CBN BDC: 'Mmachị Bureau De Change ga-ebutere anyị agụrụ' - Onye na-agbanwe ego

Aha onyonyo, CBN Forex BDC: 'Mmachị CBN ga-ebutere anyị agụru'- Arinze na-agbanwe ego na Legọs

Ndị na-agbanwe ego akpọrọ Bureau de Change na bekee na Najirịa na-akwa arịrị gbasara etu gọọmenti etiti si machie iresi ha ego mba ofesi ụnyahụ.

Chukwuemeka Arinze bụ onye na-agbanwe ego na Legọs kamgbe afọ iri abụọ kwuru na mmachị a ga-akwanye ya na ndị otu ya na-emekwa udiri azụmahịa ahụ n’agụrụ ma mee ka ọtụtụ ndị ha na-enye ọrụ laa ụlọ ga-anọdụ ala.

Cheta na ụlọakụ ukwu NaỊjiria bụ “Central Bank of Nigeria” kwuru na ha machiela iresi ndị na-agbanwe ego, ego mba ofesi ọbụla.

Gịnị kpatara mmachị a?

CBN kwuru na ọ bụ maka etu ndị nkịtị na-agbanwe ego si eji ohere e nyere ha were na-akwado nrụrụaka ego dị iche iche.

Onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele kwuputere nke a ụbọchị Tusde(Julaị 27,2021) ma kwukwa na CBN agaghị enyezi ndị mmadụ akwụkwọ ikike e ji agbanwe ego na Naịjirịa.

Emefiele kwuru na CBN ga na-eresizi ụlọakụ dị ịche iche na Naịjirịa ego mba ofesi.

O kwuru na ọtụtụ ngalaba mba ofesi kụpụrụ nti gbasara ime mgbanwe ego iwu akwadoghị.

Ihe gọvanọ CBN kwesiri ime karịa ma ịmachị iresi ndị BDC ego mba ofesi

Arinze bụ onye na-eme mgbanwe ego kwuru na CBN kwesiri itinyekwu ego n’ahịa mgbanwe ego karịa ma ịmachị ndị nkịtị ime ya.

O kwuru na ndị otu ya ahụghị ego mba ofesi zuruoke ha na-eresi ọtụtụ ndị na-agbanwe ego n’aka ha ma ya fọdụzie iji ohere ha mee nrụrụ aka.

Arinze kwuru na ọ dị mma etu CBN si kwuo na ha ga-akwụsị inye ndị na-achọ akwụkwo ikike ọhụrụ ime mgbanwe ego.

Ihe ndị ọzọ ọ kọwara dị n'ihe nkiri a dị ebe a.