New Naira design: Ụlọikpe Kachasị akwụsịla CBN na Gọọmentị Etiti iwepu ego ochie n'ụbọchị Feb 10

Ego Naira ochie

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe kachasị amachiela ụlọakụ etiti bụ CBN n'ịchafụ nakwa Gọọmentị etiti iwepu ego ochie nke N200, N500 nakwa N1000 kpam kpam n'ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị dịka ha si kwadobu.

Nke a na-abịa dịka steeti atọ bụ Kaduna Kogi na Zamfara gbara CBN na Gọọmentị etiti akwụkwọ n'ụlọikpe kachasị ahụ iji kwụsị ha iwepu ego ochie ahụ.

Ndị ọkaikpe asaa nke onyeisi ha bụ Ọkaikpe John Okoro kwenyere n'ofu obi ịkwụsị ụlọakụ etiti, ụlọakụ nkịtị nakwa gọọmentị etiti iwepu ego ahụ.

Nke a mere na ndị mmadụ ka ga na-anabata ego ochie n'orure nakwa ọzụzụ ahịa rue oge ekwubeghi mana ụlọikpe ahụ tinyere ụbọchị 15 ọnwa Febụwarị dịka ụbọchị ha ga-enyochagharị ikpe ahụ.

Gọọmentị Kaduna,Kogi na Zamfara agbaala gọọmenti Naijiria akwụkwọ maka ego ọhụrụ
Naira ọhụrụ

Ebe foto si, Presidency

Gọọmentị Kaduna,, Kogi na Zamfara agbaala Gọọmenti Etiti akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị na-arịọ ka ụlọikpe ahụ kmachie Ụlọakụ etiti ikwụsị mgbanwe ego ọhụrụ dịka ha kwuru .

Ọ bụ ọkaiwu na-anọchite steeti atọ ahụ bụ AbdulHakeem Uthman Mustapha (SAN) wepụrụ okwu ahụ ụlọikpe ma na-arịọ ka ụlọikpe machie Gọọmentị ETiti na Ụlọakụ Etiti na ụlọakụ dị na Naijiria ịkwụsị mgbanwe ego ochie dịka CBN tinyere abalị 10 nke ọnwa Febụwarị dịka ụbọchị a ga-akwụsị nke a.

Ndị gbara akwụkwọ ahụ gụnyere kọnishọna ikpe na steeti atọ ndị a, ebe Ọkaiwu Ukwu Naijiria bụ Abubakara Malami na-anọchite Gọọmentị Etiti.

Gọọmentị steeti ndị a wetara ikpe a n'ụlọikpe na-ekwu na kemgbe e wepụtara ego ọhụrụ, na e nwere nsogbu dịka ndị mmadụ wegara ego ochie na enwe nsogbu inweta nke ọhụrụ, nke na ha anaghị ahụ ego ha ji egbo mkpa ha.

Ha kwuru na abalị 10 ahụ Gọọmentị Etiti gbatịrị oge mgbanwe ego agaghị ezu igbo nsogbu inweta ego.

Cheta na Gọọmentị Naijiria gbanwere ego ọhụụ ma nye ụmụ Naijiria malite n'ọnwa Disemba rue ngwụcha ọnwa Jenụwarị(31/1/2023 iweghachi nke ha ji nara nke ọhụrụ.

Mana nke a pbutere nsogbu dịka ọtụtụ ndị weghara ego ha enwetaghị ego ọhụrụ nke mere ka ụlọakụ etiti gbatie ohere ahụ rue abalị 10 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

Na ngwụcha izuụka gara aga, onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ Godwin EMefiele kwuru na a gaghị agbatịkwa ohere ahụ ọzọ.

Naira redesign: 'Ọgụ na mgba ka e ji azọ akwụkwọ ego ọhụrụ n'ụlọakụ'

Ndị na-azọ ohere ịdọrọ ego na ATM

Ebe foto si, Screengrab

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka Ụlọakụ etiti gbatiri ohere ndị mmadụ iweghachi ego ochie n'ụlọakụ ma nara nke ọhụrụ, ụkọ ego ebutela oke ịta ikikere eze na mpaghara dị iche iche na Naijiria.

Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akwa arịrị n'ihi ihe ha na-agabiga iji nweta ego gboo mkpa dịịrị ha.

Otu onye n'ime ha bụ Onyeka Odele kwuru na inweta puku naịra 15,000 riri ya puku naịra atọ.

"O nweghịzi onye obi dị mma. Ụnyaahụ a gara m n'ụlọakụ iwere ego."

"Ego dị m mkpa, ndị POS na-ana puku naịra atọ (3,000) iji nye puku naịra iri na ise(N15,000).

"Ihe nke a gaa n'ihu ndị mmadụ ga-anwụ."

Ọtụtụ ndị mmadụ jizi ekwentị eziga ego ma ha zụọ ihe ha chọrọ mana nke ahụ nwere nsogbu nke ya dịka ụfọdụ ya bụ ozi anaghị eru onye e ziri ya aka n'ihi nsogbu ịntanetị (network)

Andrew Onyinye kwuru sị, "a zụrụ m ihe n'aka onye ahịa , ọ jụrụ ka m were ahịa ahụ laa, ma ọ bụrụ na o nwetaghị ozi n'ekwentị ya."

"Onye nke ọzọ hapụrụ ka m were ahịa ahụ laa dịka m gosiri ya akwụkwọ njirimara nke ụlọọrụ anyị mana ọ naara m akara ekwentị m, bụ nke o ji akpọ m kamgbe ụnyahụ."

Otu onye achọghị ka a kpọo aha ya kwuru na ego ya dị n'ọbaego ya n'ụlọakụ pụrụ site n'ọbaego ya n'ụlọakụ na-agbanyeghị na ụlọahịa ọ zụru ahịa kwuru na ego ahụ abataghị n'ọbaego ha.

"Agara m ịzụ ihe, POS, aga ewere ego gi, imekwa ya ọzọ, enye gị ozi na e werela ego gị."

"E wepụrụ ego ruru puku naịra iri na asaa (17,000) n'ọbaego m."

"N'ụtụtụ taa agaala m ụlọakụ inye mkpesa, ihe ruru mmadụ narị abụọ kwụ n'ahịrị bụ ndị wetara mkpesa yiri nke m."

Onye ntaakụkọ anyị gaghariri n'Enugwu taa bụ Tọzde kwuru na ọtụtụ igwe a na-adọrọ ego Bekee kpọrọ ATM dị n'Enugwu enweghi nke ego dị."

Ndị kwụ n'ụlọakụ ịdọrọ ego

"N' Ogui Road, e nwere ụlọakụ First Bank, Zenith, UBA nakwa ụlọakụ ndị ọgbọ ọhụrụ, mana naanị Union Bank ka ego dị n'ATM."

"Na Union Bank ihe ruru mmadụ narị atọ (300) kwụụ n'ahịrị."

"Ndị mmadụ jupụtara ebe ahụ, na-alụ ọgụ, na-akọ ọnụ."

"Ị gaghị ewepụ ihe karịrị N20,000 n'ATM ego ole ọ masịrị gị nwee n'ọbaego gị."

Cheta na n'ọnwa Disemba afọ 2022, ụlọakụ etiti bụ CBN bipụtara ego ọhụrụ ma nye ndị mmadụ rue abalị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 iweghachi ego ochie nile ma were nke ọhụrụ.

Mana dịka oge ahụ fọrọ abalị ole na ole, CBN gbatịrị ya rue abalị 10 nke ọnwa Febrụwarị n'ihi na ego ọhụrụ ahụ dị ụkọ.

Kamgbe ahụ, ụmụ Naijiria na-agabiga ihe mgbu dịka a hụghị ma ego ochie ma nke ọhụrụ.