụpụrụ achụpụ n'otu Ipob kembe."

Ọtụtụ ndị ka na-apụta na-akpọ onwe ha ndị otu Ipob agbanyeghị na gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ha dịka otu amachịrị amachi ma bụrụ otu ha si na-eyi ndụ egwu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ka na-apụta na-akpọ onwe ha ndị otu Ipob agbanyeghị na gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ha dịka otu a machiri amachi ma bụrụ otu ha si na-eyi ndụ egwu.

Kedụ ndị bụ ndị otu Ipob?

Otu Ipob na-alụ ọgụ nnwereonwe Bịafra n'aka Naịjịrịa bụ ndị si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjrịa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu Ipob na-alụ ọgụ nnwereonwe Bịafra n'aka Naịjịrịa bụ ndị si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjrịa.
  • Otu Ipob nke aha ya n'uju bụ 'Indigenous People of Biafra bụ otu na-achọ nnwereonwe Biafra n'aka Naịjịrịa bụ ndị si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjrịa.
  • Onye hibere Ipob bụ Nnamdi Kanu, ọ bụkwa onyendu otu ahụ.
  • Gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ndị Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu dịka ha siri kpọpụta aha otu a n'afọ 2017.
  • Gọọmentị jichikwara Nnamdi Kanu maka ebubo ịkpa nkata ịchutu ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa ihe ndị ọzọ n'afọ 2021. Uche Mefor bụbu osote
  • Nnamdi Kanu, mana o mechara wepụ onwe ya n'otu Ipob, n'ihi na ọ sị na ọ nabataghị atụmatụ nakwa usoro Ipob na-agbaso n' inweta nnwereonwe Biafra.
  • Ka ọ dị ugbua, Mazi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'aka ngalaba uweojii Naịjirịa bụ DSS, ebe gọọmentị na-anwụchikwa onye ọbụla bụ onye Ipob n'ihi na ọ bụ otu iwu na-akwadoghị.
  • N'afọ 2022 ụlọikpe mkpegharị nyere iwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu ma kụchapụ ebubo niile gọọmentị Naịjirịa boro ya, ma kwuo na usoro e ji nwuchie ya na mba Kenya dara iwu ma dị ka 'ntọrọ'
  • Gọọmentị Naịjirịa ekwebeghị ịtọhapụ Kanu dịka o kwuru na ọ ga-agbagha ya bụ mkpebị ụlọikpe mere n'afọ 2022.
  • Kemgbe a nwuchiri Kanu, enweela ọtụtụ ndị nakwa otu na-egosi onwe ha dịka ndị ndu otu a nke gụnyere otu nwoke bi na Finland a kpọrọ Simon Ekpa bụ onye wepụtara alaka nke ya ọ na-akpọ 'Autopilot' dịka ha na-akpọ oku nnwereone Bịafra, na-ehibe iwu nọrọ n'ụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma na-ekwu na ha agaghị anabata atụmatụ ntuliaka ọbụla n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
  • E nwekwa otu dị icheiche pụtara ịzọ maka nnwereonwe Biafra, nke gụnyere 'Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra' (Massob), 'Biafra Zionist Movement' (BZM) na ndị ọzọ.