'Ndị POS na-ana N1,000 maka inye ndị mmadụ ego ọhụrụ N10,000'

Ụzụ na-agba n’ụlọakụ ndị dị n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche dịka ndị mmadụ na-agba mbọ ịgbanwe ego ochie Naịra ha.
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara dịka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara ọgbakọ na Daura, Katsina Steeti.
Agbanyeghi nke a, tupu ozi a apụta, ka ọ fọrọ ụbọchị ole m ole ụlọakụ etiti Naịjriịa hibebụrụ maka ịgbanwe ego ochie Naịra ma nweta nke ọhụrụ ha hazịgharị ruo, ọha ndị mmadụ jị ọsọ wujuo ụlọakụ dị iche iche.
Ụlọakụ etiti Naịjirịa nyere ụmụafọ Naịjriịa ohere ịgbanwe ngalaba ego N1000, N500 na N200.
Iji hụ na atụmatụ a gara ngwa ngwa, ụlọọrụ a nwepụtara echiche ha kpọrọ ‘Cash swap programme’ n’ụbọchị Fraịdee gara aga n’akụkụ ime obodo ndị dị iche iche ọkachasị ebe ịga ụlọakụ ga-arara ndị mmadụ ahụ.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị ahụ ego ọhụrụ a anya ma n’ime ụlọakụ nakwa n’igwe ATM maọbụ POS.
Otu nwoke bi na Legọs aha ya bụ Cosmos Harmony gwara BBC Igbo na ndị na-azụ ahịa anaghịzị ekwe ana ya bụ ego ochie ebe ụlọụka ya amaala ọkwa n’izu gara aga gwa ndị mmadụ na ha agaghịzị na-anabata ego ochie Naịra ma a na-enye onyinye n’ụka.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
BBC Igbo gharịrị n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa dị iche iche ji chọpụta ihe ndị mmadụ na-agabiga nakwa etu atụmatụ mgbanwe ego a siri aga.
Onye ntaakụkọ anyị n’Anambra steeti kwuru:
“N’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ taa bụ Satọdee igwe mmadụ wụjuru n’ihu ọtụtụ ụlọakụ n’Awka bụ isi obodo Anambra dịka ha na-achọ inweta ego ọhụrụ a.”
Ọ kọwara na ụfọdụ ụlọakụ ndị nọ na steeti ahụ mere mkpebi ịmepee n’ụbọchị Satọdee nakwa Sọnde iji hụ na ha nyere ọha mmadụ ohere ịgbanwe ego ochie Naịra ha.
“Ọtụtụ n’ime ndị m hụrụ ma jụọ ajụjụ ebe n’ihu ụlọakụ ndị a kọwara na ha bụ ndị na-azụ ahịa nke bụ na ịme mgbanwe ego a dị ha oke mkpa na ngwụcha izu a tupu ụbọchị 31 bụ ụbọchị ikpeazụ eruo.”
O kwukwara na ọtụtụ n’ime ha gosiri iwe ha na-ekwu na oteela kemgbe ebe ọnwa Dịsemba 2022 ha malitere ịbịa ụlọakụ na-achọ ya bụ ego ọhụrụ Naịra mana ha ahụghị ya ma fọdụzie ịnweta ya.
BBC Igbo pụrụ n’ama n’ebe ọnwa Disemba 2022 jirikwa anya hụ na ihe ndị mmadụ kwuru bụ n’ezie maka okwu ịnwata ya bụ ego ọhụrụ.
Ọ gakwara ụlọakụ ọzọ n’ụbọchị ụka ịga hụ ihe na-eme. O kwuru na ọ bụ naanị otu ụlọakụ n’ime anọ n’akụkụ mpaghara ahụ nwere ego n’ime igwe ATM ha.
Igwe mmadụ wụchiri n’ebe ahụ n’ihi nke a. O kwuru na agbanyeghị na ọ wụbatara ebe ahụ n’isi ụtụtụ, akara enyere ya iji kwụrụ n’ahịrị bụ 187 nke bụ na mmadụ karịrị otu narị na iri asatọ bu ya ụzọ bata.
O kwukwara na ndị na-enye n'igwe POS malitere ịna ndị mmadụ N1000 ma ha chọrọ iwere N10,000 ebe ha na-ana N500 ma ha chọrọ iwere N5000.
O kwukwara:
"Onye ụgbọ keke buru kwuru na ị were ego ọhụrụ kwụọ ya ụgbọ ọ nwere ego ọhụrụ kwụọ gị ụgwọ ego gị fọrọ mana ị were egọ ochie kwụọ ya ụgwọ, o were ego ọhụrụ kwụọ gị ụgwọ gị fọrọ n'aka ya."
N’Ebonyi steeti n'ụbọchị Satọdee, onye ntaakụkọ anyị kwukwara na ihe na-ebe na Awka, na-ebekwa n’ebe ahụ dịka ọha ndị mmadụ pụtara isi ụtụtụ taa bụ Satọdee abalị 28 nke ọnwa Jenụwarị wụjuo n’ihu ụlọakụ maka atụmatụ ịgbanwe ego Naịra ochie ha ma nweta ego Naịra ọhụrụ .
Otu nwaanyị nọ ebe ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya ji obi iwe kwuo:
'A nọrọ malite ụzụ ụtụtụ ruo elekere atọ ehihe n’ịhụ ụlọakụ maka iwete Naịra ọhụrụ'.
Ọtụtụ na-ajụ egwu ịma ihe ga-eme n'abalị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023 bụ ụbọchị ikpeazụ ụlọakụ etiti tinyere maka atụmatụ mgbenwe ego ochie Naịra.

Ihe ụfọdụ ndị ọchịchị na-ekwu
Dịka ọha ndị mmadụ na-eti mkpu ma na soshal midia ma n'ihe banyere ihe ha na-ababịga n'okwu inweta ego ọhụrụ a, ụfọdụ ọchịchị etinyela ọnụ na ya bụ okwu.
Onyeisiala Muhammadu Buhari si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu asaala ndị mmadụ na-ekwu na atụmatụ mgbanwe ego a abụghị maka ịta ndị mmadụ ahụhụ kama ọ bụ ụzọ iji gbochie mfesa ego Naịra adịgboroja, buso ndị na-eji ego akwado iyi ndụ egwu agha nakwa gbochie nrụrụaka.
O gbara ọha ndị mmadụ umu n'ozi a pụtara na Satọdee na atụmatụ a bụ maka ọdịmma ha n'ihi na ọ ga-akwalite akụnụba Naịjirịa.
O kwukwara:
"Enwere ọtụtụ atụmatụ nke ụlọakụ etiti Naịjirịa na ụlọakụ azụmahịa ndị ọzọ na-ewepụta iji mee ka nkesa akwụkwọ ego ọhụrụ a ga ngwa ngwa ma mee ihe niile dị mkpa iji gbochie mkpakọ ego a na ọgbaaghara so ya."

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Facebook
Ụlọakụ etiti Naịjirịa ezipụtala ozi ma zaa ndị na-achọ ka a dọtịa oge ụlọakụ a tinyere maka mgbanwe ego ochie Naịra na nnweta ego Naịrịa ọhụrụ.
Ozi onyeisi ụlọakụ etiti a bụ Godwin Emefile kwuru n’ihe onyonyo o wepụtara na Satọdee:
“Ọ bụ ihe mwute ikwu na ejighi oziọma pụta. Anyị wetere na ọnwa atọ zuuru ọha oke iji soro ọkwa anyị mara maka mgbanwe ego a.”
Atiku Abubukar na-azọrọ pati Peoples Democratic Party (PDP) ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 zịpụtara ozi n'ihe onyonyo o kesara na soshal midia ya.
O kwuru na ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'okwu inweta ego a na-emetụta ya ọkachasị ndị azụmahịa nakwa ndị bi n'ime obodo.
Ọ gara n'ihu rịọ ụlọakụ etiti ka adọtịkwuo oge atụmatụ mgbanwe ego a.
N'okwu ya, ọ sị:
"Ọ dị mkpa na ụlọakụ etiti Naịjrịa tụlere ndọtị oge nye ọha ndị mmadụ na-achọ ịgbanwe akwụkwọ ego Naịra ochie ha dịka nke a ga-ebelata ahụhụ ndị na-enwgehị ka ọ hara ha ga-ata n’oge a.”
O gara n'ihu kwuo na ọ ma na ịta ndị Naịjrịa ahụhụ abụghị ebumnobi atụmatụ mgbanwe ego a.
Gọvanọ Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje site n’aka odeakwụkwọ ọchịchị ya bụ Abba Anwar zipụtakwara ozi na-arịọ gọọmentị etiti Naịjirịa ka nụ olu ụmụafọ Naịjirịa nakwa ahụhụ ha na-ata maka okwu mgbanwe ego a.
Ọ gara n’ihu gwa Onyeisisla Muhammadu Buhari ka o yigharia atụmatụ ịbịa steeti ya n’ihe etu okwu mgbenwe ego a siri metụta steeti ya.
Akwụkwọ ozi a kọwara na dịka ụzụ ndị mmadụ jupụtara n’ụzọ maka atụmatụ nweta ego ọhụrụ a na steeti a agaghị enweike tụkwasị obi n’etu ọnọdụ nchekwa ga-adị n’oge a.
Kano steeti bụ steeti nke abụọ ebe ndị mmadụ kacha biri na Naịjriịa bụkwa steeti eji azụmahịa mara.
Steeti a n’oge gara aga enwela nsogbu enweghi ezi nchekwa dịka otu dị iche iche nke gụnyere ndị Boko Haram wakporo ndị mmadụ, ụlọ ụka, ụlọ ụka ndị alakụba nakwa okporoụzọ ma tụọ ogbunigwe.
Akwụkwọ ozi Ganduje dere sị:
“Nsogbu a na-emetụta anyị niile. Ya mere, a ga-anụ olu anyị n'ọnụ ụzọ niile. Anyị bụ ebe azụmahịa. N'ihi ya, ọnọdụ anyị ga-ada ụda n’ụzọ doro anya.”










