Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu onye ndu Ipob ekwuola na ndị ọchịchị aka ha dị na nwuchigharị ya na mba Kenya buru ibu.

O kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere tupu ha wuchie n'ụlọikpe n'ụbọchị 26 ọnwa Julaị, afọ 2021.

Ejiofor sị na ihe ka mkpa ugbua bụ ịgbapụta Kanu n'aka ndị gọọmentị Naịjirịa tupu ha gbawa ndị so nwuchie ya n'anwụ.

O kwukwara na a nwuchiri Kanu na mba Kenya bụ ebe e tiri ya ihe ụbọchị asatọ tupu a kpọbata ya na Naịjirịa.

Kirie ihe o kwuru n'uju.