Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ụtụtụ ọma ndị be anyị.

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 4 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara gị akụkọ pụtara ihe n'ụwa.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midia anyị maka ihe onyonyo na foto akụkọ ndị ọzọ.

    Ndewo.

  2. Nwoke ndị uweojii gbara egbe na ngagharịiwe Kenya anwụọla

    Ọnụ na-ekwuru ezinaụlọ Kariuki bụ Emily Wanjira gwara ndị ntaakụkọ na ihe nke a pụtara bụ na ha na-eche mgbe ụlọọgwụ ga-agwa ha na ọ nwụọla.

    Ebe foto si, Boniface Kariuki's family

    Nkọwa foto, Ọnụ na-ekwuru ezinaụlọ Kariuki bụ Emily Wanjira gwara ndị ntaakụkọ na ihe nke a pụtara bụ na ha na-eche mgbe ụlọọgwụ ga-agwa ha na ọ nwụọla.

    Boniface Kariuki, onye na-ere ihe n’okporoụzọ ndị uweojii gbara egbe n’isi oge ngagharịiwe Kenya anwụọla.

    Ọnụ na-ekwuru ezinaụlọ ya bụ Emily Wanjira gwara BBC na ha ahụla ozu ya.

    Cheta na anyị wetara gị akụkọ kwuru na ndị ọrụ ahụike gwara ezinaụlọ nwaamdị ahụ na ụbụrụ ya akwụsịla ịrụ ọrụ n’agbanyeghị na ọ bụ ngwa enyemaka ka obi ya ji arụ ọrụ.

    Ndị uweojii gbara Kariuki na-ere ihe e ji ekpuchi imi bekee kpọrọ ‘mask’, egbe oge ha na ndị na-eme ngagharịiwe kwatụrụ n’isi obodo Nairobi na 17 Juun

    Ndị Dọkịnta kwuru na-ha awaala ya ahụ mana ha chọpụtara na mpempe mgbọ egbe ka nọ n’ụbụrụ ya.

    Cheta na ụlọọrụ mba Kenya na-ahụ maka ichekwa ikike mmadụ kwuru na ọ bụ mmadụ 19 nwụrụ ebe mmadụ 15 ndị ọzọ merụrụ ahụ na ngagharịiwe ahụ e mere na mba ahụ.

    Mana ndị ọchịchị kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ndị uweojii.

  3. Anyị kaara ịgbubi mgbasa ozi Bob Vylan n'ikuku- BBC

    Boby Vylan

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, Boby Vylan

    Ụlọntaakụkọ BBC ekwuola na ha kwesịrị igbubi ihe ngosi otiegwu Bob Vylan na Glastonbury dịka otiegwu u ahụ malitere idu igwe mmadụ ka ha tiwe, "Ọnwụ,ọnwụ nye ndị IDF(Israel Defence Army") na mmemme egwu úlóórú ahú haziri na ngwúcha izuụka a

    N'ozi ụlọọrụ a wepụtara ụbọchị Monde, BBC kwuru sị, "Ihe ndị ọrụ anyị na-achịkọta bụ emuemu a na-egosi dịka ọ na-eme, mana etu ihe siri gaa. Anyị na-ata onwe anyị ụta na nke a emeghị.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ na-achịkọta mgbasaozi n'ikuku bụ Ofcom kwuru na BBC kwesịrị ịzara ọnụ ha maka okwu ahụ dapụtara dịka ha na-agbasa ozi n'ikuku.

    Ọnụ na-ekwuru Ofcom kwuru sị, "Obi adịghị anyị mma banyere mgbasaozi ihe mere, BBC nwere ajụjụ ndị ha kwesịrị ịsa."

    Ụbọchị Monde, ọnụ na-ekwuru BBC kwuru sị, "BBC na-akwanyere ikike onye kwuo uche ya ugwu maka ha na-emegide mmadu ikpọ ọkụ tigbuo-zogbuo."

    "Okwu megide ndị Izrel dịka nke Bob Vylan bụ ihe anyị anaghị anabata n'ọbaozi anyị n'ikuku."

    N'ụbọchị Satọde, otiegwu Bobby Vylan, tiri "Ntọhapụ , ntọhapụ ndị Palestine", ma kwukwa site na iyi rue n'osimmiri, Palestine ga enwe ntọhapụ." - during their performance at the festival on Saturday.

    Ndị katọrọ ihe mere kwuru na nokwu ahụ bụ ịkpọ oku e bibie Izrel.

    Mana ụfọdu ndị na-akwado Palestine na-ekwu na ọ bụghị ihe mkpu ahụ pụtara, kama na ndị na-eti mkpu ahụ na-akpọ oku ka Izrel pụọ na WestBank ma kwusị ikwechiri na Gaza.

  4. Ogbunigwe Izrel tụrụ na Gaza a chụpụla ọtụtụ ezinụlọ - Ndị Palestine

    E bugara ọtụtụ ndị nkịtị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Al-Ahli dị n’obodo Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, E bugara ọtụtụ ndị nkịtị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Al-Ahli dị n’obodo Gaza

    Mba Izrel agaala n’ihu na-ịwakpo Gaza nke chụpụrụ ọtụtụ narị ezinaụlọ ndị Palestine, dịka ndị akaebe siri kwuo.

    Ndị ọrụ nnapụta nwetere ozu mmadụ ise ebe e bugara ọtụtụ ndị nkịtị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ Al-Ahli dị n’obodo Gaza, dịka ndị obodo siri kwuo.

    Mwakpo ogbunigwe a sochiri otu n'ime iwu mkpopu mmadụ kacha e nyere kemgbe agha ahụ maliteghachiri na Maachị.

    Nke a na-abịa ka a na-akpọ oku ka Praịm Minista mba Izrel Benjamin Netanyahu gbaa mbọ iji nweta nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ n’etiti Izrel na Hamas.

  5. Nkwekọrịta tarifu dị n’etiti UK na Amerịka amalitela mana enweghị ozi gbasara igwe

    Amerịka wepụrụ kpamkpam tarrifu na mbupụ ihe ụgbọelu niile si UK

    Ebe foto si, STEFAN ROUSSEAU/POOL/AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Amerịka wepụrụ kpamkpam tarrifu na mbupụ ihe ụgbọelu niile si UK

    Nkwekọrịta ibelata ụtụisi na mbubata nke dị n’etiti mba Amerịka na UK amalitela, iji mepere ụlọọrụ Briten na-arụpụta ụgbọala ụzọ ahịa kachasị n’ụwa niile.

    Nke a ga-ekwe ka ụlọọrụ UK na-arụpụta ụgbọala were ree ụgbọala ruru otu narị puku (100,000) na mba Amerịka n’ụtụisi pasentị 10% - nke a ga-abụ nnukwu uru karịa ndị ọzọ na-arụpụta ụgbọala na mba ụwa niile.

    Nke a na-eme dịka Amerịka wepụrụ kpamkpam tarrifu na mbupụ ihe ụgbọelu niile si UK.

    Na nloghachi, UK ga-ewepụ ụgwọ tarifu n’anụ ehi na mbubata ethanol si mba Amerịka - mana ụlọọrụ bioethanol nke Briten na-ekwu na ọ ga-eme ka o sie ike ụlọọrụ nke ha ime nke ọma.

    Ka ọ dị ugbua, igwe na aluminom si UK ka na-agwụ ụtụisi pasentị 25%. E nwereike iweli nke a elu ruo pasentị 50% ma ọ bụrụ na UK na Amerịka enweghị nkwekọrịta ma o ruo 9 Julaị.

  6. Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo ọzọ tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

    Majid Takht-Ravanchi kwuru na ọchịchị Onyeisiala Trump agwala Ịran na ha chọrọ ilaghachite inwe mkparịtaụka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Majid Takht-Ravanchi kwuru na ọchịchị Onyeisiala Trump agwala Ịran na ha chọrọ ilaghachite inwe mkparịtaụka

    Amerịka ga-ewepụrịrị atụmatụ ịwakpo mba Ịran ma ọ bụrụ na ha chọrọ imalite mkparịtaụka n’etiti ha, minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi gwara BBC.

    Majid Takht-Ravanchi kwuru na ọchịchị Onyeisiala Trump agwala Ịran site n’aka ndị ogbugbo na ha chọrọ ilaghachite inwe mkparịtaụka mana ha ekwuobeghị ebe ha kwụ maọbụ zaa ajụjụ kasị mkpa bụ ime mwakpo dịka mkparịtaụka na-aga n’ihu.

    Mwakpo ndịagha mba Izrel nke malitere n’ụtụtụ 13 Juun, mebiri agba nke isii nke mkparịtaụka ndị akwadoro ga-eme na Muscat ụbọchị abụọ ka Izrel mesịrị mwakpo ahụ.

    Mba Amerịka tinyere aka n’esemokwu dị n'etiti Izrel na Ịran na ngwụcha izu gara aga mgbe ọ wakporo ma gbarie ebe akụrụngwa nuklịa atọ nke mba Ịran.

    Takht-Ravanchi kwukwara na Ịran "ga-akwụsi ike" n’ịgbaju uranium mana ọ gọnarịrị ebubo na Ịran na-emepụta bọmbụ nuklịa na nzuzo.

  7. Ụmụ Igbo, ụtụtụ ọma

    Anyị na-asị nnọọ n’ọgbakọ BBC Igbo taa Mọnde 30 Juun 2025.

    Ekpere anyị bụ ka izu ọhụrụ a mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, anyị ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa na ụwa niile.

    Ndewo!

  8. Iko Onyeisiala: Ihe anyị ma maka ụgbọala otu egwu bọọlụ 'Abakaliki FC' nwere ihe mberede okporoụzọ

    Akụkọ kwuru na breeki ekweghị ọkwụ ụgbọala ahụ eji nke mere ka bọs ahụ gaa kụkara otu gwongworo na-agara onwe ya

    Ebe foto si, Sylvester Mbam

    Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na breeki ekweghị ọkwụ ụgbọala ahụ eji nke mere ka bọs ahụ gaa kụkara otu gwongworo na-agara onwe ya

    Ụgbọala bọs bu ndị otu egwu bọọlụ Abakaliki FC si Legọs alọta Ebonyi steeti n’ụbọchi Satọde 28 Juun 2025 ka akụkọ kwuru na o nwere ihe mberede nke okporoụzọ.

    Dịka akụkọ siri kwuo, ndị otu egwu bọọlụ ahụ hapụrụ Legọs mgbe otu egwu bọọlu Kwara United jiri ọkpụ anọ nke a satara naanị atọ were merie otu egwu bọọlụ Abakaliki FC n’egwuregwu bọọlụ ha gbara dịka asọmpị Iko Onyeisiala na-aga n’ihu.

    Onye akaebe hụrụ ihe merenụ na-achọghị ka akpọ aha ya, kọwaara BBC na ihe mberede ahụ mere n’okporoụzọ Ore nke dị n’Ondo steeti oge o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ n’ụbọchị Sọnde 29 Juun 2025.

    O kwuru na breeki ekweghị ọkwụ ụgbọala ahụ eji nke mere ka bọs ahụ gaa kụkara otu gwongworo na-agara onwe ya.

    Nke a mere ka ahụ ụgbọala ahụ kpọkasịa mana o nweghị otu onye n’ime ndị otu egwu bọọlụ ahụ tufuru ndụ ya dịka ha niile jiri ndụ ha pụta n’ihe mberede ahụ.

    Mbọ ụlọ mgbasa ozi BBC gbara ka ya na ndị ọrụ bọọlụ Abakaliki FC kparịtaụka gbasara ihe mberede a enweghị isi dịka akara ekwentị ha niile adịghị aga-aga.

    O nweghị otu onye n’ime ndị otu egwu bọọlụ ahụ tufuru ndụ ya dịka ha niile jiri ndụ ha pụta n’ihe mberede ahụ

    Ebe foto si, Sylvester Mbam

    Nkọwa foto, O nweghị otu onye n’ime ndị otu egwu bọọlụ ahụ tufuru ndụ ya dịka ha niile jiri ndụ ha pụta n’ihe mberede ahụ
  9. Ọtụtụ puku mmadụ na-eme ngagharịiwe na Bangkok ma kpọọ oku ka Praịm Minista Thai gbaa arụkwaghịm

    Onyendu ngagharịiwe ahụ Parnthep Pourpongpan kwuru na Praịm Minista "kwesịrị ịpụ n'ọchịchị n'ihi na ọ bụ ya bụ nsogbu".

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyendu ngagharịiwe ahụ Parnthep Pourpongpan kwuru na Praịm Minista "kwesịrị ịpụ n'ọchịchị n'ihi na ọ bụ ya bụ nsogbu"

    Igwe mmadụ ruru narị puku amalitela ngagharịiwe n’isi obodo Thai bụ Bangkok dịka ha na-akpọ oku ka Praịm Minista Paetongtarn Shinawatra gbaa arụkwaghim.

    Oku a malitere maka na mkparịtaụka nzuzo nke Praịm Minista na onye bụbu onyendu Kambodịa Hun Sen nwere n’ekwentị pụtara ihe.

    Akụkọ kwuru na mkparịtaụka ahụ bụ maka ihe mere na nso nso a n’okeala mba abụọ, dịka Praịm Minista Paetongtarn kpọrọ Hu Sen “nwanne nna” ya ma kwuo na “ọchịagha Thai na-edozi esemokwu ahụ "chọrọ ka ọ dịka ọ dị mma site na-ikwu ihe ndị na-abaghị uru".

    Onyendu ngagharịiwe ahụ Parnthep Pourpongpan kwuru na Praịm Minista "kwesịrị ịpụ n'ọchịchị n'ihi na ọ bụ ya bụ nsogbu".

    Paetongtarn arịọla ụmụafọ mba ahụ mgbaghara dịka okwu ya kpalitere iwe n’etiti ọha, ma kọwaa na okwu ahụ dịka “usoro mkparịtaụka".

  10. Onyeisiala Tinubu ga-agwa ọgbakọ ndị Sinetị na ụlọ nzukọ omeiwu nke Saint Lucia okwu na Mọnde

    Onyeisiala Tinubu erutela n’obodo Vieux Fort nke dị na Saint Lucia

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu erutela n’obodo Vieux Fort nke dị na Saint Lucia

    Onyeisiala Bola Tinubu erutela n’obodo Vieux Fort nke dị na Saint Lucia dịka ọ malitere njem nleta mbụ ya na mba abụọ dị na mpaghara Karịbịan na Saụt Amerịka.

    N’ozi nke onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga wepụtara n’akara soshal midịa ya, kwuru na Onyeisiala Tinubu ga-agwa ọgbakọ ndị Sinetị na ụlọ nzukọ omeiwu nke Saint Lucia okwu na Mọnde 30 Juun 2025.

    Dịka Onanuga siri kwuo, Onyeisiala Tinubu rutere mba ahụ n’ụbọchị Satọde 28 Juun 2025 mgbe o jiri ọkara gafee elekere ise nke ehihie n’ọdụ ụgbọelu Hewanorra nke mba ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Onyeisiala Tinubu ga-amalite nleta steeti ya n’ụbọchị Sọnde 29 Juun site n'ịga leta Nnukwu Gọvanọ Cyrial Errol Melchiades Charles na Praịm Minista Philip Pierre.

    Mgbe Onyeisiala Tinubu erutela n’obodo Vieux Fort nke dị na Saint Lucia

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Nkọwa foto, Mgbe Onyeisiala Tinubu erutela n’obodo Vieux Fort nke dị na Saint Lucia
  11. Ụlọọrụ INEC ga-amalite ndebanye aha ndị ga-atụ vootu n’Anambara steeti

    Ọ ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 8 Julaị nwee kwụsị n’ụbọchị Tọzde 17 Julaị 2025

    Ebe foto si, Independent National Electoral Commission /X

    Nkọwa foto, Ọ ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 8 Julaị nwee kwụsị n’ụbọchị Tọzde 17 Julaị 2025

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ha ga-amalite ndebanye aha ndị ga-esonye na-ịtụ vootu n’Anambara steeti.

    INEC kwupụtara nke a n’ozi ha wepụtara n’akara soshal midịa ha dịka ha kpọrọ oku ka ndị bi n’Anambara Steeti sonye n’ịga n’ihu na ndebanye aha “Continuous Voter Registration (CVR)” ga-amalite na steeti ahụ.

    Ha kwuru na ọ ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 8 Julaị nwee kwụsị n’ụbọchị Tọzde 17 Julaị 2025.

    Ha kwukwara na ndebanye aha ahụ ga na-amalite n’ụtụtụ ụbọchị ọbụla mgbe ọ kụrụ elekere itoolu nke ụtụtụ ma kwụsị mgbe ọ kụrụ elekere atọ nke ehihie, ma ụbọchị izu ma n’izu ụka.

    Onyeisioche INEC bụ Mahmood Yakubu gwakwara ndị ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa ka ha jiri ohere ndebanye aha na CVR na-abịa n'ihu dịka ebe nnwale iji mezie atụmatụ ọrụ nchekwa obodo ha tupu ntuliaka amalite.

  12. Mmadụ 81 anwụọla n’ogbunigwe Izrel tụrụ na Gaza – Mịnịstrị ahụike Hamas

    Ámá egwuregwu ahụ bụ ebe ndị a chụpụrụ achụpụ ji mere ụlọ ha dịka ha bi n'ụlọikwuu dị icheiche

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ámá egwuregwu ahụ bụ ebe ndị a chụpụrụ achụpụ ji mere ụlọ ha dịka ha bi n'ụlọikwuu dị icheiche

    Ihe ruru mmadụ iri asatọ na otu anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ narị anọ merụrụ ahụ mgbe mba Izrel tụrụ ogbunigwe na Gaza n’otu ụbọchị banye n’ehihie Satọde 28 Juun 2025, Mịnịstrị ahụike ndị Hamas kwuru.

    N'otu ihe merenụ, ihe dịka mmadụ iri na otu, gụnyere ụmụaka, nwụrụ mgbe a tụrụ ogbunigwe n'akụkụ ámá egwuregwu dị n’obodo Gaza, ndị ọrụ ụlọọgwụ Al-Shifa na ndị akaebe gwara ụlọọrụ mgbasa ozi.

    Ámá egwuregwu ahụ bụ ebe ndị a chụpụrụ achụpụ ji mere ụlọ ha dịka ha bi n'ụlọikwuu dị icheiche.

    Ihe onyonyo nke ụlọ mgbasa ozi BBC nnoychara gosiri ebe ndị mmadụ ji aka nkịtị na ngwu ala were egwu aja iji chọta ozu ndị nwụrụ anwụ.

    Ndịagha Izrel kwuru na ha amaghị maka ndị mmerụ ahụ n'ihi ogbunigwe ahụ ewezuga "onye a na-enyo enyo nke bụ ihe iyi egwu" nye ndịagha Izrel.

  13. Mba DR Kongo na Rụwanda abịnyela aka na nkwekọrịta udo na Washington

    Mba DR Kongo na Rụwanda abịnyela aka na nkwekọrịta udo na Washington

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Mba Rụwanda na Democratic Republic of Congo abịnyela aka na nkwekọrịta udo na Washington.

    Ebumnobi nkwekọrịta udo ahụ bụ iji kwụsị ọgbaaghara werela ọtụtụ afọ n’etiti ndị agbataobi abụọ ahụ ma nyekwa Amerịka ohere igwupụta akụ ndị si na chi.

    Nkwekọrịta ahụ na-akpọ oku ka e wezuga, kposaa ma machie otu niile bu ngwaọgụ alụ agha n’ọwụwa anyanwụ mba Kongo.

    Ozi gbasara ya erijughị afọ ebe nkwekọrịta udo e mere na mpaghara ahụ oge gara aga kụrụ afọ n’ala, mana nke a emeghị ka Amerịka na ndị isi ala mba Kongo daa mba ịhụta ya dịka mmerị gaferela ọtụtụ ọgbọ.

    “Taa, mbibi na tigbuo zọgbuo abịala na njedebe, dịka mpaghara a niile na-amalite oge ọhụrụ nke jupụtara n'olileanya na ohere ọma,” ka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru n’ụbọchị Fraịde.

  14. Onyeisi nuklịa n’otu UN ekwuola na Ịran nwereike ịmalite iji uranium rụpụta ogbunigwe n’oge adịghị anya

    Onyeisi nuklịa n’otu UN ekwuola na Ịran nwereike ịmalite iji uranium rụpụta ogbunigwe n’oge adịghị anya

    Ebe foto si, EPA

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ngwaagha nuklịa n’otu United Nations (UN) ekwuola na Ịran nwere ikike ịmalite ịgbaju uranium ọzọ maka iji rụpụta ogbunigwe n’ime ọnwa ole na ole.

    Onyeisi ngalaba International Atomic Energy Agency (IAEA) bụ Rafael Grossi kwuru na ogbunigwe Amerịka tụrụ n’ogige ngwaagha ọgwụrụmba atọ dị n’Ịran na ngwụcha izuụka gara aga butere nnukwu mbibi nke na-ekpochapụghị ya kpamkpam.

    Nke a na-agba ụkwụ megide okwu Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na “e kpochapụla” akụrụngwa nuklịa mba Ịran “kpamkpam”.

    “N’ikwu eziokwu, mmadụ apụghị ikwu na e kpochapụla ihe niile na enweghịkwa ihe nọ ebe ahụ,” ka Grossi kwuru n’ụbọchị Satọde.

    Cheta na Izrel wakporo ogige ngwaagha nuklịa na nke ndịagha dị n’Ịran n’ụbọchị 13 Juun 2025 dịka ha kwuru na ọ fọdụrụ obere ka Ịran rụpụta ngwaagha ọgwụrụmba.

    Amerịka mechara sonye na mwakpo ahụ, dịka ha tụrụ ogbunigwe n’akụrụngwa nuklịa atọ nke mba Ịran dị na Fordo, Natanz na Isfahan.

  15. Ndị uweojii Serbịa na ndị ngagharịiwe na-emegide gọọmentị enweela nsogbu na Belgrade

    Igwe mmadụ ruru narị puku na puku iri anọ (14,000) pụtara n’obodo ahụ ime ngagharịiwe ahụ ụmụakwụkwọ na-edu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Igwe mmadụ ruru narị puku na iri anọ (140,000) pụtara n’obodo ahụ ime ngagharịiwe ahụ ụmụakwụkwọ na-edu

    Ndị uweojii Serbịa na igwe mmadụ ndị ngagharịiwe na-emegide gọọmentị bụ ndị chọrọ ka enwe ntuliaka ọsọ ọsọ iji wete ọchịchị Onyeisiala Aleksander Vucic nke rugoro afọ iri na abụọ na njedebe, enweela nsogbu n’isi obodo Belgrade.

    Igwe mmadụ ruru narị puku na puku iri anọ (140,000) pụtara n’obodo ahụ, n’ọgbakọ kachasị n'ime ọnwa ndị na-adịbeghị anya, dịka ngagharịiwe ahụ nke ụmụakwụkwọ na-edu na-aga n’ihu ịrụgide ọchịchị Onyeisiala Vucic.

    "Anyị chọrọ ntuliaka!" igwe mmadụ ahụ tiri mkpu.

    A nwụchiri ọtụtụ mmadụ dịka a hụrụ ndị uweojii ebe ha na-agba ha anwụrụ anyammiri “teargas” ka e nwere chụsaa ha.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, A nwụchiri ọtụtụ mmadụ dịka a hụrụ ndị uweojii ebe ha na-agba ha anwụrụ anyammiri “teargas” ka e nwere chụsaa ha.

    A nwụchiri ọtụtụ mmadụ dịka a hụrụ ndị uweojii ebe ha na-agba ha anwụrụ anyammiri “teargas” ka e nwere chụsaa ha.

    Onyeisiala Vucic na-ebo ndị ngagharịiwe ahụ chọrọ ntuliaka ọhụrụ ebubo na ha na mba ọzọ na-ejikọ aka ọnụ n’ịkpa nkata na-achọ imibe mba ya.

    "Ha chọrọ ịkwatu Serbịa, ma ha adaala," ka o dere n’akara Instagram ya.

    Ndị uweojii Serbịa nwụchiri otu nwoke ka ndị ngagharịiwe na ndị uweojii Serbịa na-eseokwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii Serbịa nwụchiri otu nwoke ka ndị ngagharịiwe na ndị uweojii Serbịa na-eseokwu
  16. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma

    Anyị na-asị nnọọ n’ọgbakọ BBC Igbo taa Sọnde 29 Juun 2025.

    Ekpere anyị bụ ka Chineke nwete anyị niile ngọzị dị ukwuu.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa, anyị ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa na ụwa niile.

    Udo dịrị ụnụ.

  17. Foto: Mgbe Wike, Fubara na Martins n'ọkọtara ọnụ n'olili ozu nwanne nna Wike

    Nyesom Wike na Siminalayi Fubara na-enwe mkparịtaụka

    Ebe foto si, Tina Briggs News

    Foto na-efegharị na soshal midia ugbua gosiri ka minista na-ahụ maka isiobodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike, Gọvanọ Rivas Steeti bụ Siminalayi Fubara na onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steeti bụ Martins Amaehwule ka ha nọkọtara ọnụ n'ụbọchi Satọde Juun 28.

    Nke a mere mgbe ha gara olili ozu nwanne nna Wike n'obodo Rumuepirikom dị n'okpuruọchịchị Obio/Akpor nke Rivas Steeti.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Bola Tinubu kpọchara ha oku n'Abuja ma kpee udo n'etiti ha.

    Mgbe Wike, Fubara, Amaehwule na ndị ọzọ nọkọtara ọnụ n'olili ozu ahụ

    Ebe foto si, Tina Briggs News

    Cheta na onyeisiala Tinubu kwụsịtụrụ Gọvanọ Fubara, omeiwu Amaehwule na ndị omeiwu ndị ọzọ ọrụ ruo ọnwa isii maka esemokwu ndọrọ ndọrọ dị n'etiti ha, nke metụtakwara Wike.

    Ka mechara ọgbakọ ahụ, foto ha na onyeisiala Tinubu sere malitere efesasị na soshal midia.

    Kamgbe ahụ, ndị a na-enwe mkparịta ụka iji hụụ etu a ga-esi weghachịta udo n'etiti ha maka ọdịmma steeti ahụ.

    Odoghi anya ma o nwere nkata ọzọ ha kpara n'ebe olili ozu ahụ kama foto a ebe ha niile nọkọta ọnụ mere ka ọtụtụ ndị kpọrọ ha n'ọnụ, na-ajụ ma ha ekpeziela n'ezie ya?

    Ụfọdụ kwuru na ọ na-atụ ha n'anya etu ha siri na-emezi ka ezigbo ọyị n'ime ụbọchị abụọ ha zutechara Onyeisiala Tinubu n'Abuja.

    Fubara na Amaehwule

    Ebe foto si, Tina Briggs News

  18. A họpụtala Dalori dịka onyeisioche pati APC ga-anọchi anya Ganduje

    Ali Buka Dalori na Abdullahi Ganduje

    Ebe foto si, Ali Buka Dalori/Abdullahi Ganduje/X

    Patị nọ n'ọchịchị na Naịjirịa ugbua bụ All Progressive Congress (APC) ahọpụtala Ali Bukar Dalori dịka onyeisioche ọhụrụ ha.

    Nke a na-abịa dịka onye jibu ọkwa ahụ na mbụ ma chịbuo Kano Steeti bụ Abdullahi Ganduje gbara arụkwaghịm n'ọkwa.

    Ali Bukar Dalori tupu a họpụta ya bụbu osote onyeisioche pati APC na-achịkọta mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

    Ugbua ọ ga-elekọta ihe ọbụla gbasara APC dịka onyeisi ha ruo mgbe kọmitii ndịisi ha ga-enwe nzukọ.

    Ọnụ na-ekwuru pati APC bụ Felix Mourka kwuru na Ganduje sị na ihe mere o jiri gbaa arụkwaghịm bụ ka o nwee ohere leba anya na mkpa ndị na-akpa ya, dịka o si dee n'akwụkwọ arụghịm o degaara pati ya.

  19. E kwuola na ọ bụ mmadụ 19 nwụrụ na ngagharịiwe e mere na Kenya

    Ndị uweojii na-chụgharị onye na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii na-chụgharị onye na-eme ngagharịiwe

    Ụlọọrụ mba Kenya na-ahụ maka ichekwa ikike mmadụ ekwuola na ọ bụ mmadụ 19 nwụrụ ebe mmadụ 15 ndị ọzọ merụrụ ahụ na ngagharịiwe ahụ e mere na mba ahụ ụbọchị Wenezde 25 Juun, 2025.

    Ọtụtụ puku mmadụ na Kenya mere ngagharịiwe banyere ajọ ọchịchị gọọmenti Onyeisiala William Ruto ma kpọọ oku ka gọọmenti lebanye anya na mkpagbu ndị uweojii na-akpagbu ndị ntorobịa mba ahụ.

    Ụfọdụ ndị ngagharịiwe ahụ kpọkuru ka Onyeisiala Ruto gbaa arụkwaghị m dịka onyeisiala Kenya.

    N’aka nke ọzọ, gọọmenti akatọọla ngagharịiwe ahụ ma kwuo na ụfọdụ ji ohere ahụ zuo ogige ihe e ji akọ ugbo bekee kpọrọ fertilizer. Ha kwuru na nke a nwereike itinye mba ahụ n’ọnọdụ ụkọ nri.

  20. Ịran eliela ozu ndị isi agha ha nwụrụ na mwakpo Izrel

    Ndị isi agha nwụrụ gụnyere Mohammed Bagheri bụ onye agha jị ọkwa kachasị n’Ịran ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ndịagha Ịran niile.
    Nkọwa foto, Ndị isi agha nwụrụ gụnyere Mohammed Bagheri bụ onye agha jị ọkwa kachasị n’Ịran ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ndịagha Ịran niile.

    Ndị isi mba Ịran eliela ozu mmadụ 60 gụnyere ndị isi agha ha na otu onye nnyocha sayensị nuklịa nwụrụ na mwakpo mba Izrel wakporo n’ime abalị iri na abụọ.

    E ji ọkọlọtọ mba Ịran machie akpati ozu ha ma gosi foto ndị isi agha ahụ n’ogige Enghelab Square dị na Tehran.

    Ọtụtụ mmadụ yi uwe ojii gbakọrọ n’ogige ahụ ma na-efe ọkọlọtọ Ịran nakwa foto ndị ahụ nwụrụ.

    Mwakpo ahụ kwụsịrị na mbido izuụka a dịka e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ oge mba Amerịka wakporo ogige akụrụngwa nuklịa Ịran.

    Ndị isi agha nwụrụ gụnyere Mohammed Bagheri bụ onye agha jị ọkwa kachasị n’Ịran ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ndịagha Ịran niile.

    A ga-eli ozu Bagheri, nwunye ya na nwa ya nwaanyị ndị nwụrụ site na mwakpo ahụ.

    Ndị ọchịchị Ịran kwuru na mmadụ 627 nwụrụ n’Ịran ebe mba Izrel kwuru na ndị be ha dị 28 nwụrụ site n’ogbunigwe mba Ịran tụrụ ha.

    Ọtụtụ mmadụ yi uwe ojii gbakọrọ n’ogige ahụ ma na-efe ọkọlọtọ Ịran nakwa foto ndị ahụ nwụrụ.
    Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ yi uwe ojii gbakọrọ n’ogige ahụ ma na-efe ọkọlọtọ Ịran nakwa foto ndị ahụ nwụrụ.