Gịnị mere ọnụ ego dọla ji arị elu na Naịjirịa?

Aha onyonyo, Dollar Rate Increase in Nigeria: Gịnị mere ọnụ ego dọla ji arị elu na Naịjirịa?
Gịnị mere ọnụ ego dọla ji arị elu na Naịjirịa?

Na Naịjirịa taa, ọnụ ego otu dọla bụ N710 n’ahịa nzuzo. Nke a mere ndị mmadụ ji ebe akwa maka na ọ bụbu N170 na 2015 mgbe onyeisiala Buhari batara n’ọchịchị.

N’etiti 2015 na 2021, ọnụ ego naira bidoro njem kpụwa ọnụ ala n’ebe dọla nọ.

Ihe mere dọla ji arị

Gịnị kpatara ya?

Bongo Adi

Ebe foto si, Dr Bongo Adi

Dr. Bongo Adi bụ onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ 'Lagos Business School', kwuru na ndị onyeisiala họputara n’ihe gbasara akụnaụba amachaghị ihe ha na-eme nke mere na atụmatụ ha na-ewepụta enweghị nke nwere isi.

Nke abụọ, Adi kwuru na dọla dị ụkọ na mba ụwa nile n'ihi agha Ukraine na Rọshịa.

Onye ọzọkwa bụ Oriaku Gloria Jarigbe kwuru na ụgwọ naịjirịa ji dị ọtụtụ n'ihi ọtụtụ ego gọọmentị bitere.

Oriaku Jarigbe bụ ọkachamara n'okwu mgbakọ na nhazi ego.

Mana kedụ ka a ga-esi mee ka otu naịra na otu dọla dị nhatanha?

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Oge ọ na-azọ ọchịchị n'afọ 2015, Onyeisiala Buhari kwere nkwa ime ka otu dọla bụrụ otu naịra

Dr. Bongo Adi kwu na ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ihe emebiela, mmezite ya ga-ara ahu.

Mana ihe atọ a nwereike inyeaka gbọta ya:

1. Ka e wepụ 'Subsidy' – Mana e wepu ya, ihe ga-esiri ndị mmadụ ike karịa ka ọ dị ugbua.

Cheta na 'subsidy' bụ ego gọọmentị Naịjirịa na-akwụ iji mee ka ọnụego mmanụ ụgbọala dị obere.

2. Igbanwe ndị ọchịchị ugbua ma tinye gọọmenti ọhụrụ.

A na-ele anya n’afọ 2023, ọchịchị ọhụrụ ga-adị nke nwereike ibute atụmatụ ọhụrụ nke ga-agba eziokwu niile n'anwụ.

3. Ime ka mmanụ anyị na-egwupụta gbagokwuo elu ka e nweike reta ezigbo ego na ya.

Mana ka ọ dị ugbua, ndị ohi na-ezu ụfọdụ mmanụ anyị na-akọpụta na Naịjirịa. Nke a mere na ego dọla a na-ereta na ya anaghị ezu.

Frank Ojadi

Ebe foto si, Frank Ojadi

Ọkammụta Frank Ojadi, bụkwa onye nkuzi na 'Lagos Business School', sị na ọnụ ego dọla ga na-arị elu ruo mgbe a ga-enweta atụmatụ nke ga-egbochi ndị ohi izuru mmanụ agbịdị anyị na-emepụta.

Ọ sikwa na Naịjirịa kwesịrị ileba anya i na-eresi ndị mba ọzọ gaasị maka na gaasị anyị nwere dị ọtụtụ.

Gloria Jarigbe

Ebe foto si, Gloria Jarigbe

Mana oriaku Gloria Alaribe, kwuru na gọọmenti ga-eme ka nchekwa dị, ka ndị na-akọ ugbo nweike laghachị n’ụgbo ha.

"Ọkụ alatrik kwesịrị idikwa ka ndị na-emepụta ihe nwee ike imepụta ihe anyi ga na-eresi mba ndị ọzọ," Jarigbe kwuru.

"Anyị ga-ebelata kwa aka n’itubata ihe ma na-eri ihe anyị na-emepụta n’obodo anyị."