CBN Redesign Naira: Enweghị uru ibipụta ego ọhụrụ ga-abara Naijirịa ugbua - Ndị ọkammụta

Ebe foto si, Reuters
Dịka gọọmentị na-akwado ibipụta ego ọhụrụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche maka ya bụ atụmatụ.
Ndị ọkaibe n'ihe gbasara akụnụba obodo bụ Katch Ononuju na Bongo Adi gwara BBC Igbo uche ha maka ya bụ okwu ibipụta ego ọhụrụ.
Bongo Adi kwuru ka gọọmentị Naijirịa wepụ aka enwe n'ofe.
Bongo kwuru sị, "Ha na-ala obodo a n'ihi, obodo ndị ọzọ akụnụba ha ka nke Naijirịa mma na-akpakọ onwe ha, kama anyị na-achọ ụzọ mmefu".
Bongo jụrụ sị, " Ọ bụ ego ọhụrụ bụ mkpa Naijirịa. Ndị na-ekwu na ebipụta ego ọhụrụ na ndị zokpuru ego ha ga-ewepụta ya. Ọ pụtara na gọọmentị enweghị ebe edenyere ego ole nọ na Naijirịa".
O kwuru na ibipụta ego ọhụrụ ọzọ ga-efu kwa Naijirịa ego.
Bongo kọwara sị, " Ndị na-edowe ego na edowe ya na Dọla maọbụ pawụnd, ya bụ atụmatụ agagfhị eme ka ndị dowere ego wepụta ya.
N'aka nke ọzọ ka Katch Ononuju kwuru si na ibipụta ego ọhụrụ bụ usoro nrụrụaka.
O kwuru sị," Ya bụ atụmatụ adịghị mma, Naịjirịa enweghị ego, anyị na-ebiri nke anyị na-emefu. Ugbua ọ bụ mgbe e kwesịrị imefu ego ịbipụta ego ọzọ".
Ononujo gara n'ihu kwuo," dịka m sị ahụ ya, anyị ga-ebiri ego ọzọ maka atụmatụ a nke ga-etinye kwu n'ụgwọ Naijirịa ji. Enweghị uru m hụrụ ọ baara akụnụba Naijirịa".
O kwukwara na ekwesịghị ihiwe iwu na mmadụ niile ga-eweghachi ego ha n'ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Jenuwarị afọ 2023.
Ọ kwuru sị, "Ọ bụrụ na mba ndị mepere emepe, a ga-eji nwayọ nwayọ mee ya kama etu ha sịrị mee ya ga-ebute egwu, ọ dịghị mma".
Ebe CBN kwụ maka ya bụ okwu
Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-ebipụta akwụkwọ ego naịra ọhụrụ iji gbanwee ndị nke ochie, malite n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba 2022.
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Wenezde.
Akwụkwọ ego ndị a ga-agbanwe bụ narị naịra abụọ, narị naịra ise na otu puku naịra.
Kedụ etu nke a ga-esi metụta nwaanyị na-ere ose n'ahịa?

Ebe foto si, Getty Images
BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye ọrụ n'ụlọakụ etiti ka ọ kọwaara anyị etu mgbanwe akwụkwọ naịra ndị a nwereike isi metụta ndị nkịtị na Naịjirịa. Lee ihe ọ kọwara:
- Ọ ga-eme ka ndị na-enwebụghị akara ọbaego n'ụlọakụ nweta ya, maka na ọ bụ naanị n'ụlọakụ ka ị ga-enweta ego ọhụrụ. "Ọ bụrụ na ị na-edebe ego n'okpuru akwa gị, oge eruola mgbe ị ga-emepe ọbaego," ka o kwuru.
- Mgbanwe akwụkwọ ego a nwere iwetulata etu ọnụahịa ihe dị icheiche (inflation) si agbali elu. Maka na ọ ga-eme ka ndị mmadụ debere ego n'ime ụlọ ha wepụtazie ya.
- Ọ ga-ewepụ ego adịgboroja na-efegharị n'obodo.
- Mgbanwe a nwereike ibute obere nghọtahie nye ụfọdụ ndị nkịtị na-amaghị kpọmkwem mgbe ego nke ochie ga-akwụsị ịba uru.
Chetakwa na akwụkwọ ego N200, N500, na N1000 nke ochie agaghịzi enwe isi ma ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023 gachaa.
Onye ọrụ CBN a na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ịgbanwe akwụkwọ ego nwereike iwe gọọmentị nnukwu ego ugbua, mana n'ọdịnihu, ọ ga-aba nnukwu uru karịa.
Ihe mere gọọmentị ji agbanwe akwụkwọ naịra ụfọdụ

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu ọkpụrụkpụ ihe mere gọọmentị ji chọọ ịgbanwe akwụkwọ ego N200, N500 na N1000, bụ maka na ego dị n'aka ndị mmadụ ugbua karịrị ego dị n'ụlkọakụ dị icheiche ugboro atọ.
"Ọnụọgụgụ gosiri na ihe karịrị pasentị 85 ego niile na-agagharị na Naịjirịa ugbua dị n'aka ndị mmadụ," Emefiele kwuru.
"Iji kwuo ya nke ọma, na ngwụcha ọnwa Septamba, ụlọakụ etiti chọpụtara na n'ime tarị naịra atọ na ụma (N3.23 trillion) na-agagharị na Naịjiria ugbua, ihe karịrị tarị naịra abụọ (N2.73 trillion) dị n'aka ndị mmadụ nkịtị kama ịdị n'ụlọakụ dịka o si kwesị."
"N'ọnwa Disemba 2015, ego na-agagharị na Naịjirịa dị otu tarị naịra na ụma (N1.46 trillion), mana ugbua, o ruola tarị naịra abụọ na ụma (N2,23 trillion)."
"Nke a bụ ihe kwesịrị iche onye ọbụla uche, anyị agaghị ekwe ka ọ dịrị etu a gawa," Emefiele kwuru.
Ihe ndị ọzọ:
- Ọtụtụ ego ruru unyi na ego dọkara adọka na-efegharị.
- Ọtụtụ ego adịgboroja na-efegharị, dịka nnyocha gosiri na ego adịgboroja na-arị elu.
Emefiela kwuru na dịka usoro mmepụta ego na mba ụwa niile si dị, mba ọbụla kwesịrị ị na-agbanwe ego ha kwa afọ asatọ ọbụla, "mana Naịjirịa agbanwebeghị akwụkwọ ego ya n'ime afọ iri abụọ gara aga", Emefiele kwuru.









