Etu ndị DSS si jụ ịna ego anyị nyere ha maka ileta Nnamdi Kanu - Ejiofor

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP

Ifeanyi Ejiofor, bụ ọkaiwu Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) ekwuola na ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS n'ịchafụ, ekweghị anara ego ha bụ ndị ọkaiwu ya wetara ka e wee na-eleta Mazi Kanu anya.

Ejiofor kwuru nke a n'ụbọchị Mọnde dịka ya na ọkaiwu ukwu Mike Ozekhome gara leta Mazị Kanu n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS n'Abuja n'ụbọchị Mọnde, Disemba 9, 2023.

O kwuru na Kanu kwara arịrị na kamgbe abalị itoolu gara aga, ndị DSS eneyebeghị ya ọgwụ maka ọrịa obi ịcha ọkụ ọ na-enwe, nke na-eme ka ọ nọdụ n'ọnọdụ ahụ mgbu na ahụike ọjọọ kamgbe ahụ.

"Ebe ọ bụ na ndị DSS emechiela ụzọ niile anyị si ewegara ha mkpesa maka ihe gbasara Onyendu (Nnamdi Kanu), ihe ọzọ anyị nwereike ime bụ ịpụta kọọrọ ọha obodo ụdị mmekpa ahụ ọ na-agabiga," Ejiofor kwuru.

"Anyị ka na-agwakwa ndị DSS ka ha na-eleta ahụike Onyendu nke ọma site n'inye ya ọgwụ ya mgbe niile na-egbughị oge."

Ejiofor kwukwara na Mike Ozekhome amalitela ịchọ ụzọ ndị ọzọ ọ ga-esi mee ka ndị DSS na-eleta Kanu anya nke ọma.

O kwuru sị: "Ọ dị mkpa ka anyị kwupụta na naanị izuụka olemole gara aga, Ọkaiwu Mike Ozekhome nyere ndị DSS ego dị otu nde naịra (N1 million) bụ nke ọ gwara ha na ọ bụ iji na-eleta Onyendu anya, ọ kachasị n'ihe gbasara ahụike ya."

"Mana ọ bụ ihe mwute na ndị DSS ekweghị anara ego ahụ, na-ekwu na ha nwere ihe niile dị mkpa iji leta Kanu anya, ma nri ya ma ọgwụ ya."

"Ya mere anyị ji ajụ: gịnị kpatara ndị DSS ji eleghara ọrụ ha bụ ileta ahụike Onyendu any? Gịnị mere na ha anaghị enye ya ọgwụ ndị dị mkpa maka ahụike ya? Gịnị mere ha ji ka jichie Kanu ma jụkwa na ọ gaghị eleta ahụike ya...?"

Ejiofor sị na ha bụ ndị ọkaiwu Mazi Kanu na-akpọku gọọmentị mba ụwa dị icheiche iji kọsara ha na ọnọdụ ahụike Kanu na-agbada agbada, ma na-akpọkwa gọọmentị Naịjirịaka ha rube isi na mkpebi ụlọikpe mkpegharị nke kwuru ka atọhapụ Nnamdi Kanu na-egbughị oge ọbụla, ma kwukwaa na ndị DSS enweghị ikike ọbụla ijichi Mazi Kanu.

Ndị ọkaiwu Kanu agbaala DSS akwụkwọ

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

N'ụbọchị 21 nke ọnwa Disemba, ndị ọkaiwu Mazi Kanu bụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor gbara ndị ọrụ nchekwa DSS akwụkwọ n'ụlọikpe gbasara ahụike Kanu.

Ha chọrọ ka ụlọikpe nye ndị DSS iwu ka ha hapụ Kanu ka ọ ga mee nnyocha zuru oke, chọpụta kpọmkwem ihe bụ nsogbu ahụike ya, ma malite ịnata ọgwụgwọ.

Ya bụ ikpe ka nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ruo ugbua.

E jidere Nnamdi Kanu na mba Kenya n'ọnwa June afọ 2021 ma kpụlata ya Naịjirịa dịka gọọmentị na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye oyi ndụ egwu.

Ha bokwara ya ebubo na ọ na-akpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya, nakwa ịkparị Onyeisiala Muhammadu Buhari.