e-Naira CBN: Ihe mere e ji wetuo akụrụngwa eNaira n'ọba ozi 'Google Play Store' ma tinyekwa ya ọzọ

Ụlọakụ etiti bụ Central Bank akọwaala ihe mere e ji wetuo akụrụngwa eNaira n'ọba 'Google Play Store' nwa ntịtị oge tupu e tinyekwa ya ọzọ.
Dịka Osita Nwanisobi, bụ ọnụ na-ekwuru CBN kwuru na ha na-arụ ya ọrụ iji.
"Anyị na-arụ ọrụ na ya ugbua, nwalee ya n'ime awa olemole na-abịanụ," Nwanisobi gwara ndị ntaakụkọ Punch n'ụbọchị Wenezde.
Mana oge BBC Igbo nwalere ya n'ụtụtụ Tọzde, anyị hụrụ na ya bụ akụrụngwa dịkwa na 'play store'.
Anyị chọpụtakwara na ụfọdụ ndị buturula ya bụ akụrụngwa n'ekwentị ha kwuru na ọ na-enye ha obere nsogbu.



Ihe 10 ị ga-ejinwu e-Naira mee

Ebe foto si, ENaira/Website
Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na onyeisala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ga-ewepụta ego teknụzụ ọhụrụ akpọrọ e-naira n'ụbọchị Mọnde na-abịanụ.
e-Naira bụ ego teknụzụ mbụ Naịjirịa nwerela.
Ọ bụ n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2021 a ka ụlọakụ gọọmenti etiti akpọrọ CBN n'aha ịchafụ wepụtara ya bụ webụsaiti e-naira.
Etụ eNaira ọ ga-esi rụ ọrụ
CBN ga-ewepụta ego pụrụiche nke naira nọ n'isi ya.
Ka ọ dị ugbua, ọba ozi ego teknụzụ ahụ abụbeghị nke mmadụ niile ga-enwetali.
Mana CBN na-ekwu na ha na-agba mbọ ịhụ ndị mmadụ nwerike ịnwetalị 'app' ya n'ekwenti dị iche iche dịka "Google Play store nke Android users" nakwa App Store maka ndị nwere "iPhone."
Ndị chọrọ ị ji ego naira teknụzụ a azụ ahịa ga-akpọ otu akara "USSD short code" ma soro usoro ahaziri iji jiri ego ahụ zụọ ahịa maọbụ kwụọ ụgwọ.
Osita Nwasinobi bụ ọnụ na-ekwuru ụlọakụ CBN kwuru na mwepụta e-naira a ka bụ nzọpụ ụkwụ nke mbụ.
o kwuru na ọ ga-anagbanwe kwa mgbe ma na-akawanye mma.
Ọ bụrụ na onyeisiala wepụta ya bụ ego naira teknuzu(e-naira), lee ụfọdụ ihe ndị ị ga-ejinwu ya mee
- "Unified Payment System" - Ị ga-esinwu n'ọba ego gị wegaa ego n'ọba ego e-naira na-enweghị nsogbu ọbụla.
- Contactless Payment - Ị ga-ejinwu ọba ego e-naira gị kwụọ ụgwọ n'ụlọahịa ọbụla site n'ibinye aka na "QR codes."
- Bank Account Management: Ị ga-enyochalị ọba ego e naira gị mgbe ọbụla, mara ego dị ebe ahụ ha ma lekwa etu si mefuo ego maọbụ nabata ego
- Peer-to-Peer Payment: Ị ga-ejinwu e naira gị zịgara onye ịchọrọ ego site akara ọba ego gị maọbụ caadị gị.
Ihe ụlọakụ etiti ji wepụta CBN e-Naira
- Iwelitekwu nzụkọrịta ahịa si mba fere mba ọzọ
- Ime ka ego baa ụba n'aka ndị mmadụ
- Ime ka ọ dịrị ndị mmadụ maọbụ ụlọọrụ mfe ịkwụny ụgwọ ụtụisi mgbe ọbụla na-enweghị nsogbu ọbụla
- I kesalị ego enyemaka ka o wee rute ndị enyere ya ọsịsọ
- Ime ka mkpebi gbasara akụ ụba(monetary policies) ga sirirị werere
- e-Naira ga-eme ka ndị mmadụ na-akwụnye ụgwọ ihe ọ bụla ha chọrọ n'ụzọ na-enweghị nsogbu ọbụla
- A ga-eji ya na-akwụye ụtụisi
Ọ bụ Bitt Inc. rụpụtara e- Naira ma mekwa ka ewepụta ego teknụzụ nke CBN nke akpọrọ Central Bank Digital Currency (CBDC).
A ga na-eji ma ego naira nkịtị nakwa nke teknụzụ(e-Naira) azụ ahịa.










