Uche Mefor: Nwata ahụ bu egbe n’ihe onyonyo ahụ kwesịrị ịnọ n’ụlọakwụkwo
Dịka ụfọdụ ihe onyoonyo tụrụ ndị mmadụ n’anya pụtara n’ụbọchọ ole m ole gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ a pụtala katọọ ihe nọ n’ime ya bụ ihe onyoonyo.

Ebe foto si, Screen grab
Ọkachasị a hụrụ otu onye dị ka ọ bụ nwatakiri ebe o bu egbe ma sonye ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) nke bụ ngalaba nchekwa otu Indigenous People of Biafra (Ipob).
Otu onye ọnụ ruru n’okwu banyere ihe onyonyo a bụ Uche Mefor gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe banyere ya bụ ihe.
Mefor bụbu osote Nnamdi Kanu onye ndu otu Ipob tupu o si na otu ahụ pụọ maka ụfọdụ nghọtaghe ha nwere nke ọ kọwara na mkparịtaụka ya na BBC Igbo.
Ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Uche Mefor kwuru
- O kwuru na anaghị enyo ya enyo, na ndị nọ n’ihe onyoonyo ahụ bụ ndị otu Ipob/ESN
- Ọ katọrọ atụmatụ ibunye ụmụaka egbe ebe ha kwesiri ịnọ n’ụlọakwụkwọ
- Mefor sị na ibunye egbe dị mfe mana ịnapụ ndị ibunyere ya bụ egbe bụ nke na-adaghị mfe
- Ọ katọrọ ụzọ ọ sị ndị otu Ipob achọ nwereonwe ndị Igbo dịka o kwuru na ha na-akpalite ọtụtụ ọgbaghara na-egbu ndị Igbo ma na-emebi akụnụba ha
- O bokwara ebubo aka na ndị otu Ipob na-eji teknuzu nakwa ihe mgbasaozi ndị ọzọ na-akwalite nakwa na-ekesa akụkọ ugha dị iche iche
- Ọ tụrụ Nnamdi Kanu aka kwuo na kedụ ihe mere o zịpụtabeghị ozi katọọ ọgbaghara niile na-ada n’ala Igbo nke o kwuru na ọbụ Kanu sonyere ya bụ ọkụ na-agba
- Mefor sị na otu n’ime ụzọ ndị Igbo ga-esi nyere onwe ha aka ma nata ihe ruru ha n’aka Naịjirịa bụ ibanye na ndọrọndọrọ ọchịchị ruo mgbe ha kere oke ndị Igbo niile
- O kwuru na ọ kwadoro atụmatụ ọkwa onyeisiala iru ndị Igbo aka n’afọ 2023 dịka ọtụtụ na-achọ ka nke a mee
Kirie ihe onyoonyo a ka ị nụrụ ihe o kwuru n’uju


